Anthonia Fatunsin

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Anthonia Fatunsin
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha ọmụmụAnthonia Kehinde Fatunsin Dezie
Aha enyereAnthonia Dezie
aha ezinụlọ yaFatunsin Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20. century Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụarchaeologist Dezie
onye were ọrụNational Museum of Unity Dezie

Anthonia Kehinde Fatunsin bụ onye Naịjirịa na-eme ihe banyere ihe ngwupụta ochie. A na-ahụta ya dịka nwanyị mbụ na-amụ banyere ihe mgbe ochie na Naịjirịa, bụrụkwa nwanyị mbụ chịrị Naịjirịa National Museum, Ibadan . [1] Ọrụ ya bụ nke gbadoro ukwu karịa n'ụdị akpụmakpụ yoruba, ọkachasị ndị obodo Owo . [2]

Òmị̀mị̀ ihe ochie[dezie | dezie ebe o si]

N’afọ 1981, Fatunsin bidoro ngwupụta n'ala Igbo’laja na nke Ijebu-Owo dị n’ime obodo Owo ịmata ihe a maara dịka Owo terracotta. Babasehinde Ademuleya si Mahadum Obafemi Awolowo kwuru na nyocha ya bụ nke ugboro abụọ a na-eme ngwupụta na obodo ahụ ka Ekpo Eyo bịachara na 1976. Otú ọ dị, a na-ahụ Fatunsin ịbụ onye mbụ na-enye nkọwa zuru ezu banyere njirimara nke ihe ọkpụkpụ. [3]

Ọrụ Museolọgikal[dezie | dezie ebe o si]

Fatunshin edegola banyere oru ndi mgbe ochie na ulo ihe mgbe ochie nke Naijiria na otu o si metuta ihe nketa omenala n’ala a. A nabatala ya dị ka onye ọsụ ụzọ nke echiche na nkọwa ihe mgbe ochie na Africa.

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]