Fidelia Njeze

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Fidelia Njeze
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoAkuabata Dezie
Aha enyereFidelia Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya8 Jụn 1964 Dezie
Ebe ọmụmụEnugwu Steti Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
ụdị ọrụ yapharmacist Dezie
onye were ọrụNaijiria Dezie
Ọkwá o jiambassador of Nigeria, Minister of State for Agriculture and Rural Development, Minister of Aviation of Nigeria, Minister of State for Defence of Nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria Dezie

Fidelia Akuabata Njeze (onye nke amuru na abali asato nke onwa June n'afọ iri na iteghete ọgu atọ na anọ nke bu 1964 na bekee) bu onye nochite anya Naijiria no obodo Switzerland na Liechtenstein . A họpụtara ya na mgbe mbụ dị ka onye isi nke ngalaba ihe gbasara ugbọ elu na Nigeria niile na ụbọchị isii nke ọnwa Eprel n'afọ puku abụọ na iri (2010). Nke a mere tupu onye isi ala Jonathan echi zuo, mgbe ọ mara ọkwa maka ndị ọhọọrọ ọhụrụ maka ịsoro ya rụọ ọrụ na kabinet ya. Tupu ọkwa ahụ, Njeze rụrụ ọrụ dị ka Mịnịsta nke bu onye nlekọta na-ahụ maka ọrụ ugbo na ihe gbasara mmiri na ọbere Minista maka Nchebe obodo na kabinet nke President Umaru Yar'Adua nke nara nmuọ. [1]

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Njeze na ụbọchị asatọ na ọnwa June, n'afọ 1964 na Enugu State. Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndrị na ụlọ akwụkwọ Girls High School Awkunanaw, Enugu. Ọ gara n'ihu nweta asambodo BSc maka ndị na-eme ọgwụ nke bekee n'akpọ Pharmacy na Mahadum nke Nigeria, dị na Nsukka a'na akpọ UNN na aha ichafu. Mgbe ọ gasịrị ọzụzụ otu afọ a na-akpọ internship na asụsụ bekee, ọ ga'ra obodo Naijira ozi dị ka esi eme ya nke n'akpọ National Youth Service Corps site na afọ 1990 ruo 1991. Ọmere nke a na ụlọ ọgwụ na-elekọta maka ọkpụkpụ nke a'na akpọ National Orthopedics Hospital, dịkwa na Enugu. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-eme ma na-ere ọgwụ n'ụlọ ọrụ Chinors Pharmacy n'afọ 1992. Site na afọ 1996 rue 2007 Njeze bụ onye isi nchịkwa nke Gredel Pharmacy.

N’afọ 2004 a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye otu ndị na-elekọta ahụike na Enugu State a'na akpọ Health Services Management Board iji nye aka ịgbanwe ngalaba ahụike na steeti Enugwu .

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Njeze dị ka Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa obodo na ọnwa Julaị n'afọ 2007 mgbe onye isi ala oge ahụ Umaru Yar'Adua họpụtara ya. Ndi Senate nke Federal Republic of Nigeria nyochara ya nke ọma. Ya mere, na ụbọchị iri na asaa, n'ọnwa Disemba n'afọ 2008 ọ ghọrọ Minista nke ọbere maka Ọrụ Ugbo na ihe gbasara mmiri mgbe onye isi ala ahụ mere n'gbanwee na ndị ha na ya na-arụ ọrụ. [2] A họpụtara ya ka ọ bụrụ Mịnịsta na-ahụ maka ụgbọelu na ụbọchị isii nke ọnwa Eprel n'afọ 2010 site n’aka onye isi ala Goodluck Jonathan mgbe ọ banyechara n’ọchịchị. Na Satọde,ụbọchị nke ise n'ọnwa Maachị n'afọ 2011, n'oge emume nke ndị gụchara akwụkwọ nke iri abụọ na atọ na Mahadum nke Teknụzụ, Federal University of Technology Owerri (FUTO) nyere Oriakụ Njeze asambodo Honorary Doctorate dị ka dọkịta nke njikwa teknụzụ. 

