Empress Njamah
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Empress Njamah |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | omee |
ebe agụmakwụkwọ | Olabisi Onabanjo University |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Empress Njamah bụ nwaafọ Naịjirịa na -eme ihe nkiri. [1] N'afọ 2012, a họpụtara ya n'ihe nrite ''best supporting actress'' na Afrika Movie Academy Awards, mana Terry Pheto meriri ya.
Ndụ onwe
[dezie | dezie ebe o si]Ndị nne na nna Njamah sitere na Naijiria na Kameruun. Ọ bụ onye nwtara nzere bachelọ n'agụmagụ Bekee na Mahadum nke Olabisi Onabanjo,dị na Ogun Steeti . Ya na Timaya yiburu, mana mmekọrịta ahụ kwụsịrị mgbe ọ ghọọrọ isiokwu nke mkparịta ụka na soshal midia.[2][3] N’ikwu okwu banyere ọnọdụ alụm di na nwunye ya, ọ kọwara na ị nọ n’alụghị di anaghị enye ya nsogbu ebe ọ bụ na ndị ezinụlọ ya maara ihe ma ghọta na oke ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke ahaghị. Ọ gara n'ihu ị kọwa na alụmdi na nwunye ndị a ma ama anaghị adịgide, na ọ nweghị isi ọ bụla i mefu ego maka agbamakwụkwọ nke na-agaghị adịgide n'oge. N'ihe gbasara ''baby mama '' na Nollywood, ọ kọwara The Punch na ọtụtụ n'ime ụmụ nwanyị na-eme ihe nkiri na-alụbeghị nwanyị nwere ụmụaka na-akwa mmakwaara maka usoro ndụ ha mana ha enweghị obi ike iji kwuo nke ahụ n'ihu ọha.[4]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Ọ malitere i me ihe nkiri n'afọ 1995. Dịka akụkụ nke ọrụ ya na-elekọta mmadụ, ọ malitere ntọala a na-akpọ House of Empress, nke na-elekọta ụmụaka nwere mkpa pụrụ iche. Ntọala ahụ mere emume ncheta afọ nke iri ya n'afọ 2016. [5] [6]
Ihe nkiri
[dezie | dezie ebe o si]Afọ | Ihe nkiri | Ọrụ | Ihe edeturu |
---|---|---|---|
2000 | Girls Hostel | Tunica | Na Uche Jombo |
2004 | Missing Angel | ||
2006 | Liberian Girl |
- The Pastor and the Harlot
- You Broke My Heart
Nrụtụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Actress Empress Njamah goes on Summer Holiday with her Mother. bellanaija.com. Retrieved on 8 August 2016.
- ↑ Empress Njamah finally opens up on failed romance -‘I regret dating Timaya!’. encomium.ng. Retrieved on 8 August 2016.
- ↑ Timaya: “Empress Njamah has a Negative Record It Affected Me” Music Star to Release Memoir in 2014. bellanaija.com. Retrieved on 8 August 2016.
- ↑ I’m not under any pressure to get married –Empress Njamah. punchng.com. Retrieved on 8 August 2016.
- ↑ Empress Njamah Celebrates 10th Anniversary Of Her Foundation With Birthday Party With Celebrity Friends (Photos). 36ng.com.ng. Archived from the original on 28 August 2016. Retrieved on 8 August 2016.
- ↑ Empress Njamah Celebrates Birthday With Less Privileged. naij.com. Retrieved on 8 August 2016.
Njikọ dị na mpụga
[dezie | dezie ebe o si]- Empress Njamah on IMDb