Abubakar Kundiri

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Abubakar Kundiri
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic Dezie
ụdị ọrụ yaosote onyeisi mahadum Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Maiduguri Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Abubakar Kundiri bụ prọfesọ nkè sayensị ala. Ọ bụbu osote chancellor nkè Federal University Dutse na Federal University Wukari, [1] Taraba State, na Naịjirịa. [2]

Mmụta[dezie | dezie ebe o si]

Abubakar Kundiri gụrụ akwụkwọ praịmarị ná ATMN Primary School, Gana-Ropp mgbe nkè áhụ gasịrị ọ gàrà Gindiri Boys Secondary School màkà agụmakwụkwọ sekọndrị yá. [3] gàrà Mahadum nkè Maiduguri ná 1987 ébé ọ nwetara nzere bachelọ nkè sayensị ná ọrụ ugbo ná 1991 ọ nwetara nzere masta nkè sayensụ ná sayensị àlà ná ọkachamara ná njikwa àlà ná mmírí n'otu mahadum áhụ. Prọfesọ Kundiri nwetara nzere Doctor of Philosophy (PhD) na njikwa àlà ná mmiri ná Mahadum Cranfield ná United Kingdom. Nkè a dị n'okpuru agụmakwụkwọ sitere ná European Union.

Ọrụ ọkachamara ná nchịkwa[dezie | dezie ebe o si]

Prọfesọ Abubakar Kundiri malitere ọrụ agụmakwụkwọ yá nà Mahadum Maiduguri dị kà onye enyemaka gụsịrị akwụkwọ. Ọ nwetara ọkwá prọfesọ n'afọ 2006. Prọfesọ Kundiri ejirila ọrụ agụmakwụkwọ [4] nkè ọkachamara yá na-arụ ọrụ n'ógbè iji nyèrè áká dozie ìhè ịma áká nkè Ọrụ Ụgbọ ná Nchịkwa Gburugburu Ébé Obibi. Ọ bụkwa ónyé nyocha mpụga ná ónyé nkụzi na-eleta n'ọtụtụ ụlọ ọrụ dị élú ma sonye ná ọrụ ná mmemmé ndị e mèrè iji dozie nsogbụ gbụrụ-gbúrụ ébé obibi dịka, na-arụ ọrụ ọrụ ọnụ ná ndị òtù mbà ná mbà ụwa gụnyere European Union, World Bank, Unesco, International Atomic Energy Agency yana ụlọ ọrụ gọọmentị etítì ná steeti ná Naịjirịa. Site [5] nzụlite yá nà nchịkwa agụmakwụkwọ ọ na-eje ozi n'ọtụtụ kọmitii nkè Kansụl ná Senate na ndị ọzọ.

Nsọpụrụ ná nkwanye ùgwù[dezie | dezie ebe o si]

Ná mgbakwunye, ọ bụ ónyé ọtú mkpakọrịta nkè sayensị àlà [6] Society of Nigeria. Ọ bụkwa ónyé ịsị ụmụ akwụkwọ ná Mahadum Maiduguri ná Mahadim Federal Dutse ebe ọ nọkwa n'ọkwa osote ónyé ịsị àlà. [7] bụ site n'ọkwa a kà Kansụl nke Mahadum Federal Dutse họpụtara ya osote chancellor nkè mahadum áhụ. [1] Ọ bụ ọkwá ọ nwèrè rụọ mgbè ónyé ịsị àlà, Commander-in-Chief of the Armed Forces of the Federal Republic of Nigeria họpụtara yá dị kà osote onyeisi nkè Federal University Wukari.

Ebensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Prof Kundiri-Counting the gains of Federal University Wukari (Oct 11, 2019).
  2. Kundiri resumes as VC, Federal University, Wukari (March 30, 2016).
  3. FUWUKARI. www.fuwukari.edu.ng.
  4. Why I Started Federal University, Wukari Afresh- Kundiri – Independent Newspapers Nigeria.
  5. Membership of the Senate. www.unimaid.edu.ng. Archived from the original on 2021-05-20. Retrieved on 2020-03-28.
  6. Tekwa (1 March 2015). "Efficiency test of adapted EGEM model in predicting ephemeral gully erosion around Mubi, Northeast Nigeria". International Soil and Water Conservation Research 3 (1): 15–27. DOI:10.1016/j.iswcr.2015.04.001. 
  7. Kundiri emerges Federal University Dutse new VC (November 20, 2015).