Yewande Adekoya

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Yewande Adekoya
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoYewande Adekoya Dezie
Aha ọmụmụYewande Adekoya Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20 Jenụwarị 1983 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Lagos Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, onye nhazi ndu ihe nkiri, onye nhazi ederede Dezie
ebe agụmakwụkwọBabcock University Dezie
ogo mmụtabachelor's degree Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2002 Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
Ihe nriteCity People Entertainment Awards Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Yewande Adekoya (amụrụ na 20 Jenuwarị 1984), bụ Nwaanyị Naijiria n'eme ọrụ ihe nkiri, onye n’eduzi ihe nkiri, na onye na-emeputa ihe nkiri.[1][2]

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Yewande na Lagos Steeti mana o si Ososa-Ijebu na Ogun Steetị ndịda ọdịda anyanwụ Naijiria.[3] Ọ gara ụlọ akwụkwọ ọta akara na ụlọ akwụkwọ praịmarị Bright star, tupu ọ gaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Bright Star Comprehensive High School. O nwetara nzere bachelọ (BA) na Mass communications site na Babcock University. Yewande Adekoya lụrụ di muta ụmụ.[4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Yewande Adekoya bidoro ime ihe nkiri n’afọ 2002 ya na otu ụlọ ihe nkiri bụ Alphabash Music And Theater Group. Ọ depụtara ma mepụta ọrụ mbụ ya na 2006 akpọrọ “Life Secret”. O mepụtala, duzie ma gosipụta n'ọtụtụ ihe nkiri dịka Omo Elemosho, ihe nkiri 2012 nke gosipụtara Bimbo Oshin, Muyiwa Ademola na Yomi Fash-Lanso.[5] Ihe nkiri ahụ natara nhọpụta ise na 10th Africa Movie Academy Awards.[6] A họpụtakwara ya maka "onye ọhụụ kachasị mma" na ngalaba Yoruba na 2014 City People Entertainment Awards.[7] N'otu afọ ahụ, ọrụ ya na Kudi Klepto nwetara ya nhọpụta nke nwaanyị ihe nkiri kachasị mma na mmemme 2014 Best of Nollywood Awards.[8] N’ọnwa Disemba afọ 2014, o ritere “onye ga-eme ofuma n'oge n'adighi anya” na mmemme nke Yoruba Movie Academy Awards.[9] Ihe nkiri ya bụ Kurukuru nwetara ya onyinye nsọpụrụ onye ihe nkiri kacha mma na mmemme ihe nkiri nke 2016 ACIA.[10] N’afọ 2017, ihe nkiri ya bụ Iyawo Adedigba nwetara ya onyinye nsọpụrụ ọzọ maka “ihe nkiri kacha mma nke afọ ahụ” na 2017 City People Movie Awards.[11]

Ndetu ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

  • Life Secrets 1 (2006)
  • Life Secrets 2 (2007)
  • Igbo Dudu (2009)
  • Omo Elemosho (2012)
  • Kudi Klepto (2013)
  • Emere (2014)
  • Kurukuru (2015)
  • The Sacrifice (2016)
  • Tamara (2016)
  • Ayanmo (2016)
  • Ota Ile (2016)
  • Once Upon a Time (2016)
  • Iyawo Adedigba (2017)
  • Fadaka (2018)
  • Belladonna (2018)
  • Odun Ibole (2018)
  • Ewatomi (2018)
  • Omo Aniibire (2019)

Onyinye nsọpụrụ[dezie | dezie ebe o si]

  • 2014 Best New Actress - City People Entertainment Awards
  • 2014 Most Promising Actress 2014 - Yoruba Movie Academy Awards
  • 2014 Most Promising Act - Yoruba Heritage Awards, United States
  • 2016 Best Actress in a leading role 2016 - ACIA

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]