Gaa na ọdịnaya

Tobiloba Ajayi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Tobiloba Ajayi bụ ọkaiwu Naịjirịa na onye na-akwado ikike ndị nwere nkwarụ. Ọ nwere ọrịa ụbụrụ. E nyere ya onyinye Mandela Washington Fellowship na 2016. O nwetara akara ugo mmụta masta na iwu mba ụwa site na Mahadum Hertfordshire, United Kingdom. Nkwado ya maka ndị nwere nkwarụ gụnyere itinye aka na Nigeria Vision 2020 na okwu ndị metụtara nkwarụ na "The Lagos State Disability Law". O deela akwụkwọ atọ.

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Ajayi bụ nwa nke anọ n'ime ụmụ ise nke ezinụlọ ya. Nne na nna ya achọghị itinye ya n'ụlọ akwụkwọ mgbe ọ dị obere n'ihi nkwarụ ya. Ọ pụghị ịnọdụ ala, guzo ma ọ bụ gaa ije. Agụmakwụkwọ ya malitere mgbe ọ dị afọ atọ ma mechaa agụmakwụkwọ sekọndrị na nke tertiary ya na nzere iwu na Naịjirịa tupu ọ kwaga United Kingdom iji nweta nzere masta na iwu mba ụwa na Mahadum Hertfordshire . [1]

Na mbido ọrụ ya, ọ rụrụ ọrụ na Mobility Aid and Appliances Research and Development Center . [2] O nyere aka na Nigeria Vision 2020 n'ihe gbasara nkwarụ ma bụrụkwa otu n'ime ndị otu dere "The Lagos State Disability Law".[3] E nyere ya Mandela Washington Fellowship na 2016.[4][5] Ka ọ na-erule Jenụwarị 2017 ọ rụrụ ọrụ na Benola Cerebral Palsy Initiatives. Ka ọ na-erule n'ọnwa Febụwarị afọ 2018 ọ na-eduzi nzukọ "Let CP Kids Learn", nke na-akwalite agụmakwụkwọ nke ụmụaka Naijiria nwere ọrịa ụbụrụ ma na-enye ndụmọdụ na nkwado nye ndị mụrụ ha.[6]

Edemsibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Adetorera. "There is life after disability", The Nation. Retrieved on 17 January 2017.
  2. Adebayo. "MAARDEC's Ms wheelchair contest gives voice to the physically challenged", Vanguard. Retrieved on 17 January 2017.
  3. Osonuga. A Nigerian Lawyer With Cerebral Palsy: My Encounter. Huffington Post. Retrieved on 17 January 2017.
  4. Precious. The Presidential Precinct Announces 2016 Mandela Washington Fellows. Presidential Precinct. Retrieved on 17 January 2017.
  5. Precious. Tobiloba Ajayi. Presidential Precinct. Retrieved on 16 November 2019.
  6. Dark. "Nigerians with disabilities are tired of waiting for an apathetic government", Bright magazine, 27 February 2018. Retrieved on 11 November 2019.