Jump to content

Akoko

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mahadum Adekunle Ajasin, Akungba Akoko

Akoko bụ nnukwu ọdịbendị Yoruba dị n'akụkụ ugwu ọwụwa anyanwụ nke ala Yoruba . [1] Mpaghara ahụ sitere na Ondo Steeti ruo Edo Steeti dị na ndịda ọdịda anyanwụ Naịjirịa. Akokos dị ka obere ìgwè mejupụtara pacenti iri abụo mara atọ nke ndị bi na Ondo Steeti, na pacenti ise mara asaa nke ndị bi n'Edo Steeti, N'ime Kansụl Gọọmentị Obodo iri na asatọ dị ugbu a, ọ mejupụtara anọ; Akoko ugwu ọwụwa anyanwụ, Akoko ugwu ndịda, Akoko ndịda ọwụwa anyanwụ na Akoko ndịda ọdịda ọwụwa anyanwụ, yana okpuru ọchịchị ime obodo Akoko Edo nke Edo Steeti. Mahadum Adekunle Ajasin, mahadum nke steeti a nwere ikike maka ihe dị ka ụmụ akwụkwọ agụmakwụkwọ dị elu puku iri abụo na ihe karịrị ngalaba iri ise na ngalaba asaa dị na Akungba-Akoko. [2][3] Ụlọ ọgwụ ọkachamara nke steeti a dị na Ikare Akoko, ebe ụlọ ọgwụ obodo dị na Oka-Akoko na Ipe-Akoko.

Arigidi, bụ asụsụ olundi, a na-asụ ya na okpúru ọchịchị ime obodo gasị nke Akoko ugwu ọwụwa anyanwụ, Akoko ugwu, Ekiti ọwụwa anyanwụ na Ijumu.   Akoko nwere ihe dị ka obere obodo na obodo nta dị iri anọ na ise, nke kachasị n'ebe nkume dị n'ebe ugwu Ondo steeti.[4] N'agbanyeghị nke ahụ, ala nkume ahụ nwere ike inyere mpaghara ahụ aka ịghọ ụdị ite na-agbaze na ọdịbendị dị iche iche na-abịa site n'ebe ugwu, ọwụwa anyanwụ na ndịda obodo Yoruba ma karịa. Akoko ghọrọ otu n'ime agbụrụ Yoruba ole na ole na-enweghị asụsụ obodo pụrụ iche.Obodo ndị isi Akoko gụnyere; Ọkà, Ikare, Oba, Ikun, Arigidi, Ugbe, Ogbagi, Okeagbe, Ikaram, Ibaram, Iyani, Akungba, Erusu, Ajowa, Akunu, Ged Mosu, Isua, Auga, Ikakumo, Supare, Epinmi, Ipe, Ifira, Ise, Iboropa, Irun, Iye, Afin, Igashi, Sosan, Ipesi, Etioro, Ayegunle, Eriti na Oyin. Na mgbakwunye dị otu a, e nwere ọtụtụ obodo ndị ọzọ na-achị onwe ha nke ogbè dịgasị iche iche.[5]

Ndị Akoko bi n'ókèala nke ala Yoruba ma ndị Owé Okun Yorubas na ndị Ebira na-ejikọta ha n'ebe ugwu, ndị Ekitis na-ejikwa ha n'akụkụ ọdịda anyanwụ, ndị Owos na Owan maọbu Ora na-ejikarị ha n'ụzọ ndịdana ndị Afemai na-ejide ha n'Ebe ọwụwa anyanwụ.

