Anthony Agbo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Anthony Agbo
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAnthony Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Disemba 1954 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Ebonyi Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ndi omeiwu nigeria, onye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

A họpụtara Anthony O. Agbo ka ọ bụrụ Sịnetọ maka mpaghara Ebonyi North nke Ebonyi Steeti, Naịjiria, na-amalite ọrụ na abali iri abụọ na iteolu n'me onwa ise na afọ puku abụọ na asaa (29/5/2007). Ọ bụ onye otu People's Democratic Party (PDP).[1]

Agbo gụrụ akwụkwọ na Mahadum Steeti Ebonyi na Mahadụm nke Naijiria, Nsukka, gụsịrị akwụkwọ na afo otu puku, nari iteolu na iri asatọ na asatọ (1988). A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye omebe iwu nke Enugu State (tupu e guzobe steeti Ebonyi site na akụkụ nke Enugu), a họpụtakwara ya ka ọ bụrụ onye Ọkà okwu. O mechara bụrụ Kọmishọna nke Ego site n'afọ otu puku, nari iteolu na iri iteolu na iteolu rue na - afọ puku abuo na atọ (1999 - 2003) nakwa Kọmishọna na Ọrụ Ọha site n'afọ puku abụọ na atọ rue n'afọ puku abụọ na ise (2003 - 2005) maka Ebonyi Steeti.[1] Ewezuga ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya, Agbo bụkwa onye na-ede uri nke bipụtara ọrụ ya n'ọtụtụ akwụkwọ akụkọ ma bụrụ onye na-akwado akwụkwọ Naijiria.[2][3]

Mgbe ọ nọsịrị n'oche ya na Sịnetị n'ime onwa ise n'afọ puku abụọ na asaa (May 2007) a họpụtara Agbo na kọmitii na National Identity Card & Population, Housing, Federal Capital Territory na Drugs Narcotics Anti Corruption.[1] N'ọnwa anọ na-afọ puku abụọ na asatọ (April 2008), a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote onyeisi oche nke kọmitii na-enyocha nchịkwa Mallam Nasir el-Rufai nke FCT.[4] N'ime nyocha nke ndị Sịnetị na ọnwa ise n'afọ puku abụọ na iteolu (May, 2009), Ụbọchị e kwuru na ọ kwadoro ụgwọ na Nigerian Congress Medal of Honour Award, National Cooperative Society Federation na Nigerian Unified Filed Institute, ma kwadokwa ma ọ bụ soro kwado ọtụtụ mmegharị. Ọ na-arụsi ọrụ ike na ọrụ plenary na kọmitii.[5]

Agbo arịọla maka nguzobe Ministrị maka ndị nwere nkwarụ.[6] N'ajụjụ ọnụ a gbara ya n'ọnwa atọ, n'afo puku abụọ na iteolu (March 2009), na-ekwu maka Naịjirịa n'ozuzu ya na Abuja FCT karịsịa, o kwuru na mmemme iji gbanwee aha Naịjirị agaghị arụ ọrụ ruo mgbe ebe ahụ bụ ebe mara mma ileta, nke nwere ezigbo akụrụngwa, gburugburu ebe dị ọcha na nchekwa.[7]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Ndepụta ndị si Ebonyi Steeti

Ebemsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Sen. Anthony O. Agbo. National Assembly of Nigeria. Archived from the original on 2016-03-03. Retrieved on 2010-06-08. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "nassnig" defined multiple times with different content
  2. ONYINYE IHEZUKWU (July 3, 2009). Keeney, Barrett Raise The Stakes For Literary Fervour. Leadership. Archived from the original on 2011-07-07. Retrieved on 2010-06-08.
  3. Poems by Anthony Agbo. Sentinel Nigeria #2 (May 2010). Retrieved on 2010-06-08.
  4. Kenny Ashaka (March 9, 2009). Senatorial shocker on how El-Rufai raped FCT. Online Nigeria. Archived from the original on 2009-12-08. Retrieved on 2010-06-08.
  5. An Improved Senate, But Some Uninspiring Senators.... ThisDay (24 May 2009). Retrieved on 2010-06-08.
  6. Ogbonnaya Obinna (2009-04-13). Senator seeks creation of ministry for the disabled. The Nation. Archived from the original on 2012-03-12. Retrieved on 2010-06-08.
  7. Dennis Agbo (30 March 2009). Clean Up Citizens' Psyche Before Rebranding - Senator Agbo. Vanguard. Retrieved on 2010-06-08.