Adamu Garba Talba

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Adamu Garba Talba
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAdamu Dezie
aha ezinụlọ yaAdamu Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Ọgọọst 1952 Dezie
Ebe ọmụmụYobe steeti Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Hausa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Hausa, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọKano University of Science and Technology Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie
Adamu Garba Talba
Senator of the Federal Republic of Nigeria from Yobe State South District
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Preceded byMamman Bello Ali
Succeeded byAlkali Abdulkadir Jajere
Personal details
Born (1952-08-15) 15 Ọgọstụ 1952 (age 71)
Yobe State, Nigeria
NationalityNigerian
Political partyPeople's Democratic Party

Adamu Garba Talba (onye amuru n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Ọgụstụ n'afọ 1952) bụ onye obodo Karekare amuru na Nangere, Yobe Steeti . A họpụtara ya dịka sịnetọ nke n'ahụ maka mpaghara ndịda Yobe nke Yobe Steeti, Naijiria, O bidoro ọrụ n'ụlọ ọrụ ya n'ụbọchị iri na itoolu n'ọnwa Mee afọ 2007. Ọ bụ onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchi People's Democratic Party (PDP). [1]

Mmụta[dezie | dezie ebe o si]

Talba nwetara diplọma na nchịkwa gọọmentị wee banye na ndị ọrụ gọọmentị Yobe Steeti. Ọ bụ onye isi oche kansụl nke ochịchi gọọmenti ọbodo Nangere nke Yobe Steeti ugboro abụọ. A họpụtara ya dịka onye isi oche nke otu ndị nchịkwa, Ụlọ ọgwụ gọọmenti etiti, Alare, onye nduzi nke NNDC, Kaduna na kọmishọna nke ahụike maka Yobe Steeti. [1]

Ọrụ na Mmeta[dezie | dezie ebe o si]

Dị ka Sịnetọ, n'ọnwa Septemba afọ 2008, Talba kwadoro ka e guzobe Ụlọ ọrụ ọzara mba iji gbochie mwakpo ọzara na mpaghara ugwu nke mba ahụ. Ọ bụ onye na-akatọ gọvanọ Yobe Steeti bụ Ibrahim Geidam, na-ebo ya ebubo imebi ego. Ọ kpọrọ oku ka enyocha nkwekọrịta ndị enyere BECCON Naijiria, Ego ruru ijeri naịra anọ maka owuwu ụzọ Kaliyari-Baimari, ijeri naira abụọ na na nde narị atọ maka ịrụ ọrụ mmiri Damaturu na otu ijeri naira na nde nari atọ maka mmezigharị ụlọ akwụkwọ sekọndrị na-akpọghị aha. [2]

Ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Disemba afọ 2009, Talba kwuru na usoro ochichi onye kwuo uche ya na-arụ ọrụ nke ọma, ma katọọ mmegharị n’oge na-adịghị anya nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị mmegide iguzobe “mega party” na-mmegide otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị PDP. O kwuru na ha kwesiri isonye na isi nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị PDP ma ọ bụ ANPP ( All Nigeria Peoples Party ). [3] N'ọnwa Maachị afọ 2010, ọ gọnarịrị akụkọ mgbasa ozi na onye sịnetọ etiti Yobe steeti gara aga bu Sịnetọ Usman Albishir, onye mechara si na otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ANPP banye PDP ga-enweta tiketi na pati ahụ maka ntuli aka ọkwa gọvanọ n'afo 2011. O kwukwara na site na mbugharị Albishir, ANPP ga-abụ akụkọ ihe mere emena Yobe. [4]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. 1.0 1.1 Sen. Adamu Garba Talba. National Assembly of Nigeria. Archived from the original on 2016-03-03. Retrieved on 2010-06-07.
  2. How Governor Geidam, SSG, squandered 80 billion in ten months. Point Blank News (2010-02-16). Archived from the original on 2010-02-19. Retrieved on 2010-06-07.
  3. MOHAMMED ABUBAKAR (Dec 1, 2009). Mega Party Going Nowhere – Talba. Daily Independent. Archived from the original on 2011-07-13. Retrieved on 2010-06-07.
  4. Turaki A. Hassan (30 March 2010). I Didn't Say Albishir Will Get Automatic Ticket in PDP - Sen. Talba. Daily Trust. Retrieved on 2010-06-07.