Zain Asher

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Zain Asher
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịObodoézè Nà Ofú Dezie
Aha enyereZain/Zayn Dezie
aha ezinụlọ yaAsher Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya27 Ọgọọst 1983 Dezie
Ebe ọmụmụBalham Dezie
ŃnàArinze Ejiofor Dezie
ŃnéObiajulu Ejiofor Dezie
nwanneChiwetel Ejiofor Dezie
Dị/nwunyeSteve Peoples Dezie
nwaNoah Peoples, Louis Peoples Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ntaakụkọ Dezie
ebe agụmakwụkwọColumbia University Graduate School of Journalism, Keble College Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2006 Dezie
so naFII PRIORITY In Miami, USA Dezie

Zain Ejiọfọ Asher onye a mụrụ ka ọnwa Ọgọst di na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na asaa n'afọ 1983 bụ a British Nigerian na-agụpụta akụkọ n'ụlọ ọrụ CNN International bi na New York City .

Ọ na-agụpụta ihe akụkọ mere eme na CNN Newsroom na CNN International. Na mbu, Asher na-agụpụta akụkọ CNN CNN America. Asher sonyeere ụlọ ọrụ, CNN New York City . [1] dika onye nta akụkọ azụmahia nakwa ịkọwapụta otu ego si eje maka azụmahia ndị a. Ọ nwekwara ihu akwụkwọ na Money Magazine ebe ọ na-ede maka ihe gbasara ego kwa ọnwa ọbụla. [2]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Asher na Balham, London Borough of Wandsworth Nne na Nna ya bụ ndị Nigeria. Asher bụ nwanne nwaanyị Chiwetel Ejiofor onye nke na-emepụta ihe nkiri Egwuregwu na mba America. Asher bụ ọnye Igbo Ezinaụlọ ya si na Lokal Gọọmentị nke Ezeagụ di n' Enugu steeti Nigeria.[3] [4] .

Asher gụrụ akwụkwọ na Keble College dị na Oxford University n'afọ 2005 ebe ọ nọrọ nweta digiri n;asụsụ Spanish nakwa French. [5] N'afọ 2006 ọ nwetakwara digiri ọzọ n'ihe gbasara ịchụ nta akụkọ site na 'Graduate School of Journalism di na Columbia University, n'ime New York. [6]

Mbido Ọrụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Tupu ọ bido ọrụ na CNN n'ọnwa Febuwari n'afọ 2013, Asher na-arụ n'ụlọ ọrụ 'Money Magazine' ebe ọ na-ede maka ihe gbasara ego. Asher rụkwara ọrụ dika onye na-agụpụta akụkọ di iche iche na News 12 Brooklyn, di na Brooklyn, the Bronx nakwa Connecticut. [7] [8]

Ebe Nsinweta[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Quick Links", CNN.
  2. "Is Living with Mom and Dad Starting to Cramp Your Style? Take These Steps to Independence", Time.
  3. Mesure, Susie. "Chiwetel Ejiofor: 'I find racial concepts fascinating'", The Independent, 27 January 2013. Retrieved on 5 November 2013.
  4. "Quick Links".
  5. 35 Years of Keble Women. Keble College, Oxford University. Archived from the original on 2019-03-02.
  6. "Quick Links".
  7. "Quick Links", CNN.
  8. "Quick Links", CNN.