Sushmita Dev
Sushmita Dev (amụrụ 25 Septemba 1972) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị India na onye otu Rajya Sabha si West Bengal, yana so na All India Trinamool Congress. Na mbụ, a họpụtara ya na Lok Sabha, ụlọ omebe iwu nke India site na Silchar, Assam na ntuli aka izugbe nke India nke 2014 dị ka onye otu National Congress nke India.[1] Ọ bụbu onye isi oche nke All India Mahila Congress.[2] Ọ tụfuru ntuli aka Lok Sabha nke 2019 n'aka onye ndoro-ndoro BJP Rajdeep Roy, nke mere ka ọ gbaa arụkwaghịm na Indian National Congress wee sonye na All India Trinamool Congress na 2021.[3]
Ọ na-eje ozi ugbu a dị ka ọnụ na-ekwuchitere mba nke All India Trinamool Congress. [citation needed]
Oge ọ malitere
[dezie | dezie ebe o si]Dev bụ nwa nwanyị nke onye isi Indian National Congress Santosh Mohan Dev na nne ya bụ Bithika Dev, onye omeiwu nke nzukọ Silchar nke Assam. Nna ya bụ onye omeiwu na minista nke India.[4]
O nwere B.A. (Hons.) site na Miranda House, Bar-at-Law, LLB (Corporate and Commercial Laws) site na Mahadum Delhi. Ọ debanyere aha na Inns of Courts School of Law, London na King's College London, UK.[5]
Ihe odide
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ "Sushmita Dev, Who Backed CAA, Quits Cong; Kapil Sibal Says 'Party Moves on with Eyes Wide Open'", News18, 16 August 2021.
- ↑ "Sushmita Dev joins Trinamool Congress, day after leaving Congress", 16 August 2021. Retrieved on 17 August 2021.
- ↑ Team Rahul loses another: Assam face Sushmita Dev goes to TMC. The Indian Express (17 August 2021). Retrieved on 17 August 2021.
- ↑ Kangkan Kalita. "Sushmita Dev may play key role for Trinamool in Northeast", The Times of India, 16 August 2021. Retrieved on 17 August 2021.
- ↑ Sushmita Dev Lok Sabha Profile. Lok Sabha. Retrieved on 17 August 2021.