Winnifred Selby

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Winnifred Selby
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịGhana Dezie
aha ezinụlọ yaSelby Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụ̀nta ego Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Cambridge Dezie
Ebe obibiKumasi Dezie
Ihe nritefinalist Dezie

Winnifred Kyei Selby bụ onye ọchụnta ego Ghana na-eto eto na onye isi oche nke EPF Educational Empowerment Initiative nke dabeere na Kumasi, Ashanti Region nke Ghana . Ya na Bernice Dapaah rụkọrọ ọrụ wee tọọ ntọala nke Ghana Bamboo Bike Initiative mgbe ọ dị afọ iri na ise. [1] [2] [3] Mgbe ọ dị afọ iri na asaa, o guzobere azụmahịa ọzọ, Afrocentric Bamboo Initiative. [4] [5] N'afọ 2018, ọ ghọrọ onye Ghana mbụ a kpọbatara na Royal Institute of Singapore. [6]

Agụmakwụkwọ na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Selby gara ụlọakwụkwọ Joy Standard College. [7] Ọ bụkwa onye nwetara nkuzi nke Mahadum Cambridge Leading For Change Executive nakwa onye otu Royal Commonwealth Society . [8] Ya na Bernice Dapaah mebere Ghana Bamboo Bike Initiative mgbe ọ dị afọ iri na ise na Afrocentric Bamboo Initiative mgbe ọ dị afọ iri na asaa ozugbo ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị. [4] [9]

Ihe nrite na Mmezu[dezie | dezie ebe o si]

Ihe nrite ya gụnyere ndị a:

  • Anzisha Prize Fellow[10]
  • World Economic Forum Global shaper[11]
  • Onye otu bọọdụ nke Dawadawa Impact Investment Fund
  • Onye òtù bọọdụ nke SHE Scholarships Fund nke EPF Educational Empowerment Initiative.
  • Onye so ná ndị mere nke ọma na 2014 Cartier Women’s Initiative Awards[5][12]
  • Nkwanye ùgwù nke Airtel Touching Lives 2014 Award[13]
  • A kwanyere ya nkwanye ùgwù nke 2015 World of Children Award in New York[14][1]
  • Onye mmeri nke ihe nrite nke 2016 New African Woman in Science , Technology & Innovation Award[10]
  • Onye mmeri nke ihe nrite nke 2017 Queen’s Young Leader Award[6][15][16][17][18]
  • E gosipụtara ya na akwụkwọ akụkọ nke Forbes dika otu n'ime ndị ọchụnta ego Africa a ga-elere anya[5]
  • Onye Ghana mbụ a nabatara na Royal Institute of Singapore[19][6]
  • She has hosted a TED talk with TEDx Accra[20]
  • Onye bubu onye ịsị ala nke mba United States, Barack Obama kpọrọ ya oku ka ọ bụrụ otu onye ga-eso n'ọgbakọ Global Entrepreneurship Summit e mere na Nairobi, Kenya n'afọ 2015[13]

Ọrụ ebere na mmemme[dezie | dezie ebe o si]

EPL Educational Empowerment Initiative[dezie | dezie ebe o si]

Iji kwatuo ihe mgbochi na agụmakwụkwọ na inye ndị na-eto eto ike site na obodo ndị a na-enwetaghi mmepe, Selby tọrọ ntọala EPF Educational Empowerment Initiative. [16]

Ọrụ nke 'Winnifred's Menstrual Pads for Dignity'[dezie | dezie ebe o si]

Ọ tọrọ ntọala Winnifred's Menstrual Pads for Dignity Project nke na-enye ngwaahịa ịhụ nsọ n'efu maka ụmụ agbọghọ nọ na mkpa nọ na mpaghara ndị a na-enwetaghi mmepe na Ghana.

