Bob-Manuel Udokwu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Bob-Manuel Udokwu
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya18 Eprel 1968 Dezie
Ebe ọmụmụOgidi Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye nhazi ndu ihe nkiri, omee, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke ọdụ ụgbọ mmiri-harcourt, Mahadum nke Lagos Dezie
agbụrụAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Bob-Manuel Obidimma Udokwu (amụrụ n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Eprel 1968) bụ onye omee, onye ntụziaka, onye na-emepụta ihe nkiri na onye ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa. [1] N'afọ 2014, ọ nwetara nturu ugo nke ogologo ndụ na awọd nke 10th Africa Movie Academy Awards . [2] [3] [4] A họpụtara ya maka onye na -eme ihe nkiri kacha mma na ọrụ nkwado na 2013 Nollywood Movies Awards maka ọrụ ya na Adesuwa .

Ntọala[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ onye Nkwelle-Ogidi, Idemmili North LGA nke Anambra State, Naijiria. Ọ bụ onye Igbo site n'ebo. Aha nna ya bụ Geoffrey Nwafor Udokwu na aha nne ya bụ Ezelagbo Udokwu. A mụrụ ya na steeti Enugu . Ọ bụ nwa nke anọ n'ime ezinụlọ nwere ụmụaka isii. Ọ bụkwa nwa nwoke nke abụọ. O sitere na ezinaụlọ nke mejupụtara ụmụ nwoke atọ na ụmụ nwanyị atọ.

Mmụta[dezie | dezie ebe o si]

Ọ gara ụlọ akwụkwọ St. Peters (nke akpọrọ ugbu a Hillside Primary School) na Coal Camp, Enugu, Enugu Steeti maka agụmakwụkwọ elementrị ya na Oraukwu Grammar School, Oraukwu, Anambra State maka ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya. Ọ gara mahadum Port Harcourt, Port Harcourt, Rivers State ebe ọ nwetara nzere bachelọ nke Arts na Theater Arts. O nwetara nzere masta na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nka na mmekọrịta mba ụwa na mahadum Lagos, Lagos Steeti. Ọ bụ onye isi otu ndị na-ahụ maka ihe nkiri nka na mahadum nke afọ Nigeria n'afọ 1989-1990 [5]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Udokwu zutere nwunye ya bụ Cassandra Joseph mgbe ọ na -eme mmemme nzere masta ya na mahadum Lagos, ebe ọ ka n'agụ akwụkwọ na mahadum. Ha lụrụ na FFebrụwarị abalị iri na iteghete,nke afọ 2000. [6] Alụmdi na nwunye ahụ mepụtara ụmụaka abụọ, otu nwanyị na nwa nwoke. Aha nwata nwanyị ya bụ Elyon Chinaza na aha nwa ya nwoke bụ Marcus Garvey. [7] Ọ kpọrọ nwa ya nwoke, Garvey Udokwu aha onye ndu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Marcus Garvey . [8]

Filmografii[dezie | dezie ebe o si]

  • Living in Bondage
  • Rattlesnake
  • Karishika
    • The Key for Happiness
    • Black Maria
    • What a World
    • Heaven after Hell
    • A Time to Love
    • Cover Up
    • Endless Tears
    • Naked Sin
    • My Time
    • Home Apart
    • Games Men Play
    • Soul Engagement
    • Living in Bondage: Breaking

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta ndị Igbo
  • Ndepụta ndị na -emepụta ihe nkiri Naịjirịa

Nrụtụ̀aka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Bob-Manuel Udokwu joins Gov Obiano’s cabinet. Vanguard (Nigeria). Retrieved on 10 August 2014.
  2. NONYE BEN-NWANKWO AND KEMI VAUGHAN (July 27, 2013). Bob-Manuel Udokwu is not happy now. The Punch. Archived from the original on 12 August 2014. Retrieved on 10 August 2014.
  3. NKARENYI UKONU (November 18, 2012). Ladies warn me not to pick my husband’s call again — Cassandra Udokwu. The Punch. Archived from the original on 29 November 2013. Retrieved on 10 August 2014.
  4. Ayo Onikoyi (4 May 2014). How Amaka Igwe made me a star – Bob Manuel-Udokwu. Vanguard (Nigeria). Retrieved on 10 August 2014.
  5. Modern Ghana - Breaking News, Ghana, Africa, Entertainment. www.modernghana.com. Retrieved on 2021-04-18.
  6. My marriage...with Bob-Manuel Udokwu (en-US). Punch Newspapers (2020-12-11). Retrieved on 2021-04-17.
  7. Bob-Manuel's Daughter, Elyon Chinaza Udokwu Crowned African Queen 2016 - Glamtush (en-US) (2016-06-21). Archived from the original on 2021-04-18. Retrieved on 2021-04-18.
  8. Biography, Profile, Movies and Success Story of Bob Manuel Udokwu. (30 April 2018). Archived from the original on 21 August 2018. Retrieved on 24 September 2018.