Bimbo Odukoya

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Bimbo Odukoya
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereBimbo Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya12 Septemba 1960 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya11 Disemba 2005 Dezie
Dị/nwunyeTaiwo Odukoya Dezie
nwaJimmy Odukoya Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụpastor Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan Dezie

Abimbola Rosemary "Bimbo" Odukoya (nee Abimbola Rosemary Segun-Williams) (September 12, 1960 - December 11, 2005) bụ pastọ Naijiria na onye mgbasa ozi ọma n'onyonyo nke lụrụ onye isi Fountain of Life Church,bụ Taiwo Odukoya .

Odukoya, nke a na-akpọkarị "Pastor Bims," bụ onye natara ihe nrịte karịrị 60 nke Nijiri ma mba ndị ọzọ maka onyinye ya maka iwulite ,na imepe obodo ya bụ Naịjirịa, na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka, yana idu dịka nwanyị.nke ụkpụrụ omume dị elu na ihe nlereanya nye ọtụtụ ndị. Onye ode akwukwo, onye mgbasaozi a ma ama, onye okwu okwu n'ọgbakọ a na-achọ achọ, onye ọzụzụ ndị ntorobia na onye nkuzi ihe gbasara alụmdinanwunye, o sobu n'otu n'ime ndị Samsung họpụtara ị nọchite anya Naijiria maka i bu ọkụ nke Olimpiiki n'Athens,na Gris na 2004 Olympic Games . Ọ nwụrụ n'ihi ihe ọghọm nke ụgbọelu Sosoliso nke Flight 1145 .

Ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Odukoya mụrụ History na Archaeology na University of Ịbada ebe ọ gụsịrị akwụkwọ jiri Bachelor nke Arts pụta. Ọ maliteziri ọrụ ya na National Theater dị na Legos . N’oge na-adịghị anya ọ gbara arụkwaghịm i ji banye n'igbasa oziọma site n'afọ 1987 ruo n'afọ 1999, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi ngalaba na-enye ndụmọdụ na TREM n’okpuru nduzi nke Bishọp Mike Okonkwo . Pastọ Bimbo luru onye isi nke Fountain of Life Church, [1] Pastọ Taiwo Odukoya, ha nwere umu ato, Tolu Odukoya, (Pastọ) Jimmy Odukoya na Tobi Odukoya.

N'oge ọnwụ ya, ọ bụ onye ọkaibe agadi ụkọchukwu nke The Fountain of Life Church na onye isi oche nke Discovery for Women . [2]

Ọ bụ onye nchịkọt nke Single and Married, [2] mmemme a na-agbasa n'ihe onyonyo na mpaghara Naijiria niile na mba ndị ọzọ nke na-ekwu banyere okwu ndị bara uru na-eche ndị mmadụ ihu n'alụmdi na nwunye na mmekọrịta. Ihe niile a na-akụzi n'ihe emume ahụ bụ Akwụkwọ Nsọ duziri ọdịnaya ahụ. A maara ya nke ọma dịka onye okwu okwu n'ọgbakoọ n'ime Naijiria na ụfọdụ mba ndị ọzọ.

Ọnwụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Bimbo Odukoya banyere ụgbọ elu Sosoliso Flight 1145, na-aga Port Harcourt site n'Abuja . N'ụbọchị nke 10 n'ọnwa Disemba n'afọ 2005, ụgbọelu ahụ dara mgbe ọ dara na ọdụ ụgbọ elu mba na Port Harcourt ; Bimbo nyara mbido ada ahụ were nwụọ site na mmerụ ahụ n'ụbọchị 11 n'ọnwa Disemba nke afọ 2005. Usoro ihe omume ụka ya na-aga n'ihu na njikwa nke nwa ya nwoke Othniel Jimmy Odukoya.

Akwụkwọ ndị o dere[dezie | dezie ebe o si]

    • How to Choose a Life Partner, by Bimbo Odukoya, Xulon Press (15 October 2005)
    • Living Free, How to Handle Rejection by Bimbo Odukoya, Grace Springs Publishers, Inc., 2006
    • Living Free, Overcoming Masturbation by Bimbo Odukoya, Grace Springs Publishers, Inc., 2006
    • Marriage, Real People, Real Issues, Wise Counsel by Bimbo Odokoya, Grace Springs Publishers, Inc., 2006

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. The Fountain Of Life Church (en-US).
  2. 2.0 2.1 Archived copy. Archived from the original on 2011-07-28. Retrieved on 2011-06-25.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]