Gaa na ọdịnaya

Zain Asher

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Zain Asher
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịObodoézè Nà Ofú Dezie
Aha enyereZain Dezie
Aha ezinụlọ yaAsher Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya27 Ọgọọst 1983 Dezie
Ebe ọmụmụBalham Dezie
ŃnàArinze Ejiofor Dezie
ŃnéObiajulu Ejiofor Dezie
NwanneChiwetel Ejiofor, Kandi Ejiofor Dezie
Dị/nwunyeSteve Peoples Dezie
NwaNoah Peoples, Louis Peoples Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaEnglish Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ntaakụkọ Dezie
Ebe agụmakwụkwọColumbia University Graduate School of Journalism, Keble College Dezie
Oge ọrụ ya (mmalite)2006 Dezie
So naFII PRIORITY In Miami, USA Dezie
Webụsaịtịhttps://www.zainasher.com/ Dezie
Zain Asher 2022 Texas Book Festival

Zain Ejiọfọ Asher onye a mụrụ ka ọnwa Ọgọst di na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na asaa n'afọ 1983 bụ a British Nigerian na-agụpụta akụkọ n'ụlọ ọrụ CNN International bi na New York City .

Ọ na-agụpụta ihe akụkọ mere eme na CNN Newsroom na CNN International. Na mbu, Asher na-agụpụta akụkọ CNN CNN America. Asher sonyeere ụlọ ọrụ, CNN New York City . [1] dika onye nta akụkọ azụmahia nakwa ịkọwapụta otu ego si eje maka azụmahia ndị a. Ọ nwekwara ihu akwụkwọ na Money Magazine ebe ọ na-ede maka ihe gbasara ego kwa ọnwa ọbụla. [2]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Asher na Balham, London Borough of Wandsworth Nne na Nna ya bụ ndị Nigeria. Asher bụ nwanne nwaanyị Chiwetel Ejiofor onye nke na-emepụta ihe nkiri Egwuregwu na mba America. Asher bụ ọnye Igbo Ezinaụlọ ya si na Lokal Gọọmentị nke Ezeagụ di n' Enugu steeti Nigeria.[3] [4] .

Asher gụrụ akwụkwọ na Keble College dị na Oxford University n'afọ 2005 ebe ọ nọrọ nweta digiri n;asụsụ Spanish nakwa French. [5] N'afọ 2006 ọ nwetakwara digiri ọzọ n'ihe gbasara ịchụ nta akụkọ site na 'Graduate School of Journalism di na Columbia University, n'ime New York. [6]

Mbido Ọrụ ya

[dezie | dezie ebe o si]

Tupu ọ bido ọrụ na CNN n'ọnwa Febuwari n'afọ 2013, Asher na-arụ n'ụlọ ọrụ 'Money Magazine' ebe ọ na-ede maka ihe gbasara ego. Asher rụkwara ọrụ dika onye na-agụpụta akụkọ di iche iche na News 12 Brooklyn, di na Brooklyn, the Bronx nakwa Connecticut. [7] [8]

Ebe Nsinweta

[dezie | dezie ebe o si]
  1. "Quick Links", CNN.
  2. "Is Living with Mom and Dad Starting to Cramp Your Style? Take These Steps to Independence", Time.
  3. Mesure, Susie. "Chiwetel Ejiofor: 'I find racial concepts fascinating'", The Independent, 27 January 2013. Retrieved on 5 November 2013.
  4. "Quick Links".
  5. 35 Years of Keble Women. Keble College, Oxford University. Archived from the original on 2019-03-02.
  6. "Quick Links".
  7. "Quick Links", CNN.
  8. "Quick Links", CNN.