Ado Ahmad Gidan Dabino
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha ezinụlọ ya | Ahmad |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1964, 1 Jenụwarị 1964 |
Ebe ọmụmụ | Steeti Kano |
Asụsụ obodo | Asụsụ Hausa |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Asụsụ Hausa |
Asụsụ ọ na-ede | Asụsụ Hausa |
ọrụ ọ na-arụ | odee akwụkwọ, onye nhazi ndu ihe nkiri, onye na-emeputa ihe nkiiri |
ebe agụmakwụkwọ | Bayero University Kano |
okpukpere chi/echiche ụwa | Ndi áláküba |
Ihe nrite | award for best leading actor, Merit Awards, honorary award |
kọwara na URL | https://gistrends.com.ng/ado-ahmad-gidan-dabino/ |
nnọchiaha nkeonwe | L485 |
Ado Ahmad Gidan Dabino, MON bụ onye edemede asụsụ Hausa nke mba Naijiria, onye edemede, onye na-ebipụta akwụkwọ, onye nta akụkọ, onye na'emepụta ihe nkiri, onye nduzi na onye na-eme ihe nkiri.[1][2] O deela ihe dị ka afọ iri atọ (30) n'isiokwu dị iche iche. O bipụtara akwụkwọ akụkọ iri na ise (15)). Onye isi ala Goodluck Ebele Jonathan nyere ya onye otu Order of the Niger (MON) na uboc 29 n'ọnwa Septemba n'afọ 2014.[3][4]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Gidan Dabino n'afọ 1964 na Danbagina nke Dawakin Kudu mpaghara okpuru ọchịchị nke Steeti Kano. Ọ malitere agụmakwụkwọ ya n'ụzọ nkịtị site n'aka nna ya. Ọ gara Zangon Barebari ebe ọ mụrụ kor'an. O nwetara nzere diplọma ọkachamara na Mass Communication na Mahadum Bayero Kano.[5]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Gidan Dabino onye isi oche nke Gidan Dabine International Nigeria Ltd, ụlọ ọrụ mgbasa ozi na ahịa nke dị na Kano kemgbe afọ 1990. Ọ bụ osote onye nchịkọta akụkọ / onye njikwa nkesa nke Zamani a Hausa Magazine n'afọ 1997. Ọ bụkwa onye nchịkọta akụkọ na onye na-ebipụta magazin Mumtaz n'afọ 2000. N'afọ 2004 ọ bụ onye isi nchịkọta akụkọ nke Hantsi Magazine n'okpuru Kano Chief Bureau Community. Akwụkwọ akụkọ nke ebumnuche ya bụ ịkwalite ịgụ na ide ihe n'asụsụ ụmụ amaala. Site n'afọ 2012 ruo taa ọ bụ onye nchịkọta akụkọ nke Muryar Arewa, magazin kwa ọnwa nke Northern Communication and Media Service LTD.[6][7]
Akwụkwọ akụkọ ndị a họọrọ e bipụtara
[dezie | dezie ebe o si]- Na Da So Da Kauna 1&2, nke Gidan Dabino Publishers Enterprises bipụtara, Kano. 1991.[8]
- Hattara Dai Masoya 1 & 2, nke Gidan Dabino Publishers bipụtara
- Masoyan Zamani 1& 2, nke Gidan Dabino Publishers Enterprises bipụtara, Kano. 1993 ISBN na 9 78-214902-0
- The Soul of My Heart (Translation of in Da so Da Kauna), nke Gidan Dabino Publishers Enterprises bipụtara, Kano. 1993
- Wani Hani Ga Allah 1 & 2, nke Gidan Dabino Publishers Enterprises bipụtara, Kano. 1994 ISBN na 9 78-214907-1
- Nemesis (Nsụgharị nke Masoyan Zamani), nke Gidan Dabino Publishers Enterprises bipụtara, Kano. 1995
- Kaico!, nke Gidan Dabino Publishers Enterprises bipụtara, Kano. 1996
- Duniya Sai Sannu, nke Gidan Dabino Publishers Enterprises bipụtara, Kano.
