Vincent Ado Tenebe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Vincent Ado Tenebe
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereVincent Dezie
aha ezinụlọ yaAdo Dezie
aha ọmaprofessor Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya17 Ọgọọst 1958 Dezie
Ebe ọmụmụKaduna Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic, science education, agronomist Dezie
ụdị ọrụ yaosote onyeisi mahadum Dezie
onye were ọrụMahadum National Open University nke Naijiria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello, Abubakar Tafawa Balewa University Dezie
agbụrụNdị Igbo Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ájá ájá Dezie

Vincent Ado Tenebe (amụrụ 17 Ọgọst,1958) bu onye Naijiria gụrụ mak oru ugbo. Ọ bụbu onye isi Mahadum Steeti Taraba, Jalingo ma bụrụkwa onye bụbu onye isi mahadum National Open University of Nigeria.[1]

Mmalite Ndụ na agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na Kaduna, Naijiria, na Ọgọst 17, 1958.[2][3] O nwetara asambodo ụlọ akwụkwọ praịmarị ya na St. Patrick Primary school Maiduguri n'etiti afọ 1965 na 1971. O nwetara asambodo West African School n'afọ 1976 site na Government Secondary School, Yerwa, Maiduguri, Naijiria. [4] O nwetara nzere nke mbụ ya, B.Sc. (Agric) cum laude, na ogo nke abụọ, M. Sc. ya n'isi ọmụmụ Agronomy na Mahadum Ahmadu Bello, Zaria; ma nweta nzere Ph.D. ya n'isi ọmụmụ Agronomy na Mahadum Abubakar Tafawa Balewa, Bauchi.[3]

Ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Vincent Ado Tenebe bidoro dịka onye enyemaka gụsịrị akwụkwọ ọhụrụ n'afọ 1984 na Mahadum Abubakar Tafawa Balewa. N'afọ 1988, e mere ya onye isi nke ugbo mahadum ahụ.[5] N'afọ 1995, ọ ghọrọ onye isi nke ngalaba mmepụta akụmakú nke ụlọ akwụkwọ ahụ. N'afọ 2003, ọ ghọrọ ọkammụta nke Agronomy na Mahadum Sayensị na Nkà na Ụzụ nke Afrịka, Bauchi. [5]

Ọrụ Nchịkwa Ya[dezie | dezie ebe o si]

Vincent ghọrọ osote onye isi nke Mahadum National Open University na 7 nke Maachị, 2008.[6] Ọ ghọrọ osote onyeisi nke abụọ nke Mahadum National Open University of Nigeria, na Ọktoba 14, 2010.[5][6] N'afọ 2017, ọ ghọrọ onye isi nke Mahadum Steeti Taraba. [7]

Mmekọrịta na Òtù Ndị O Sogasị na Ha[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1986, ọ ghọrọ onye òtù Agriculture Society of Nigeria (ASN) n'afọ 1986. Otu afọ ka e mesịrị, ọ ghọrọ onye òtù Farm Management Association of Nigeria. N'afọ 2002, ọ ghọrọ onye òtù Institute of Cost Management (FCM). N'afọ 2012, ọ ghọrọ onye òtù National Institute for Education and Research (FNIER) ma n'otu afọ ahụ ọ ghọrọ onye òtù Nigeria Society for Experimental Biology (FNISEB). Otu afọ ka e mesịrị, ọ ghọrọ onye òtù Association of Nigerian Teachers (FASSONT). N'afọ 2014, ọ ghọrọ onye òtù ụlọ ọrụ Chartered Institute of Human Capital Development of Nigeria. N'afọ 2015, ọ ghọrọ onye òtù Biotechnology Society of Nigeria (FBSN).[8]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ọhụụ m maka mahadum steeti Taraba – Prọfesọ Tenebe.
  2. Edet, Hope (2017-04-03). TENEBE, Ọkammụta Vincent Ado (en-US).
  3. 3.0 3.1 [https ://web.laweh.edu.gh/professor-vincent-ado-tenebe/ Professor Vincent Ado Tenebe - Laweh University College] (en-US).
  4. Àtụ:Cite webụ
  5. 5.0 5.1 5.2 .uk/component/mtree/speaker-bureau/agricultural-science-and-veterinary/11-vincent-ado-tenebe Vincent Ado Tenebe.
  6. 6.0 6.1 edu.ng/deputy-vice-chancellor-administration/ Osote osote Chancellor nchịkwa | NOUN.
  7. Taraba State University Jalingo. Archived from the original on 2023-12-04. Retrieved on 2023-12-28.
  8. Taraba State University Jalingo. Archived from the original on 2023-12-04. Retrieved on 2023-12-28.