Beverly Buchanan

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Beverly Buchanan
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
Aha enyereBeverly Dezie
aha ezinụlọ yaBuchanan Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya8 Ọktoba 1940 Dezie
Ebe ọmụmụFuquay-Varina Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya4 Julaị 2015 Dezie
Ebe ọ nwụrụAnn Arbor Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụomenkà, land artist Dezie
ebe agụmakwụkwọColumbia University, Art Students League of New York, Bennett College, Columbia University Mailman School of Public Health Dezie
Ebe obibiAnn Arbor Dezie
agbụrụNdi Afrika nke Amerika Dezie
Ihe nriteGuggenheim Fellowship, Anonymous Was A Woman Award, Women's Caucus for Art Lifetime Achievement Award Dezie
webụsaịtịhttp://www.beverlybuchanan.com Dezie
Nwere ọrụ na mkpokọtaMetropolitan Museum of Art, Michael C. Carlos Museum, Studio Museum in Harlem Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie
omenkà faịlụ naSmithsonian American Art and Portrait Gallery Library Dezie

Beverly Buchanan (Ọktoba 8, 1940 na Julaị 4, 2015) bụ onye Africa-America na-ese ihe nke ọrụ ya gụnyere eserese, ihe ọkpụkpụ, vidiyo, na nka ala.[1] A maara Buchanan màkà nchọpụta ya banyéré ụlọ ndịda site na nka ya.[2]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Buchanan na Fuquay, North Carolina, ọ bụkwa nwanne nné ya na nwanne nnà ya zụlitere ya na Orangeburg, South Carolina, ébé nna nkuchi ya bụ dean nke School of Agriculture na South Carolina State College bụ naanị ụlọ akwụkwọ steeti màkà ndị Africa America na South Carolina.[2][3]

Buchanan na nna ya nọrọ ógè dị ukwuu na njem ya ebe ọ ga-eso ndị ọrụ ugbo nọ n'ime ime Obodo rụọ ọrụ, na-adụ ha ọdụ na usoro ọrụ ugbo ha.[4][5]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1971, Buchanan debara aha ya na klas Norman Lewis kụziiri na Art Students League na New York City. Lewis, tinyere ónyé na-ese ihe Romare Bearden, ghọrọ ndị enyi na ndị nduzi Buchanan.[2] Mmekọrịta a na Bearden mere mgbè ihe mberede mere na kọntaktị ebe Bearden mepụtara ihe ngosi màkà ihe omume ahụ. Buchanan zutere Norman Lewis n'azụ ikpo okwu mgbè ọ na-anwa ịbịanye aka na poster Bearden, Lewis wee were Buchanan n'azụ azụ iji zute Bearden. Buchanan mechara degara Bearden akwụkwọ ozi na-echetara ya ihe omume ahụ na Bearden ghọrọ ónyé nduzi ya ma mee ka ọ gosipụta nka ya na Cinque Gallery.[5] Buchanan kpebiri ịghọ onye na-ese ihe oge niile na 1977 mgbè ọ gosipụtara ọrụ ya na ihe ngosi nka ọhụrụ na Betty Parsons Gallery.[6] N'otu afọ ahụ, ọ kwagara Macon, Georgia.[2]

E gosipụtara ọrụ Buchanan na Independent Art Fair 2017 na ụlọ Andrew Edlin Gallery.[7] Buchanan kwuru, sị, "Ọtụtụ n'ime ihe m nwèrè okwu ahụ n'aha ha n'ihi na echere m na nke ahụ na-agwa gị na ihe a agafeela ọtụtụ ihe ma lanarị echiche[8][9] ahụ dị n'azụ ihe ndị a tụrụ atụ ... ọ dị ka, ebe a ka m nọ; I ka nọ ebe a!'"

Ọrụ Buchanan dị na nchịkọta nke Addison Art Gallery of American Art na Phillips Academy na Andover, Massachusetts, Georgia Museum of Art, Metropolitan Museum of Art.[10][11]

Onyinye[dezie | dezie ebe o si]

  • 1980: Guggenheim Fellowship[12] na National Endowment for the Arts Fellowsship
  • 1990: National Endowment for the Arts Fellowship na ihe ọkpụkpụ
  • 1994: Ihe nrite Pollock-Krasner Foundation[3]
  • 1997: Georgia Visual Arts honoree
  • 2002: Anonymous Was a Woman Award
  • 2005: Kọmitii College Art Association maka ụmụ nwanyị na nka nyere nsọpụrụ pụrụ iche
  • 2011: Ihe nrite nke Women's Caucus for Art lifetime achievement[2]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Beverly Buchanan: Obituary", Ann Arbor News, 9 July 2015.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 Klacsmann (6 May 2005). Arts & Culture. Visual Arts. Beverly Buchanan (1940-2015). New Georgia Encyclopedia. Retrieved on 29 February 2016.
  3. 3.0 3.1 The Johnson Collection: Beverly Buchanan.
  4. Quinton. Beverly Buchanan Ruins and Rituals. The Brooklyn Rail. Retrieved on December 10, 2020.
  5. 5.0 5.1 Yerman (December 31, 2013). Beverly Buchanan - An interview with Marcia G. Yerman. Marcia G. Yerman. Retrieved on December 10, 2020.
  6. Buchanan (1994). "Shack Portraiture: An Interview with Beverly Buchanan", in Flomenhaft: Beverly Buchanan: ShackWorks, a 16-year survey. Montclair, NJ: Montclair Art Museum. 
  7. Greenberger (2017-03-02). Beverly Buchanan House Sculptures Charm at Independent Art Fair (en-US). ARTnews. Retrieved on 2017-07-01.
  8. Almino, Elisa Wouk. "From Mysterious Erotica to Holy Bell Jars, Singular Projects at the Independent Art Fair", Hyperallergic, 2017-03-03. Retrieved on 2017-07-01. (in en-US)
  9. Cotter. "To Be Black, Female and Fed Up With the Mainstream", The New York Times, 2017-04-20. Retrieved on 2017-07-01. (in en-US)
  10. New Georgia Encyclopedia.
  11. Mid Line Fault (en-US). High Museum of Art. Retrieved on 2020-03-31.
  12. Beverly Buchanan. Guggenheim Foundation. Archived from the original on 3 April 2015. Retrieved on 7 March 2015.