- Malam Zalimu, (A Hausa play and winner 1st prize prestigious award of 2009 Engineer Mohammed Bashir Karaye Prize in Hausa Literature), bipụtara site na Gidan Dabino Publishers Enterprises, Kano. 2009
- Dakika Talatin E bipụtara ya site na Gidan Dabino Publishers Enterprises, Kano. 2015
Ọrụ ime ihe nkiri
[dezie | dezie ebe o si]Gidan Dabino bụ otu n'ime ndị ọsụ ụzọ a na-eto maka nguzobe ụlọ ọrụ ihe nkiri Hausa na mpaghara ùgwù Naijiria nke a maara dị ka Kannywood. O dere edemede maka ọtụtụ ihe nkiri Hausa, mepụtara ma duzie ụfọdụ. Ọ pụtakwara dị ka onye isi ndị ejije na In da So da Kauna (1995), ihe nkiri sitere na akwụkwọ akụkọ nke ya nke otu aha ahụ. Ihe nkiri ya na nso nso a, Juyin Sarauta bụ ihe nkiri Hausa kachasị enye onyinye maka afọ 2017 nakwa afọ 2018. Ọ pụtara dị ka Sarki Yusufa nke Jadarwa. O nwere meriri ihe nrite abụọ nke onye na-eme ihe nkiri kachasị mma na otu nhọpụta.[9]
Ihe nkiri
[dezie | dezie ebe o si]Afọ | Ihe nkiri | Ọrụ | |||
---|---|---|---|---|---|
Onye na-eme ihe nkiri | Onye na-emepụta ya | Onye edemede | Onye nduzi | ||
1994 | Na Da So Da Kauna 1, 2 na 3 | Àtụ:Yes | Àtụ:Yes | Àtụ:Yes | |
1998 | Kowa Da Ranarsa 1 na 2 | Àtụ:Yes | Àtụ:Yes | ||
1999 | Cinnaka | Àtụ:Yes | |||
Otu Ci Moriyar Ganga | Àtụ:Yes | ||||
Sandar Kiwo | Àtụ:Yes | Àtụ:Yes | |||
Mugun Nufi | Àtụ:Yes | ||||
Karshen Makirci | Àtụ:Yes | ||||
2000 | Muktar 1 & 2 Onye na-emepụta | Àtụ:Yes | |||
Kadaran Kadahan | Àtụ:Yes | ||||
Kyan Alkawari | Àtụ:Yes | ||||
Kana Taka | Àtụ:Yes | ||||
2001 | Ki Yafe Ni 1& 2 | Àtụ:Yes | |||
Sarka | Àtụ:Yes | ||||
2002 | Juhaina | Àtụ:Yes | |||
Eshia | Àtụ:Yes | ||||
2005 | Tsautsayi | Àtụ:Yes | |||
2006 | Wahami | Àtụ:Yes | |||
2016 | Juyin Sarauta | Àtụ:Yes | Àtụ:Yes |
Ihe Nrite
[dezie | dezie ebe o si]Ihe ndị na-esonụ so n'ihe nrite ndị Gidan Dabino nwetara:
- Onye na-eme ihe nkiri kacha mma na ọrụ: Amma Award Season 5, 2018[10]
- Onye a họpụtara, Onye na-eme ihe nkiri kacha mma n'Africa: Zuma Film Festival, 2017[11]
- Onye otu Order of the Niger (MON) iji kwado omume ọma ya dị ịrịba ama na ekele maka ọrụ ya maka onyinye ọ nyere mba ahụ, Naịjirịa 2014.[3][12]
- Onyinye nke Nsọpụrụ n'ịghọta mgbalị na onyinye dị ịrịba ama maka ịkwalite akwụkwọ edemede Hausa. 2013
- Injinia Mohammed Bashir Karaye Prize na Hausa Literature (Play Category) 2009[13]
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- Ndepụta nke ndị na-emepụta ihe nkiri na Naijiria
Ebensidee
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Gidan Dabino, Ado Ahmad [WorldCat Identities]. Worlcat (10 January 2018).
- ↑ Kano (2019-08-31). How Hausa Day was born – Gidan Dabino (en). Daily Trust. Retrieved on 2020-09-20.
- ↑ 3.0 3.1 "LIST OF 2013/2014 NATIONAL HONOURS AWARD RECIPIENTS – spotlight reports", spotlight reports, 29 September 2014. Retrieved on 1 October 2018.
- ↑ "FG releases list of National Award recipients 2013/2014 – Vanguard News", Vanguard News, 18 September 2014. Retrieved on 1 October 2018.
- ↑ How Hausa Day was born – Gidan Dabino (en-GB). Daily Trust (2019-08-31). Retrieved on 2023-07-15.
- ↑ II (2014-10-21). National Award: Friends set to celebrate their own - Blueprint Newspapers Limited: Breaking news happening now in Nigeria and todays latest newspaper headlines (en-US). Retrieved on 2023-07-15.
- ↑ Publisher: Gidan Dabino Publishers | Open Library. openlibrary.org. Retrieved on 2023-07-15.
- ↑ Tsohuwar Taska: Littafin 'In Da So Da Kauna' — Leadership Hausa Newspapers. leadershipayau.com. Archived from the original on 28 November 2018. Retrieved on 1 October 2018.
- ↑ Fim Din Juyin Sarauta Ya Zama Zakaran Gwaji Dafi *Mu Na Fata Ya Karbu A Kasuwa Kamar Yadda Ya Karbu A Gasa –Ramat – Leadership Hausa Newspapers (ha). leadershipayau.com. Archived from the original on 25 October 2018. Retrieved on 25 October 2018.
- ↑ "Ba Isa A Isa ne gwarzon jaruman Kannywood ba", BBC News Hausa, 18 May 2018. Retrieved on 24 October 2018.
- ↑ Awards. zumafilmfest.com. Archived from the original on 20 July 2018. Retrieved on 25 October 2018.
- ↑ LIST OF 2013/2014 NATIONAL HONOURS AWARD RECIPIENTS – NigerianMuse | NigerianMuse. nigerianmuse.com. Archived from the original on 17 November 2018. Retrieved on 24 October 2018.
- ↑ Blogger: User Profile: Ado Ahmad Gidan Dabino. blogger.com. Retrieved on 25 October 2018.