Happy Feed Initiative[dezie | dezie ebe o si]

Selby malitere ọrụ Happy Feed Initiative, bụ nke kwalitere ma mejuo ije ozi gọọmentị Ghana inye nri n'ụlọ akwụkwọ n'efu nakwa uwe akwụkwọ n'efu. Atụmatụ a na-enye akpụkpọ ụkwụ ọhụrụ na ihe mmụta ndị ọzọ dị ka akpa, akwụkwọ, na ihe mgbako nye ụmụaka ụlọ akwụkwọ nọ ná mkpa nọ n'ime obodo ndị nwere nsogbu.

Ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị Ghana[dezie | dezie ebe o si]

Na mmekorita ya na mahadum nkeonwe na Ghana, ọ malitekwara mmemme ịgụ akwụkwọ n'efu maka ụmụ agbọghọ na-agu akwụkwọ kọleji na Ghana nke na-enye ụmụ agbọghọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị mara akwụkwọ, ndị nọ ná mkpa ohere agụmakwụkwọ.

W3 Initiative[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ onye malitere Winnie Women's World. W3 Initiative bụ ọgbakọ anaghị akwụ ụgwọ nke na-akwalite ịha nhatanha nwoke na nwanyị, inye ụmụ nwanyị ike na agụmakwụkwọ nwa agbọghọ na ụmụaka. [19]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Winnifred Selby Receives 2015 World Of Children Youth Award At New York City Gala (en). Modern Ghana. Retrieved on 2019-09-10.
  2. Ghana goes green with bamboo bikes | DW | 18.09.2014 (en-GB). DW.COM. Retrieved on 2019-09-09.
  3. ISMAILY (2014-11-19). WINIFRED SELBY'S GHANA BAMBOO BIKES (en-US). Inspire Afrika. Retrieved on 2019-09-09.
  4. 4.0 4.1 Fearless & Flexible: Winnifred Selby's African Socio-Ecological Business (en). The Way Women Work (2015-01-13). Retrieved on 2019-09-09.
  5. 5.0 5.1 5.2 Africa (2014-10-01). The Eco-Princess (en-US). Forbes Africa. Retrieved on 2019-09-09.
  6. 6.0 6.1 6.2 Social entrepreneur inducted first Ghanaian member of Royal Institute of Singapore. www.myjoyonline.com. Retrieved on 2019-09-09.
  7. Opaluwa (2016-03-23). Winifred Selby: riding on bamboo bikes (en-US). This is africa. Retrieved on 2019-09-09.
  8. Queen Elizabeth Honours Three Young Ghanaians (en-US). GhanaCelebrities.Com (2017-07-01). Retrieved on 2019-09-10.
  9. Kidula (2014-08-31). Bamboo Bikes Creating Sustainable Employment For Women In Ghana. Afromum. Archived from the original on 2019-05-25. Retrieved on 2019-09-09.
  10. 10.0 10.1 Celebrating Africa's Youngest Entrepreneurs | Winnifred Selby.
  11. INDIAFRICA - Winnifred Selby.
  12. Winnifred Selby (en) (2014-06-16). Archived from the original on 2018-01-09. Retrieved on 2022-04-08.
  13. 13.0 13.1 Royal Commonwealth Society honors Winifred Selby (en).
  14. Winnifred Selby, World of Children (en-US).
  15. Ghana's Elijah Amoo Addo, Efua Asibon and Winnifred Selby for The Queen's Young Leaders Award.
  16. 16.0 16.1 Three Ghanaians recognised by UK Queen for their social responsibility work (2016-11-30).
  17. 3 Ghanaians honoured by Queen Elizabeth in UK (en-US) (2017-07-02).
  18. Queens Young Leaders – Alumni (en-US). Archived from the original on 2018-05-12. Retrieved on 2022-04-08.
  19. 19.0 19.1 Editor, William Nana Beeko. Ghana's Winnie Selby Becomes First African And Youngest To Be Conferred At Royal Institute Of Singapore (en).
  20. The Co-founder of Ghana Bamboo Bikes, Winnifred Selby (en-US) (2019-03-28).