Ọ nwetala nsọpụrụ dị iche iche site na'aka ndị ọtụtụ otu na emepụta ọgwụ nke na'egosi na Njeze bu ọkachamara na-emepụta ọgwụ, ma bụrụkwa onye nnọchi anya ọrụ ahụ. Ihe nsọpụrụ enyere ya dị ọtụtụ gunyere;

  • Onye nnọchi anya (Ambassador) Pharmaceutical Society of Nigeria (National) na afọ 2007,
  • Ọkachamara na ihe gbasara Ọgwụ na Nlekọta Ọrụ Mba site na aka ndị Pharmaceutical Society of NIgeria na ọnwa Machị n'afọ 2009,
  • Onyinye Mmekọrịta site na West African Postgraduate College of Pharmacists (WAPCP) Ghana n'ọnwa Machị n'afọ 2009,
  • Onyinye Ọrụ Ndị site n'aka UNN Alumni Association alaka Abuja na n'afọ 2010,
  • Onye ọdịiche gụrụ akwụkwọ Alumnus na Ngalaba nke sayensị ọgwụ na UNN na ọnwa Eprel n'afọ 2012  .

N'oge ntuli aka nke n'afọ 2011, ọ kwadoro ma gbasaa mkpọsa ozi nke ọma maka President Goodluck Jonathan . Mgbe nhoputa ndi ochichi nke afọ ahụ gachara, President Goodluck Jonathan hoputara Njeze ka o duzie otu n’ime komiti nraranye nke ga enyere aka ọrụ ohuru a. Onye isi ala Goodluck Jonathan họpụtara Fidelia Akuabata Njeze maka ọkwa nke onye nnọchi anya Naịjirịa n'ọnwa Disemba n'ụbọchị nke mbụ, n'afọ 2011. Mgbe nke a gasịrị ndị Senate nyochara ya ma kwado ya . Maka nke a, a họpụtara Njeze ka ọ bụrụ onye nnọchi anya Naijiria na Switzerland na Liechtenstein na ọnwa June n'ụbọchị iri na abụọ, n'afọ 2012. N'ụbọchị nke anọ n'ọnwa Septemba na otu afọ ahụ Onye nnochite anya Fidelia Akuabata Njeze gara n'ihu chee akwụkwọ ozi nke nzere nye Onye isi ala nke Switzerland Confederation Eveline Widmer-Schlumpf. O gosipụtara akwụkwọ ozi nke nzere maka ntozu nye mba Liechtenstein n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba 14, na otu afọ ahụ. 

Nnukwu ahụmịhe nke ọ chịkọtara kemgbe ọtụtụ afọ na ọrụ ọhaneze mere ka ọ bụrụ nnukwu akụ nke bara uru na mba Naijiria na steeti obodo ya. Ahụmahụ ihe nke a mere ka ọ sonye na otu nmadu iri na ise ndị ndụmọdụ ndị n'ahụ maka akụ na ụba akpọrọ Economic Advisory Committee (EAC) nke Gọvanọ steeti ahụ guzoro na ọnwa June n'ụbọchị iri abụọ na otu, n'afọ. E guzobere kọmitii ahụ maka iji kwalite ma mmụba akụ na ụba na-aga n'ihu, na echiche ọhụrụ banyere okwu akụ na ụba steeti, ma ịkwalite itinye ego na ndụmọdụ gọọmentị banyere otu esi eme ka steeti Enugwu bụrụ ebe azụmahịa na aga nke ọma maka ọchịchọ ịkwalite ụkpụrụ ibi ndụ nke ụmụ amaala ahụ . 

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ministers - the Profiles. ThisDay (7 April 2010). Retrieved on 2010-04-13.
  2. Anza Philips (24 December 2008). The Coming of New Helmsmen. Newswatch. Retrieved on 2010-04-13.