Amaka Igwe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Amaka Igwe
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoAmaka Igwe Dezie
Aha ọmụmụAmaka Igwe Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya2 Jenụwarị 1963 Dezie
Ebe ọmụmụUgwu Ọcha Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya28 Eprel 2014 Dezie
Ebe ọ nwụrụEnúgwu Dezie
ihe kpatara ọnwụasthma Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-emeputa ihe nkiiri, onye nhazi ndu ihe nkiri, Odee akwụkwọ Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Obafemi Awolowo, Mahadum nke Ibadan Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Amaka Igwe (2 January 1963-28 April 2014) bụ onye e turu Ugo n'ihe gbasara ị mepụta ihe onyonyo na Nigeria bụrụkwa onye isi ndị mgbasa ozi. Igwe bụ onye nwebụ Top Radio 90.9 nke dị na Lagos nakwa Amaka Igwe Studios, ma bụrụkwa onye a ma ka otu na ndị ọgbọ pụrụ n'ime ihe onyonyo ndị nyere aka bido ihe onyonyo nke ọgbaraọhụrụ n'oge nke Nigerian cinema. Ọ n'ọnọdụ kwesịrị n'isi ihe gbasara ụlọ ọrụ a ruo mgbe ọ nwụrụ n'afọ 2014.

Mbido ndụ ya na ị gụ akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Uzoamaka Audrey 'Amaka' Igwe n'aka Isaac na Patience Ene n'ọnwa January 2, 1963 na PortHarcourt. Igwe bụ nwa nke ise n'ime ụmụ asaa, bụrụkwa nwanyị nke anọ n'ime isii. Ejirimara ya bụ 'GCO' (General Commanding Officer) n'aka nna ya nakwa 'Storm' n'aka nne ya maka na aka dị ya n'ihe mgbe ọ bụla. Mgbe ọ bụ nwata ọ nọ n'ọnọdụ Minista nke Ụmụaka, Egwuregwu na Omenala.

Ọ Gụrụ n'ụlọ akwụkwọ All Saints nakwa Awkunanaw Girls High School n'Enugu. Ọ jụrụ ọjọọ, tụọ basketball, bụrụkwa onye isi nke ụmụ nwanyị na asọrọmampi football. Mgbe ọ nọ A-levels na Idia College, Benin, Igwe bidoro ị leba anya n'ihe gbasara mmetụta. Ọ kuziri ndị mmadụ egwu Atịlọgwụ, ma zọọkwa oke na obodo. Ọ bidoro dewe ihe egwuregwu n'egwu. Amaka Igwe chọbụrụ ịhụ ihe gbasara iwu, mana ndị ọrụ nke Joint Admissions and Matriculation Board (JAMB) nyere ya "Education and Religious Studies (ihe gbasara Chukwu)". Ya mere o ji gụọ Education/Religion na mahadum nke Ife (nke bụzị Obafemi Awolowo University).

Site OAU, Igwe tinyere aka na ihe onyonyo nke obere nke ndị MNET nke a kpọrọ "Barbers Wisdom" ka onye nhazi tupu ọ gawa mahadum nke Ibadan, ebe ọ nwetere asambodo Masters na Library and Information Services. Mgbe NYSC ọ rụrụ ọrụ onye enyemaka njem n'aka ndị Scripture Union, tupu ọ nweta M.Sc. na Information Science. O mèchàrà rụọ na mahadum nke Anambra State University of Technology ka onye isi na Eida Information Systems, tupu ọ banye n'ụlọ ọrụ nke mmetụta. Ọ lụrụ dị ya Charles Igwe n'ọnwa April, n'afọ 1991, ọ mụtara ụmụ atọ.

Nkà[dezie | dezie ebe o si]

Igwe bụ ezigbo onye ode akwụkwọ, onye mmepụta, onye nhazi, onye ọgba mbọ na onye nkụzi. O sokwa na ndị mbụ bidoro ihe egwuregwu na ihe onyonyo ọgbaraọhụrụ, ọ kacha wee pụta ihe mgbe o dere ma hazikwaa 'Checkmate' bu nke a tụrụ ugo nke ukwu ya na 'Fuji House of Commotion'. N'ime ọrụ ya na Nollywood bu Rattlesnake na Violated, nke kewapụtara Amaka Igwe Studios n'aka ndị na eme ihe onyonyo ndị ọzọ. O bidokwara BOBTV EXp., bụrụkwa onye wepụtara Top Radio 90.9FM nke di na Lagos Mainland, Amaka Igwe Studios nke bụ ebe a na emeputa ihe onyonyo kachasi mma nakwa Q Entertainment Networks, na DSTV channel.

Ugo o satara[dezie | dezie ebe o si]

Igwe satara imerime ugo dị iche iche. N'afọ 2011, Nigeria hụrụ mbọ ọ na-agba n'ị kwalite ọnọdụ ndị ọrụ ndị mmepụta wee nye ya Nigerian National Order "MFR", nke bụ "Member of The Federal Republic of Nigeria."

Ọnwu ya[dezie | dezie ebe o si]

Ọ nwụrụ n'Enugu n'ọnwa April 28 n'afọ 2014 n'elekere 8:30pm, mgbe mbọ a gbara i ji zọọ ya n'ọrị a asthma. Rochas Okorocha bu governor nke Imo state biara akwamozu ya, ma ndị ọzọ welitere isi n'ụlọ ọru Nollywood.

Ihe onyonyo ya[dezie | dezie ebe o si]

  • Rattle Snake 1,2 & 3
  • Violated 1&2
  • To Live Again
  • Full Circle
  • A Barber's Wisdom

Ihe egwuregwu ya[dezie | dezie ebe o si]

  • Fuji House of Commotion
  • Solitaire
  • Now We Are Married
  • Infinity Hospital
  • Bless This House
  • Checkmate

Ebe nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1.  BOBTV ends fest akunyili assures fund
  2.  Renowned Nollywood movie producer dead
  3. "Nigeria: National Honours Awards 2010 and 2011 - Economic Confidential". 2011-11-10. Retrieved 2016-08-18.
  4. List of Nigeria national honours
  5. Adekunkle, Edwina. "Amaka Igwe Biography"Online Nigeria. Retrieved 27 April 2016.
  6. Atisele, Kenneth. "Tears and Sorrow as Amaka Igwe is Laid To Rest"thenet.ng. NET News. Retrieved 27 October 2016.

Akwụkwọ maka ya[dezie | dezie ebe o si]

Ebe ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Categories: 

  • 1963 births
  • 2014 deaths
  • People from Enugu
  • Members of the Order of the Federal Republic
  • Obafemi Awolowo University alumni
  • University of Ibadan alumni
  • AMVCA Industry Merit Award winners