Adenrele Sonariwo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Adenrele Sonariwo
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20. century Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụexhibition curator Dezie
ebe agụmakwụkwọHoward University, Academy of Art University Dezie

{{Added databox Adenrele Sonariwo bụ nwafọ Naịjirịa bụ onye ọchụnta ego na onye na-arụ ọrụ nka. Ọ bụ onye guzobere Rele Art Gallery na Military Street, dị n'Onikan,na Lagos Island, dị na Legos, na Naijiria . Ọ bụ onye na-elekọta ụlọ ndozi mbụ nke Naijiria na 57th Venice Biennale n'afọ 2017.

Mmụta[dezie | dezie ebe o si]

Sonariwo nwetara nzere bachelọ ya n'ihe ndekọ ego na Mahadum nke Howard, were gawa ị rụ ọrụ na PricewaterhouseCoopers dị ka onye na-edekọ ego ide ruru afọ anọ. [1] [2] O nwere nzere masta ma Multimedia Communications si na mahadum Academy of Art, nakwazị Satifiketi na Curating Contemporary Art Exhibitions na Mahadum nke Arts London .

Ebe nlegharị anya ihe osise nke Rele[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ laghachiri Naịjirịa, ọ tọrọ ntọala Rele Art Gallery n'afọ 2010, agbanyeghị na ọ bidoghị dị ka ụlọ nlegharị anya ruo n'ọnwa Febụwarị, n'afọ 2015. [2] N'afọ 2011, oge echiche nke ebe ahụ malitere ịgba mkpọrọgwụ, ọ nwara ị malite mahadum nka na Naijiria nke ọ kpọrọ The Modern Day School of the Arts. [3] [1] Ọ bụ "ụlọ akwụkwọ na-ese ihe maka ndị hụrụ nka n'anya nwere ike ịrapara na ọrụ ndị ọzọ." [4]

57th Venice Biennale[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2017, Sonariwo ghọrọ onye na-elekọta ụlọ ndozi nke mbụ nke Naijiria na 57th Venice Biennale . [5] [6] Emmanuel Iduma bụ onye edemede na onye nnyocha nka so ya. Ịsiokwu mbipụta a bụ Viva Arte Viva [7] [4],paviliọn ndị Naịjirịa gosipụtara ọrụ Victor Ehikhamenor, Peju Alatise, na Qudus Onikeku . [8] [9] [10]

Onyinye na nkwanye ugwu ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Sonariwo meriri na Future Awards for Arts and Culture n'afọ 2016. [11] Ọ nọkwa na Power List of influencers in culture n'afọ 2016 [12] n'afọ 2017. [13] N’ọnwa Maachị nke afọ 2017, e depụtara ya dịka otu n’ime 100 Most Inspiring Women in Nigeria. [14] O kwuola okw na ihe omume TEDx, [15] ma bụrụkwa onye otu ndị juri na Dak'art Biennale nke mere n'afọ 2018. [16] O nwetakwara mkpuchi nke akwụkwọ akụkọ Guardian Life na Naijiria. [17]

N’afọ 2018, Vogue depụtara ya dịka otu n’ime “Five Coolest Women in Lagos” [18]

Ndụ onwe ya[dezie | dezie ebe o si]

Sonariwo bu nwa nke Akarigbo nke Remo nke iri na asatọ, Oba Michael Sonariwo, onye nwụrụ n'afọ 2016 mgbe ọ dị afọ iri asatọ. [19]

Ajụjụ ọnụ ndị ama ama[dezie | dezie ebe o si]

  • Ajụjụ ọnụ nke Adenrele Sonariwo nwere na The Spark (Maachị, afọ 2018) [20]
  • Adenrele Sonariwo: Giving The Arts A Voice na The Guardian (Jenụwarị, afọ 2018) [21]
  • The Venice Questionnaire

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 "I Am Creative With Adenrele Sonariwo". (in en-US)
  2. 2.0 2.1 From Accountant to Art Curator! Rele Art Gallery's Adenrele Sonariwo is our #BellaNaijaWCW this Week - BellaNaija (en-US).
  3. "Why Adenrele Sonariwo Quit Her Auditing Job To Launch An Art Gallery". (in en-US)
  4. 4.0 4.1 "Adenrele Sonariwo; The Art Lover and Brain behind The Rele Gallery". (in en-US)
  5. name, Site. The Venice Questionnaire #22 – Adenrele Sonariwo / ArtReview (en).
  6. "56 editions after, Nigeria debuts at Venice Biennale - Premium Times Nigeria". (in en-GB)
  7. "57th International Art Exhibition - Viva Arte Viva". (in en)
  8. See the Highlights from Nigeria's Debut at the Most Important Art Exhibition in the World - La Biennale di Venezia - BellaNaija (en-US).
  9. "Nigeria unveils first national pavilion at Venice art exhibition". (in en-US)
  10. Orubo, Daniel. "Meet The Nigerian Artists Set To Make History At The Venice Biennale". (in en-US)
  11. "See the inspiring profiles of the winners of The Future Awards Africa 2016 - The Future Awards Africa". (in en-GB)
  12. "LAOLU SEBANJO, DAMILOLA ELEBE, ADENRELE SONARIWO… SEE THE #YNAIJAPOWERLIST FOR CULTURE".
  13. Bovi, Wana Udobang, Osa Seven… See the #YNaijaPowerList2017 for Culture » YNaija (en-GB).
  14. "AMINA MOHAMMED, MO ABUDU, SOMKELE IDHALAMA & MORE! YNAIJA.COM AND LEADING LADIES AFRICA PRESENT THE 100 MOST INSPIRING WOMEN IN NIGERIA".
  15. "Tedx: Ibara Set To Hold The First Tedx In Abeokuta City - The Bees NG". (in en-US)
  16. Dak'art 2018 – Biennale de Dakar Edition 2018 (fr-FR).
  17. "Nigeria: Adenrele Sonariwo Covers Guardian Life Magazine". (in en-US)
  18. "Meet the 5 Coolest Women in Lagos". (in en)
  19. "Ogun monarch, Oba Sonariwo, dies at 80 in UK", Punch Newspapers. (in en-US)
  20. "An Interview with Adenrele Sonariwo - The Spark", The Spark, 2018-03-09. (in en-US)
  21. "Adenrele Sonariwo: Giving The Arts A Voice". (in en-US)