Abiodun Olujimi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Abiodun Olujimi
Mmádu
Akụkụ nkeNigerian senators of the 9th National Assembly Dezie
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoAbiodun Christine Olujimi Dezie
Aha ọmụmụAbiodun Christine Olujimi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya25 Disemba 1958 Dezie
Ebe ọmụmụOmuo Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ndi omeiwu nigeria, onye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Abuja Dezie
ogo mmụtadiploma, Bachelor of Science, postgraduate degree Dezie
isi agụmakwụkwọoru nta akuko, political science, marketing Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie
Ụcha ime anyaagba aja aja Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Abiodun Christine Olujimi (amụrụ na ụbochi iri abụọ na ise nke ọnwa iri na abụọ na afọ 1958) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchichi nke si na obodo Naijiria.[1] Ọbụ onye ome iwu nke Obodo Naijiriya nke na anọchite anya gburu gburu Ekiti South ma bụrụ kwa onye osote ọchichi nke bekee kpọrọ minority whip.[2] Ọ bụ onye ama ama maka obi ya kara aka na ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchichi, usoro ọchichi nke ime odinala na ọtụtụ ihe otinyere na ihe gbasara okwu igwe nke nzisa ozi ekwe nti mgbe ọbụ onye otu bọọdụ nke ndi Nigerian Communications Commission.

Mbido Ndu Na Agụmagụ[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ ya na ezi na ụlọ ndi ogbenye nke ndi Obodo Omuo Ekiti nke di na Ekiti Steetị. Nwa ada Olujimi gbara oke mbọ ma na edebe ego obere obere maka ihe gbasra agụmagụ akwụkwo ya site na mgbe ọgbara afọ iri na anọ mgbe obidoro rụba ọrụ ka onye na ere akwa na obodo Lagos. Agụmagụ akwụkwọ ya bidoro na ụlọ akwụkwọ Our Lady of Apostles di na Ibadan, Oyo Steetị na ụlọ akwụkwọ nke Nigerian Institute of Journalism ebe onwetere asambodo nke Diploma na afọ 1976. Biodun Olujimi ritere nzere nke Mahadum na usoro nke bekee na akpọ Political Science na nke abụọ na usoro nke Public Relations na Marketing site na Mahadum nke University of Abuja.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Nwa ada Biodun ritere uru na ọrụ nke igbasa okwu na nke onye nta akụkọ na agbanyeghi na ọbụghi ọrụ nke ọchọrọ irụ.[3] Ọrụrụ ọrụ ka onye nta akụkọ na ụlọ nta akụkọ nke Nigerian Tribune, Nigerian Posts and Telecommunication, Nigerian Television Authority, na Delta Steel Company, Ovwian nke di na Aladja, Reflex Concept, DBN Television.[4] Oruru ọkwa nke di elu na ụlọ akụkụ nke ndi DBN TV ka onye Nghazi site na afo 1993 ruo na 1997.[5]

Osoro di ya bido dọwa ndọrọ ndọrọ ọchichi na afọ 1997 mgbe enyere ya ọkwa nke National Publicity Secretary nke ndi otu NCPN nke gbuo tupu obanye na otu nke ndi All Peoples Congress (APC) ebe enyekwara ya ọkwa nke National Publicity Secretary.

Na afọ 2002, Olujimi banyere na otu ndi Peoples Democratic Party (PDP) nke tinyere aka na nrite uru nke onwere na ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchichi. Na afọ 2003, enyere ya okwa nke Special Assistant nke onye isi ọchichi nke Ekiti Steetị ebe osiri ji we zụo ma merie iga na ndi ome iwu nke ụlọ ala nke etiti. Na afọ 2005, aghọrọ ya ka osote onye isi ọchichi nke Ekiti Steetị tinyere onye isi ọchichi Ayo Fayose. Olujimi riri elu nke ebe ọdi ukwu na ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchichi site na ibụ onye kọmmishọner nke na ahụ maka ihe gbasara ọrụ mmepe obodo ma bụrụ kwa onye na ahụ maka ihe gbasara ụmụ nwanyi. Na afọ 2015, ọdọrọ ma merie na okwa nke onye ome iwu nke ulo elu ma bụrụ onye ome iwu nke nochitere anya ndi Ekiti South site na otu ndi Peoples Democratic Party.

Abiodun Olujimi bụ onye amara amara ka nwanyi nke makarisiri ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ochichi na ọbodo Naijiriya.

References[dezie | dezie ebe o si]

  1. IT & Telecom, Digest. "Senator Abiodun Olujimi Is Diligent", IT & Telecom Digest, 2 March 2017. Retrieved on 8 March 2018.
  2. Republic of Nigeria, National Assembly. Sen. BIODUN CHRISTINE OLUJIMI Ekiti South. Retrieved on 8 March 2018.
  3. Baiyewu, Leke. "I wanted to be a doctor but somehow couldn’t – Senator Olujimi", Punch. Retrieved on 9 March 2018.
  4. Defenders, Ekiti. "Read Full Biography And Life History Of Abiodun Olujimi". Retrieved on 9 March 2018.
  5. National Assembly, Federal Republic of Nigeria. Sen. BIODUN CHRISTINE OLUJIMI Ekiti South.