Sunday Oliseh

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Àtụ:Infobox football biographySunday Og

Sunday Oliseh
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
aha pseudonymPassmaster Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya14 Septemba 1974 Dezie
Ebe ọmụmụUgwu Ọcha Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ, association football coach Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụicheetiti etiti Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1990 Dezie
Ụcha ime anyaagba aja aja Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie
otu egwuregwuBundesliga Dezie


Sunday Ọgọchukwu Oliseh (amụrụ ya na 14 Septemba1974) bụ onye nlekọta anya ndị Naịjirịa na-agba bọọlụ na kwa onye na-agbabu bọọlụ. Mgbe ọ na-agba bọọlụ, ọ bụ n'etiti ka ọ na-agba.

Ọrụ Ịgba Bọọlụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ onye kwudosiri ike ma nwekwa nka na-ịgba n'ọnọdụ nchekwa n'etiti. Oliseh na-agbala ndị klọb ama ama na ụwa dịka AFC Ajax, Borussia, Dortmund na Juventus FC.

Oliseh gbara bọọlụ ozurumba ma nye ọkpụ atọ na Naịjirịa ma gbakwaa na iko mba ụwa na 1994 na 1998. Oliseh sonyere na egwuregwu Olimpiki nke ọlaedo ya na 1996.

Ndị CAF tụnyere Sunday Oliseh dịka onye nke atọ kacha agba bọọlụ na Afrịka na 1998.

A na-echetakarị ya maka ọkpụ mmeri ọ nyere na gurupu staji nke ọ nyere ndị spain na iko mba ụwa na 1998 nke Naịjirịa gbara 3-2. A tụpụtara bọọlụ na ọgbọ, Oliseh were ọsọ wee gbaa bọọlụ ahụ 25 yadị, nke ochee ọkpụ bụ Andoni Zubizarreta na-atụghị anya. N'agbanyeghị na ọ bụ onye isi ndị otu ya na iko mba Afrịka na 2002, e wepụrụ ya na-isonye ndị otu ya, gbaa asọmpi iko mba ụwa maka mgbazi enyere ya maka ihe ọjọọ, ọ mere. Oliseh gara ezumike nka na Juunu 2002 maka anaghị akwuzị ya ụgwọ ruru ya.

Na Machị 2004, a chụpụrụ Oliseh na Borussia Dortmund maka isi ọ tara onye otu ya bụ Vahid Hashemian mgbe ọ nọ mbinyelụ na Vfl Bochum maka o kparịrị ndị ojii.

Na jenuwarị 2006, afọ 31, Oliseh gara ezumike nka na fuutubọọlụ mgbe ọ gbachara ọkara sizen ndị K.R.C Genk na Belgian.

Ọrụ nchekwa[dezie | dezie ebe o si]

Oliseh malitere ọrụ koochi ya na Belgium, ya na ndi otu Belgians nke atọ Verviers, ndị na-erughi afọ iri na iteghete. Ọ gụchara na tiim nke mbụ dịka onye isi koochi 2014-15. E mere ya onye isi koochi na onye nchekwa klọb na RCS VISE Belgium nke atọ.

Na 2015-16, " Naịjirịa Futubọọlụ Federechọn" (NFF) mere ya onye isi koochi nke otu Naịjirịa (Super Eagles of Nigeria) ebe ọ mere nke ọma; egwuregwu 14 sọọsọ abụọ ka ọ dara, ọkpụ 19 ka ọ nyere, enye sọọsọ 6.

Ọ kpọrọ ndị Naịjirịa gaa ndọrọndọrọ CHAN na Rwanda, Mekwaa Naịjirịa ha etozue ị gaa asọmpi iko mba ụwa nke grupu na kwa egwuregwu mbụ ya dịka onye isi koochi ndị Naịjirịa na AFCON, ha na Tanzania gbara jiiji. Ọ kwụsịrị ọrụ onye isi koochi Naịjirịa na 26 Febuwarị 2016, nke otu ọnwa na-abia mgbe ha na Egypt ga-agba na AFCON. Ọ nọghi rue ọnwa asatọ, n'ihi akwadoghị nke ọma, akwụ ụgwọ na ihe nrite ndị ọzọ enyeghị ya na ya onwe ya. Na 27 disemba, emere Oliseh onye nchekwa Fortuna Sittard. A chụpụrụ ya 14 febuwarị 2008, nke o kwuru na ọ bụ maka osoghị ha mee ihe na-ekwesịghị na klọb

Ọ nọrọ afọ abụọ na-enweghị klọb. Na Machị 2020, Oliseh kwuru na ọ jụrụ ọrụ abụọ nke ndị Belgian klọb, na ọ na-eche ezigbo ọrụ.

Ụdịrị Egwuregwu ya[dezie | dezie ebe o si]

N'agbanyeghị na Oliseh na-agba n'etiti na ọrụ egwuregwu ya niile, Jonathan Wilson kwuru n'edemede ya na "The Guardian" nke 2013, na ọ bụ onye mbụ na-akọwa ọrụ bọọlụ ya nke ọma, onye na-elebakarị anya ijide bọọlụ karịa ị na-achọ ọnwụnwe azụ.

Gbasara ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Ụmụ nwanne ya nwoke ndị obele bụ Azụbuike na Egutu, bụkwa ndị na-agba bọọlụ, nwanne ya ọzọ bụ Churchill Oliseh na nwa nwanne ya bụ Sekou Oliseh.

Ndekọ ọrụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Klọb[dezie | dezie ebe o si]

Mpụta na goolu site na klọb, oge na asọmpi
Klọb Oge Njikọ
Nkewa Ngwa Ọkpụ
Liège 1990–91 Nkeji Mbụ 3 0
1991–92 16 1
1992–93 30 2
1993–94 26 0
Na ngụkọta 75 3
Reggiana 1994–95 Serie A 29 1
1. FC Köln 1995–96 Bundesliga 24 0
1996–97 30 4
Na ngụkọta Ogbe 54 4
Ajax 1997–98 Eredivisie 29 5
1998–99 25 3
Na ngụkọta Ogbe 54 8
Juventus 1999–00 Serie A 8 0
Borussia Dortmund 2000-01 Bundesliga 22 0
2001–2002 18 1
2002-03 2 0
2004-05 11 0
Na ngụkọta 53 1
Bochum (mbinye ego) 2002-03 Bundesliga 11 0
2003–04 32 1
Na ngụkọta 75 3
Jen 2005–06 Nkeji Mbụ 16 0
Nchịkọta ọrụ 321 18

Ozuruụwa[dezie | dezie ebe o si]

Mpụta na goolu ndị otu mba na afọ
Otu mba Afọ Ngwa Ọkpụ
Nigeria 1993 1 0
1994 11 0
1995 3 0
1996 1 0
1997 4 0
1998 7 2
1999 3 0
2000 10 0
2001 7 0
2002 7 0
Na ngụkọta Ogbe 54 2

Nsọpụrụ[dezie | dezie ebe o si]

Klọb[dezie | dezie ebe o si]

Ajasị
  • Eredivisie : 1997– 98
  • Iko KNVB : 1997–98, 1998–99
Juventus
  • UEFA Intertoto Iko : 1999 [1]
Borussia Dortmund
  • Bundesliga : 2001-02
  • Iko Uefa : 2001–02 (Onye nke abụọ)

Ozuurụwa[dezie | dezie ebe o si]

Naịjirịa
  • Iko Mba Afrịka: 1994
  • Oge ọlaedo nke Olimpiki : 1996
  • Iko Asia nke Afuro 1995

Nsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. llda

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Sunday Oliseh na fussballdaten.de (na German)