Nnenna Elendu Ukeje

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nnenna Elendu Ukeje
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Akụkụ nkeHouse of Representatives of Nigeria Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereNnenna Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya24 Ọktoba 1969 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ulo nnochite anya Naijiria, onye otu ulo nnochite anya Naijiria, onye otu ulo nnochite anya Naijiria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Lagos, Mahadum nke Benin, Federal Government Girls College Owerri Dezie
ogo mmụtaBachelor of Arts Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

Nnenna Ijeoma Elendu Ukeje bụ onye na anọchite anya ndi Bende, Abia State, Nigeria na gburugburu nke Etiti. A họpụtara ya ọzọ na ọkwa nka na ọnwa nke ise na afọ 2011, enye kwara ya okwa nke onye isi oche na ahụ maka nmekọrita anyi na mba di ọzọ. Na ndọrọ ndọrọ nke afọ 2015 ahọpụtara ya ọzọ ma nyekwa ya onye isi oche na ahụ maka nmekọrita anyi na mba di ọzọ. 

Ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Ukeje bụ onye Alayi na Abia State, ọ gụrụ sekọndịrị na ụlọ akwụkwọ a na akpọ Federal Government Girls College, Owerri, Imo State. Ọgụkwara akwụkwọ na mmahadụm nke Benin nọ na Edo State tụpụ ya aga weta asambodo na Mahadụm nke a na akpọ University of Lagos.  Asambodo nke oritere bụ na ngalaba ndi na ahụ maka ihe mmụta.[1]

Tụpụ ya ebido ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ gbara mbọ na ọrụ njikwa ụlọ-oriri na nkwari. Ụkeje mere ka ndi mmadụ mara na mmasi ya maka ihe gbasara ọrụ ohanaeze si na aka papa ya nwụrụ awụ bụ Kaptin Elendu-Ụkeje, onye etụrụ ụgo na okwa ya (Onye na anya ụgbọelu) na ụlọ ọrụ ya na Naijiria Air Fọsụ ya na Naijirian Airwes tụpụ ọga ezụmike-nka. Mama Ụkeje aha ya bụ Roseline Ukeje, jere ozi na ọnọdụ Onyeisi Ikpe na Ụlọ-Ikpe elu nke Etiti tụpụ ọ laa ezụmike-nka.[2][3]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ochịchị[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe Ukeje dabatara na ndọrọ ndọrọ ọchichi na afọ 2007 , o were ọkwa onye nochitere anya ndi Bende na agbụrụ Gomentị Etiti, Abia Steetị na People's Democratic Party (Nigeria). A họpụtaghariri ya ọzọ na afọ 2011.

References[dezie | dezie ebe o si]

  1. Assembly, Nigerian National. National Assembly | Federal Republic of Nigeria (en).
  2. Uzoanya, Ekwy P.. Nigerian Women’s Scorecard In 2015 Polls. The Guardian. Retrieved on 28 December 2017.
  3. Biography of Nnenna Ukeje. Nigerian Biography (20 November 2015).