Hilda Baci
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Hilda |
aha ezinụlọ ya | Effiong Bassey |
ụbọchị ọmụmụ ya | 20 Septemba 1996 |
Ebe ọmụmụ | Ȯra Akwa Ibom |
Ńné | Lynda |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ebe agụmakwụkwọ | Madonna University |
Ebe obibi | Lagos |
agbụrụ | African people |
okpukpere chi/echiche ụwa | Onye Kraịst |
Ụcha ime anya | agba aja aja |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
Ọmụma Mmekọahụ | heterosexuality |
Hilda Effiong Bassey nke a maara nke ọma dị ka Hilda Baci (amụrụ na 20 Septemba, 1996) bụ osinri onye Naijiria, onye na-ejikwa ụlọ nri na onye na-eme ihe nkiri.[1] N'ọnwa Ọgọstụ 2021, ọ turu ugo na asọmpi "Jollof Faceoff".[2]
Mbido ndụ na ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Hilda sitere na mpaghara Nsit Ubium, steeti Akwa Ibom, Nigeria. A mụrụ ya na 20 Septemba, 1996. O ritere nzere na sociology site na Mahadum Madonna, Okija .[3] Ọ bụ onye njikwa nke "Dine on A Budget" na Pop Central TV, Dstv Channel 189.[4]
Ihe nkiri
[dezie | dezie ebe o si]Afọ | Ihe nkiri | Ọrụ |
---|---|---|
2020 | Onye na-achụ nrọ[5] | |
2021 | Ịga N'elu Mmiri[6] | Annie |
2023 | Maazị na Oriakụ Robert[7] | Hilda |
Asọmpi Guinness World Record
[dezie | dezie ebe o si]Na Machị 2023, Hilda kwupụtara na ọ ga-anwa asọmpi maka oge isi nri kachasị ogologo.[8] Ọ bụ Lata Tondon[9] ji ọkwa ahụ n'oge gara aga, onye siri nri were awa 87, nkeji 45 na 2019.[10][11]
N'abalị 11 n'ọnwa Mee, afọ 2023, ọ malitere asọmpi ya akpọrọ "Cook-a-thon".[12][13] O rutere ma gafere onye ji ọkwa ahụ n'oge gara aga n'abalị 15 nke ọnwa Mee, afọ 2023.[14]
Na Mọnde Mee 15, 2023, ka ọ kụrụ elekere 7:45 kpọmkwem nke ụtụtụ, Hilda weghara ọkwa ahụ dịka onye siri nri ogologo oge kachasị, dịka o sielarị nri awa 87 na nkeji 50 - nkeji 5 karịa onye ji ọkwa ahụ n'oge gara aga na 2019[15]
Iji setịpụ ihe ndekọ ọhụrụ nke oge isi nri kachasị ogologo, Hilda setịpụrụ na mbụ isi nri maka awa 96, mana o mechara gbatịa ya ruo awa 100.
nri kachasị ogologo, Hna mbụ ilda setịpụrụ isi nri maka awa 96, manamhe mgbaru ọsọ ya ruo 100 awa.[16][17]
Ọtụtụ ndị Naijiria ama ama nke ukwuu gara leta Hilda gụnyere, Gọvanọ nke Lagos State, Babajide Sanwo-Olu; Onye isi ụkọchukwu nke Harvester International, Bolaji Idowu; Onye na-agụ egwu, Tiwa Savage.[18][19]
Onye osote onye isi ala nke Naịjirịa, Prọfesọ Yemi Osinbajo kpọkwara Hilda n'ekwentị ma gbakwaa ya ume.[20] Hilda nwetara nnukwu nkwado site n'aka ndị Naijiria bụ ndị gbakọtara ma nọnyere ya n'ebe ọ nọ na-esi nri ahụ. Ebe ndị ọzọ na-agbasa aha ya na Social Media.
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ HILDA BACI: THE RISING STAR OF NIGERIAN CUISINE. Vanguard Allure.
- ↑ Nigerians Cheer As Hilda Baci Inches Closer To Guinness World Cooking Record. Channels TV.
- ↑ Ibeh (2023-04-22). Hilda Baci: Inspiring Women To Follow Their Dreams (en-US). Retrieved on 2023-05-13.
- ↑ Yaakugh (2023-05-14). 4-day non-stop cooking, 9 other things to know about Hilda Baci and cookathon (en). Legit.ng - Nigeria news.. Retrieved on 2023-05-15.
- ↑ Writer (2020-02-19). 7 movies and series on Showmax nominated for AMVCAs (en). Showmax Stories. Retrieved on 2023-05-13.
- ↑ Rapheal (2023-04-08). How I built huge restaurant brand from remote tiny apartment –Hilda Baci, multi-talented actress, TV producer, host, foodprenuer (en). The Sun Nigeria. Retrieved on 2023-05-13.
- ↑ Mr & Mrs Robert (2023) (en). Radio Times. Archived from the original on 2023-05-13. Retrieved on 2023-05-13.
- ↑ Firm Plans Longest Cooking Marathon to Break World Record – THISDAYLIVE. www.thisdaylive.com. Retrieved on 2023-05-13.
- ↑ Sharma. "Chef Lata Tondon | Guinness World Record | First Woman Record Holder", The Global Indian, 20 December 2021.
- ↑ "Rewa woman on way to cooking up a record", The Times of India, 2019-09-07. Retrieved on 2023-05-13.
- ↑ Longest cooking marathon (individual) (en-gb). Guinness World Records. Retrieved on 2023-05-13.
- ↑ Nigerian chef Hilda Baci goes after world record for longest cooking marathon (en-US). TheCable Lifestyle (2023-04-20). Retrieved on 2023-05-13.
- ↑ Ajayi (2023-05-14). Sanwo-Olu visits Hilda Baci as chef attempts world's longest cooking time record (en-US). Peoples Gazette. Retrieved on 2023-05-15.
- ↑ Taiwo. "Breaking: Nigerian chef, Hilda Baci breaks Guinness World Record for ‘longest cooking time’", Vanguard, 15 May 2023.
- ↑ Idowu. "Cook-a-thon: Nigerian chef, Hilda Baci, sets new Guinness World Record for ‘marathon cooking’", Punch, 15 May 2023.
- ↑ Nsikak. "Nigeria’s Hilda Baci breaks Guinness world record for longest cooking time", Dailypost, 15 May 2023.
- ↑ Ayodele (2023-05-15). Guinness World Record: Hilda Baci extends cooking record to 100 hrs. Daily Post Nigeria. Retrieved on 2023-05-15.
- ↑ Adelagun (2023-05-14). PHOTOS: Sanwo-Olu visits as Hilda Baci attempts Guinness World Record for longest cook-a-thon (en-GB). Premium Times Nigeria. Retrieved on 2023-05-15.
- ↑ tiwa savage visits hilda baci (en). Bing. Retrieved on 2023-05-15.
- ↑ Owolawi (2023-05-15). Hilda Baci: Tinubu, Tiwa Savage, Burna Boy, others who showed chef support (en). Legit.ng - Nigeria news.. Retrieved on 2023-05-15.