Eucharia Okwunna: Ọdịiche dị n'etiti nyochagharị
Created by translating the page "Eucharia Okwunna" |
O nweghị ihe dị iche.
|
Orübà nà ógè 09:20, 16 Novemba 2020
Eucharia Azodo Okwunna (a mụrụ n'ụbọchị nke 3 n'ọnwa Nọvemba,nke afọ 1961) bụ nwaafọ Naijiria bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ bụbu onye otu People's Democratic Party na ụlọ omeiwu nke gọọmentị etiti . N'afọ 2019, o so n’ime ụmụ nwaanyị iri abụọ na otu bụbu sịnetọ na Naijiria.
Ndụ
A muru ya n'afọ 1961. A hoputara ya n'afọ 2003 ma weghachite ya n'afọ 2007 na ulo nzuko omeiwu nke Anambra Steeti ebe a hoputara ya dika ọnụ na-ekwuru ụlọ nzukọ omeiwu ahụ. [1] Ọ bụ nwanyị mbụ a họpụtara jidere ọkwa ahụ . [2]
A họpụtara y dịka onye ndọrọ-ndọrọ otu People Democratic Party maka ụlọ omeiwu gọọmentị etiti . A hoputara ya n'afọ 2011. N'afọ 2015, ọ bụ otu n'ime ụmụ nwanyị iri na ise na otu n'ime mmadụ iri sitere na People's Democratic Party (Naijiria) ndị ahọpụtara na 8th National Assembly . Ọ nọchitere anya Aguata . Ụmụ nwaanyị PDP ndị ọzọ bụ Nnenna Elendu-Ukeje, Sodaguno Festus Omoni, Nkiruka Chidubem Onyejeocha, Rita Orji, Evelyn Omavovoan Oboro, Beni Butmaklar Langtang, Omosede Igbinedion Gabriella, Stella Obiageli Ngwu na Fatima Binta Bello . [3]
Ọ nọrọ n'ụlọomeiwu ihe ruru afọ asatọ tupu ọ kpebie ịzọ ọkwa sinetọ n'afọ 2018 ị nọchite Anambra Saụt. [2] Ọ bụ onye omeiwu maka otu PDP n'afọ 2019 na otu n'ime ụmụ nwanyị 21 nọ na sịneti Naijiria. [4]
Ndụ nkeonwe
Ọ na-alụ Betrand Azodo [5] ,ha nwere ụmụ anọ toro eto, ọ bụkwa nne nne. [2]
Nrụtụaka
- ↑ Celebrities 28 04 13 (en).
- ↑ 2.0 2.1 2.2 Eucharia Azodo eyes the Red Chamber (en-US). Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name "red" defined multiple times with different content - ↑ Jimoh, Abbas (2015-06-06). Women of the 8th National Assembly (en-GB).
- ↑ Meet the 21 Female Elected Senator & House Of Reps. Members In Nigeria ⋆ (en-US) (2015-04-27).
- ↑ Hon. Eucharia Okwunna biography, net worth, age, family, contact & picture.