  • Ikare Akoko bụ obodo kachasị ukwuu n'ógbè Akoko nke nwere ihe dị ka mmadụ puku narị na iri ise, bi n'afọ 2008. [6] O nwere ụlọ ọrụ I.C.T ebe ndị ya nwere ohere ijikọ na ikwurịta okwu na ndị ọzọ gafee mba ahụ na gburugburu ụwa.
  • Oka Akoko bụ obodo nke abụọ kachasị ukwuu na Akokoland, nwere ndị bi na ya dị puku narị iri atọ na abụọ, narị asatọ . O nwere obodo ise dị iche iche nke Ayegunle-Oka, Oke-Oka. Ọ bụ ihe a ma ama maka Oke-Maria katoliki Grotto, ebe ndị njem nleta na-ewu ewu.
  • Oba Akoko bụ obodo ọzọ dị na Akoko okpuru ọchịchị ime obodo nke ndịda ọdịda ọwụwa anyanwụ. Oba bụ ọnụ ụzọ mbata nke Ala Akoko n'ihi na ọ bụ ebe obibi mbụ zutere n'ebe ugwu site na obodo Owo banye n'ime obodo Akoko.

Omenala na Ụzọ Ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ ọdịnala kachasị na obodo ahụ gụnyere ọrụ ugbo buru ibu, azụmaahịa na nkuzi. Akoko na Ekiti Yoruba nwere echiche bara uru nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke a maara dị ka Omoluka nke yiri echiche Yoruba nke Omoluabi nke na-akọwapụta ụkpụrụ na omume ọma nke ezigbo nwoke ma ọ bụ nwanyị Akoko njirimara nke iguzosi ike n'ezi ihe ma ọ bụ izi ezi. Echiche a arụwo ọrụ dị mkpa na njikọta ụmụ amaala, mmekọrịta na nchịkwa n'etiti ndị mmadụ.[7]

Ọnọdụ ihu igwe

[dezie | dezie ebe o si]

Ọnọdụ ihu igwe na Akoko, nke dị mita iri iteghete na asaa mara ụma iri isii na ise, ụkwụ narị atọ na iri abụọ mara irí atọ na asaa n'elu oke osimiri, a na-ahazi ya dị ka mmiri na-ekpo ọkụ ma ọ bụ savanna Aw Nkezi okpomọkụ kwa afọ nke mpaghara ahụ bụ pacenti ụma iri isii na iteghete, dị ala karịa nkezi Naịjirịa na iri abụọ na asatọ mara irí asaa na iteghete oC, oF iri asatọ nà atọ mara irí asaa nà iteghete. Milimita narị abụọ na iri atọ na atọ màrà iri atọ na asaa, sentimita iteghete mara irí nà iteghete nke mmiri ozuzo dị narị abụọ na iri isii na asaa ụbọchị mmiri ozuzo, iri asaa na atọ mara irí atọ na iteghete nke oge bụ ngụkọta mmiri ozuzo kwa afọ nke Akoko.[8][9]

Obodo na obodo nta

[dezie | dezie ebe o si]

Ọtụtụ obodo na ebe obibi dị n'etiti na-eme ka ala Akoko dị mma. Nke a bụ ndepụta na-adịghị agwụ agwụ.[10][11]  

Ndị ama ama

[dezie | dezie ebe o si]

Ndị ama ama n'ezinụlọ Akoko gụnyere:

  • Segun Abraham bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye ọchụnta ego Naijiria.
  • Adebayo Adefarati, 1931-2007, onye bụbu gọvanọ nke Ondo State[12][13]
  • Adejoro Adeogun, b. 1967 Onye otu House of Representatives nke NigeriaỤlọ ndị nnọchi anya Naịjirịa
  • Olu Ajayi, onye Naijiria ọkachamara na-ese ihe, onye na-ese foto, na onye na-enyocha nka, nwere ihe karịrị afọ 40 na-eme ihe nkiri na Art Administration
  • Kayode Ajulo, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye ọka iwu na onye na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ [14]
  • Taiwo Akerele, onye na-ahụ maka akụ na ụba na Naijiria, onye edemede, na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị
  • Jones Oladehinde Arogbofa, b. 1952 onye bụbu Chief of Staff nke President Goodluck Jonathan, onye lara ezumike nká na Nigerian Army Brigadier General.
  • Bamidele Aturu, 1964-2014, onye ọka iwu a ma ama na onye na-ahụ maka ikike mmadụ [15]
  • Prọfesọ Robert Ajayi Boroffice, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria, onye ọkà mmụta sayensị, na onye ọkà mmụta agụmakwụkwọ, onye jere ozi n'okpuru onye bụbu Gen. Olusegun Obasanjo. E mere ya onye isi nke Order of the Niger (OON) n'afọ 2011.
  • Bisayo Busari-Akinnadeju onye ọka iwu, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye ọrụ ebere 
  • Roy Chicago, d 1989, onye egwu dị elu [16]
  • Sunday Ehindero, Inspector General nke ndị uwe ojii na Ondo State 2005-2007 [17]
  • Omobayo Godwins, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria na osote gọvanọ nke Edo Steeti na 2024
  • TB Joshua, 1963-2021, nke Ụlọ Nzukọ, Chọọchị nke Mba Nile [18]
  • Adetokunbo Kayode, onye bụbu Minista Ikpe Ziri Ezi na Attorney General nke Federation, Onye isi oche Gemstones Miners and Marketers Association of Nigeria [19]
  • Olugbenga Omole, Onye otu Ondo State House of Assembly [20]
  • Joseph Oladele Sanusi, onye bụbu gọvanọ, Central Bank of Nigeria [21]
  • Moses Orimolade Tunolase, Onye guzobere ụka mbụ nke Afrịka, Order Eternal Sacred nke Cherubim na Seraphim [22]

