Abubakar Girei

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Abubakar Girei
Mmádu
Akụkụ nkeNigerian senators of the 4th National Assembly Dezie
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAbubakar Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya14 Maachị 1954 Dezie
Ebe ọmụmụAdamawa Steeti Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Hausa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Hausa, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

Abubakar Halilu Girei (onye amụrụ n'ụbọchị iri na anọ n'ọnwa Maachị afọ 1954) ka ahọpụtara dịka Sinetọ nke n'ahụ maka mpaghara ndị etiti Adamawa nke Adamawa State, Naijiria na mbido Obodo Nigeria nke anọ , na-azọ ọkwa n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị People's Democratic Party (PDP). Ọ batara n'ụlọ ọrụ n'ụbọchị iri na itoolu n'ọnwa Mee afọ 1999. [1]

Mgbe ọ were ocha na na Sinetị, a họpụtara ya na kọmitii ọrụ omebe iwu, Ụlọakụ na ego, omume n'ime (Onye isi oche) na Ụgwọ mpaghara obodo na mba ọzọ . [2]

N'ọnwa Jenụwarị afọ 2011, Girei zọrọ ọkwa ịbụ onyendọrọndọrọ otu PDP maka mpaghara omebe iwu etiti Adamawa na ntuli aka nke afọ 2011, mana ọ bịara onye nke atọ na ntuli aka a. Alhaji Bello Tukur, onye bụ onye isi gara aga ndị ọrụ nke Gọvanọ Murtala Nyako, bụ onye mmeri ya doro anya. [3]

Amụrụ onye omebe iwu Abubakar H. Girei n'ụbọchị iri anọ nke ọnwa Maachị afọ1954 na mpaghara gọọmenti obodo nke Girei dị na Adamawa Steeti, Ọ gara ụlọ akwụkwọ amara nkeọma bụ kọleji Barewa, Zaria maka agụmakwụkwọ sekọndrị ya na Mahadum Ahmadu Bello Zaria, ebe o nwetara nzere Bachelọ nke Science na Oke nyocha na nzere Masta na Nchịkwa Azụmaahịa (MBA). Ọ bụ onye dụrụ akwụkwọ nke oke nyocha, onye nrụpụta ụlọ n'ezie na onye na-ahụ maka njikwa ihe owuwu.

Onye omebe iwu Girei bụ onye otu ndị otu na-ahụ maka oke nyocha Naịjirịa, onye otu Ụlọ ọrụ Njikwa Naịjirịa na kwa onye otu ama ama bụ Ụlọ ọrụ mba maka ọmụmụ amụma na atụmatụ(NIPSS) Kuru, Jos ebe ọ jere ozi dị ka onye isi nyocha nke SEC iri atọ n'otu .

Mgbe ọ mechara ọrụ Ntorobịa nke Mba na Port Harcourt, Rivers Steeti n'afọ 1979. Ọ rụrụ ọrụ na gọọmentị Gongola steeti dịpụrụ adịpụ dị ka onye nyocha ọnụ ọgụgụ wee too n'ọkwa nke Onye Isi Ọchịchị Nnyocha ọnụ ọgụgụ n'afọ 1984. Sịnetọ Abubakar Girei gafere na Ụlọ ọrụ Ọrụ ugbo na ụlọ akụ nkwenye Naijiria n'afọ 1985 dị ka onye njikwa, Ngalaba akụ wee bụrụ onye isi njikwa, Ngalaba Ala na Ụlọ site na n'afọ 1988 ruo afọ 1996. Ọ gbara arụkwaghịm ịtọlite ụlọ ọrụ ndụmọdụ ya, Premier Association Consultants nke ọ gbara dị ka onye isi nchịkwa na onye isi ọrụ n'etiti afọ 1996 na afọ 1999.

Afọ 1999 rue 2003 gosipụtara mgbanwe na ọrụ nke Sịnetọ Abubakar Girei mgbe ọ mere asọmpi a họpụta ya n'ụzọ ziri ezi na ụlọ ọrụ dịka Omebe iwu gọọmenti etiti nke mba Naịjiria na-anọchite anya mpaghara etiti nke Adamawa na ndị omebe iwu mbụ nke mba nke anọ site n'afọ 1999 ruo afọ 2003. Dị ka Onye omebe iwu, ọ rụrụ ọrụ dị ka Onye isi oche, Kọmitii omebe iwu na-Ọrụ, osote onye isi oche, Kọmitii omebe iwu na Ihe Ndị Dị Mkpa n'ime, osote onye isi oche, Kọmitii omebe iwu na akụrụngwa ala siri ike na otu onye so na Kọmitii nke Nchebe (Air Force), Ihe Ndị uweojii, ụlọ akụ na ego, Omenala na njem nlegharị anya, njem, mmanụ ụgbọala , ọgwụ na mpụ ego na obodo na ụgwọ mba ofesi. Senator Abubakar Girei jekwara ozi na mbadamba ọtụtụ ụlọ ọrụ ọha na eze na nke onwe yana ụlọ ọrụ nzulite. Ndị a gụnyere Realex Properties dị ka onye isi ọrụ Premier Associated Consultants dị ka onye isi oche, onye otu nchịkwa Ụlọ ọgwụ nkụzi Mahadum nke Calabar, onye otu ndị isi nchịkwa nke ụlọ ọrụ nchịkwa nke Naijiria, Ụlọ ọrụ ndị nkuzi mba na Mmepụta Ọrụ ugbo nke mba na Ụlọ oru nyocha, Zaria na ebe ndi ole na ole ọzọ. Sịnetọ Abubakar Girei bụ onye nwere nukwu oké na otu ndọrọndọrọ ọchịchị People's Democratic Party, Adamawa Steeti na mpaghara ndọrọndọrọ ọchịchị ọwụwa anyanwụ nke mgbago ugwu nke Naijiria.

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. FEDERAL REPUBLIC OF NIGERIA LEGISLATIVE ELECTION OF 20 FEBRUARY AND 7 MARCH 1999. Psephos. Retrieved on 2010-06-22.
  2. Congressional Committees. Nigeria Congress. Archived from the original on 18 November 2009. Retrieved on 2010-06-22.
  3. Kolade Adeyemi, Kano (2011-01-11). Yuguda, Suntai, Kwankwaso win PDP governorship primaries. The Nation Online. Archived from the original on 13 January 2011. Retrieved on 2011-01-11.