Biko Agozino

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Biko Agozino
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereBiko Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya27 Julaị 1961 Dezie
Ebe ọmụmụAwgu Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụcriminologist, academic, sociologist, university teacher Dezie
ụdị ọrụ yacriminology, justice and judicial activities, racial discrimination, ethnic discrimination, sociology Dezie
onye were ọrụVirginia Tech, Cheyney University of Pennsylvania, Indiana University of Pennsylvania, Liverpool John Moores University, University of Calabar Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Edinburgh Dezie

Biko Agozino (amụrụ na 27 Julaị 1961) bụ Onye Naijiria na-akuzi nkuzi maka mpụ nke a maara nke ọma maka akwụkwọ ya nke 1997, Ụmụ nwanyị isi Ojii na Usoro ikpe ziri ezi nke mpụ .

A mụrụ Agozino na 27 Julaị 1961 na Awgu, Enugu Steeti, Naịjirịa. O gara Mahadum Calabar ebe ọ nwetara BSc na Sosholoji, (Sociology) Mahadum Kembriji (Cambridge) ebe ọ nwetara Master of Philosophy (Oga Filosofi) na Kriminoloji (Criminology), na Mahadum Edinburgh ebe ọ nwetara Dibia Echiche (Doctor of Philosophy) na Iwu na Uwa (Law and Society).

Agozino abụrụla onye nchịkọta akụkọ nke usoro nyocha Interdisciplinary na usoro agbụrụ, okike na klaasị nke akwụkwọ sitere na mbipụta Ashgate, Rouitledge mechaa biputakwa ha. Akwukwo Agozino (1997), Ụmụ Nwanyị isi Ojii na usoro ikpe mpụ: Iga Na Iru maka Dekolonaizeshion nke Mmegbu (Black Women and the Criminal Justice System: Towards the Decolonisation of Victimisation) bu nke ndi nnyocha ibe ya si na o bu ya bidolu echiche gbasalu dekolonaizeshion na kriminoloji.

A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye mbu onye isi nchịkọta akwụkwọ jonalu nke African Journal of Criminology and Justice Studies na onye otu nchịkọta akwụkwọ nke Jenda: A Journal of West African Women's Studies and Culture . O nokwa na Bodu jonalu ndi ozo na Land (Australia), Aotearoa (New Zealand), na Yunaited Kindomu.

A mụrụ Agozino na 27 Julaị 1961 n'Awgu, Enugu State, Nigeria. Ọ gara Mahadum Kalaba (Calabar) ebe ọ nwetara BSc na Sosholoji, Ugo Klassi Mbu, Mahadum Kembriji (Cambridge) ebe ọ nwetara Masters (Oga) Filosofi na Iwu (Law). O jezia nweta Dibia Echiche (Ph.D.) na Mahadum Edimboro, ebe o delu Tisisi ya na Umu Nwanyi isi Ojii na Iwu Mpu (Black Women and the Criminal Justice System).

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ Agozino [1]-na enyocha mmetụta gara aga na nke ugbu a nke ọchịchị ndị nchigbu n'ụzọ usoro ikpe ziri ezi si emeso ndị agbụrụ na agbụrụ dị nta site ka ha si acha, okike ha, na ka ha si kaa (race, gender, and class).

Ọrụ ya na-azụlite echiche postkolonial ma o bu dekolonaizeshion na mpụ na iwu n'Africa. Agozino na-agbaghali uka si na uno mpkoro (Prison) adighi na ala ndi gboo. Ya melu o ji si na anyi tosilu imachi uno mkpolo niile (Abolition), weluzia mgbaghalu (forgiveness) na nkwuachi (reparations) welu mezie otutu ihe e ji atu ndi madu nga. O sikwa na ka esi nye ndi ozo reparashonu maka ihe ojoo emelu ha, etosikwalu inye ndi Ojii rnkwughachi iparashonu ruru ha maka ohu agbalu ha na ochichi nchigbu kolonialismu na apataidi na niokolonialismu.

Na n'akwukwo 2007 nke Gabbidon delu, W.E.B. Du Bois banyere mpụ na ikpe ziri ezi, o si na Agozino kwuru na " ntaramahụhụ gabigara ókè" na usoro ikpe mpụ nke US, UK, South Africa na Australia anọwo na-abawanye karịa ibelata nsogbu nke mpụ. [2] O kwukwara okwu banyere ihu abụọ nke ndị isi Britain na America n'ịkpọ Madiba Nelson Mandela onye ekperime na-eyi ọha egwu maka na ọ na-alụ ọgụ megide ọchịchị nchigbu apataidi ndị Ocha na-eyi egwu na South Africa.

Ọrụ ya bụ usoro ihe omume, na-atụle mmepe nke mpụ na mba ndị dị n'ebe ọdịda anyanwụ na mmetụta ha na obodo ndị owuwa anyanwụ, karịsịa ndị na-achịbu achigbu. O meela ka dikolonaizeshonu bulu ihe ọhụrụ na Kriminoloji. Akwukwo ya, Kaunta-Kolonial Kriminoloji: Nkotosi Echiche Imperialismu (Counter-Colonial Criminology: A Critique of Imperialist Reason, 2003) na ewu ewu.

[3]'Akwụkwọ ya nke afọ 1997, Black Women and the Criminal Justice System, Agozino kwuru na ọrụ agbụrụ na agbụrụ na mkparịta ụka nke ike n'ime ụlọ mkpọrọ, ebe ndị ocha na-anọchite anya nke ukwuu n'etiti ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ ma na-anọchi anya ndị mkpọrọ.

Akwụkwọ akụkọ[dezie | dezie ebe o si]

Ebemsiba[dezie | dezie ebe o si]

  1. Shaun L. Gabbidon (2009). Race, ethnicity, crime, and justice: an international dilemma. SAGE. ISBN 978-1-4129-4988-0. 
  2. Shaun L. Gabbidon (2007). W.E.B. Du Bois on crime and justice: laying the foundations of sociological criminology. Ashgate Publishing, Ltd.. ISBN 978-0-7546-4956-4. 
  3. Barbara H. Zaitzow, Jim Thomas (2003). Women in prison: gender and social control. Lynne Rienner Publishers. ISBN 1-58826-228-6.