Akin Fakeye

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Akin Fakeye
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAkin Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1936 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Osun Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-akpụ ihe ọkpụkpụ Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Akin (Akinlabi) Fakeye (amụrụ n'afọ 1936) bụ onye na-ese ihe na Naijiria nke na-arụ ọrụ na ngalaba ịkpụ osisi.

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Fakeye na Ila Orangun, Osun steeti. A maara nna ya bu Adewuyi Oguntunde Fakeye, dị ka onye na-akpụ ihe. Dị ka ọdịnala si dị, nna ya kụziiri Akin Fakeye nka ịkpụ ihe. Mgbe nna ya nwụrụ, Akin banyere mmụta n'okpuru nwanne ya nwoke bu Lamidi Fakeye site na 1958-1967. O guzobere onwe ya na studio nke ya na 1968. Kemgbe oge ahụ, ya na nwanne ya nwoke arụkọla ọrụ ọnụ ma zụọkwa ụmụ akwụkwọ iri abụọ, gụnyere Ayo Bankole na ụmụ ya, Jimoh Fakeye, Sulaiman Fakeye, Akeem Fakeye na Lukman Fakeye . Ụmụ ya nwoke anọ bụzi ndị ọkachamara na-akpụ ihe n'onwe ha ma guzobe ụlọ ọrụ nke ha.

Akin Fakeye bụ otu n'ime ndị guzobere mgbako ndi na api osisi n' Oyo State Woodcarver Association, nke bụ otu e guzobere iji mee ka ndị na-ege ntị nwee ekele maka ịkpụ osisi dị mma ma nyekwa aka melite ọgbọ ọhụrụ nke ndị na-akpụ ihe.

Enwere ike ịchọta ọrụ Akin Fakeye na ụfọdụ nchịkọta onwe onye n'ụwa niile. O nwere ihe ngosi ndị na-esonụ maka otuto ya:

  1. Mansah Gallery, Banjul, Gambia;
  2. Osun Osogbo Annual Festival;
  3. Africraft Art Agelery;
  4. Megamurth Impression Art Gallery;
  5. Aafak Art Gallery;
  6. Royal Nether Land Embassy - Abuja;
  7. Sheraton hotel & towers - Abuja;
  8. Ibadan art gallery;
  9. Ụlọ akwụkwọ omenala German;
  10. Ngalaba ọmụmụ Afrịka Mahadum nke Ibadan

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

A pụrụ ịchọta ihe osise nke Akin Fakeye na ozi ndị ọzọ gbasara ya na ndị ezinụlọ ya ndị ọzọ na ntụaka ndị a: