Ọjà (ngwa egwu)
| Mba/obodo | Naijiria |
|---|---|
| Ebe | Ndịda ọwụwa anyanwụ Naijiria |
| Ndị ji ya eme ihe | Ndị Igbo |
| Ihe eji ya eme | omenala, egwu nka |
Ọjà bụ ngwa egwu si n'ọwụwa anyanwụ Naijiria nke a na-ejikarị ngwa ndị Naijiria ndị ọzọ dị ka ekwe, udu, igba, okwa na ichaka/osha eji agu egwu. Ngwá egwú a pụrụ iche ‘na-ekwu okwu’ ka ndị na-akụ egwu na ndị na-agba egwú, na-agba egwu. N'oge a na-agba egwu mmawu na ọwụwa anyanwụ Naijiria, onye ọfụfụ oja na-edu egwu na abụ otuto.[1][2][3] Onye isi ofufu ọjà na-enwe ike iwepụta ọtụtụ ụda dị ka okwu ọnụ. Ọ bụrụ na onye dị mkpa abanye n'ime oghere igba egwu, onye n'afu ọjà nwere ike iji ngwá egwu a kpọsaa aha onye ahụ. [2]
Nkọwa
[dezie | dezie ebe o si]
Ọjà bụ ngwa egwu agụnyere na ngwa egwu ikuku. E nwere ihe abụọ a na-eji arụ ya, nke mbụ bụ osisi, nke na-abụkarị osisi dị nro ma na-egbuke egbuke; nke abụọ bu nke e ji achara mee. N'ime ụdị ihe abụọ a e ji arụ ya, nke osisi na-aka nọtee aka ruo ogologo oge. Ọjà dị ezigbo mkpa, nwekwa ike na ọrụ dị omimi ọ na-arụ na omenala nakwa ndụ ndị Igbo. Ihe e ji mara ọjà bụ ụdị ụda dị elu dị iche iche ọ na-emepụta, na-agbanyeghị na ọ bụ ngwá egwu dị ntakịrị. Ọjà kachasị ukwuu onye odeakwụkwọ bụ Paul Basu chọpụtara dị ihe dịka 26cm n'ogologo, ma nke kacha nta dị 14cm n'ogologo. Ogo ọjà ọbụla na-ekpebi ịdị elu nke ụda ya nakwa ịdị mma ya na ọrụ dịka ngwá egwu. [2]
Ụdị ọjà
[dezie | dezie ebe o si]Ndepụta ndị a dị n'okpụrụ n'akọwa ụdị ọjà di iche iche na ala Igbo
- Ọjà Mmanwụ: ọjà eji eme mmemme mmanwụ
- Ọjà Okolọbia: ọjà nke a bụ nke a na-eji eme emume ụmụ nwoke topụtara dimkpa
- Ọjà Igede: Nke a bụ ọjà uda ya kacha dị ala. Igede bụ ịgba a na-eji eme emume olili mmadu. A na-eji Ọjà igede eme ihe n'ụzọ abụọ, nke mbụ bụ ọjà nwoke, nke na-akpọ oku; nke abụọ bụ ọjà nwanyị; nke na-aza aza.
- Ọjà Ukwe: a na-eji nke a eme mmemme maka ịgba ụdị egwu ụmụ nwanyị ọ bụla.[2]Nke a bụ ụdị *Oja* a na-eji eme ihe kpọmkwem n'oge emume mgbanwe site na nwata gaa n'ọkwa nwoke tozuru oke. *Oja-Okolobia* na-arụ ọrụ dị mkpa n'emume ọdịnala na omenala ndị Igbo, ebe ọ na-anọchite anya usoro mgbanwe ahụ na-egosi ịbanye n'ọkwa mmadụ tozuru oke.[4]
Ngwa egwu Igbo ndị ọzọ
[dezie | dezie ebe o si]Reference
[dezie | dezie ebe o si]- 1 2 3 Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
- 1 2 3 4 Paul Basu (2018-10-25). "Alele, Ọja, Flute". [Re:]Entanglements (in Bekee ndị United Kingdom). Retrieved 2023-02-10.
- ↑ Michael Chiedoziem Chukwudera (2021-07-21). "Oja, The Musical Instrument That Mirrors Igbo Spirituality" (in Bekee). Retrieved 2023-02-10.
- ↑ Basu, Paul (2018-10-25). "Alele, Ọja, Flute". [Re:]Entanglements (in Bekee ndị United Kingdom). Retrieved 2026-09-19.
- 1 2 Adrianna Simwa (2017-09-22). "Top 10 Igbo Traditional Musical Instruments". Legit.ng - Nigeria news. (in Bekee). Retrieved 2023-02-10.