Ihe ngosi

[dezie | dezie ebe o si]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Pax Britannica, Security and Akoko Resettlement, 1897–1960 (3 October 2021). Archived from the original on 15 July 2024. Retrieved on 21 July 2024.
  2. About Adekunle Ajasin University (3 October 2021).
  3. Adekunle Ajasin University visitor web portal (3 October 2021). Archived from the original on 28 October 2022. Retrieved on 21 July 2024.
  4. Pre-colonial Elitism: A Study in Traditional Model of Governance in Akokoland (3 October 2021). Archived from the original on 2023-02-06. Retrieved on 2024-07-21.
  5. Religious interaction among the Akoko of Nigeria (3 October 2021).
  6. About Ikare, Nigeria (3 October 2021).
  7. Elitism in Precolonial Akoko society, Its disorientation from sociocultural value in contemporary Akoko (3 October 2021).
  8. Akoko, Imo, NG Climate Zone, Monthly Averages, Historical Weather Data. tcktcktck.org. Retrieved on 2023-07-16.
  9. Oka-Akoko, Nigeria 7 Day Weather Forecast (en-CA). The Weather Network. Retrieved on 2023-07-16.
  10. Akoko North East/North West Towns And Villages (3 October 2021).
  11. Akoko South East/South West Towns And Villages (3 October 2021).
  12. Why Ondo Should Honour the Memory of Adefarati (en-US). THISDAYLIVE (2019-12-13). Retrieved on 2022-04-07.
  13. AD Presidential Candidate, Adefarati is Dead. Sahara Reporters (2012-09-27). Retrieved on 2022-04-07.
  14. Kayode Ajulo's giant strides (en-US). Vanguard News (2018-06-02). Retrieved on 2022-04-07.
  15. For Bamidele Aturu, 1964-2014 (en-US). Vanguard News (2014-08-05). Retrieved on 2022-04-07.
  16. Roy Chicago: A frontline highlife kingpin in the 60s (en-US). Businessday NG (2018-01-18). Retrieved on 2022-04-07.
  17. Trial of former Police I-G Ehindero for alleged N64bn fraud to resume -- ICPC | Premium Times Nigeria (en-GB) (2018-04-13). Retrieved on 2022-04-07.
  18. "Life and times of Prophet Temitope Balogun Joshua wey die at di age of 57", BBC News Pidgin. Retrieved on 2022-04-07.
  19. Adetokunbo Kayode, SAN (en-GB). Tribune Online (2022-01-26). Retrieved on 2022-04-07.
  20. ShineYourEye. shineyoureye.org. Retrieved on 2022-04-07.
  21. Former CBN governor warns against sharing excess crude revenue – Premium Times Nigeria (en-GB) (2012-12-18). Retrieved on 2022-04-07.
  22. Even in death, Orimolade turns hometown to tourists' delight (en-GB). Tribune Online (2017-08-01). Retrieved on 2022-04-07.