Bruce Onobrakpeya

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Bruce Onobrakpeya
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereBruce Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya30 Ọgọọst 1932 Dezie
Ebe ọmụmụAgbara-Otor Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ese, onye na-akpụ ihe ọkpụkpụ, printmaker Dezie
onye were ọrụElizabeth City State University Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello Dezie
Flọruit Dezie
Ihe nriteFulbright Scholarship Dezie
official religionChristain Dezie
Nwere ọrụ na mkpokọtaTate, National Museum of World Cultures, Vanderbilt University Fine Arts Gallery, Studio Museum in Harlem Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie
Bruce Onobrakpeya

  Amụrụ Bruce Obomeyoma Onobrakpeya (n'ubọchị iri atọ nke ọnwa Ọgọstụ nʼafọ 1932) Ọ bụ onye Naijiria onye nke na-ebi akwụkwọ, na ese kwa ihe osise ma na akpụ kwa ihe. O gosipụtago na Tate Modern na London, National Museum of African Art nke Smithsonian Institution na Washington, D.C. na Malmö Konsthall na Malmö, Sweden.[1] National Gallery of Modern Art, Lagos nwere ihe ngosi nke ihe osise mara mma nke Onobrakpeya[2][3]

A mụrụ Bruce Onobrakpeya na Agbarha-Otor na Delta State, nwa nke onye na-esi osisi akpụpụta ihe na Urhobo. A zụlitere ya dị ka Onye na-ekpere Kristi, mana ọ mụtakwara nkwenye ọdịnala. Ezinụlọ ya mèchàrà kwaga na Benin City, Edo State, mgbe ọ bụ nwata. Ọ gara akwụkwọ na Western Boys High School, ebe Edward Ivehivboje kụziiri ya nka, n'etiti ihe mmụta ndị ọzọ. Ọ gakwara klas ise ihe na British Council Art Club na Benin City. Mmasị Onobrakpeya nwere ihe osise sitere na ihe osise nke ụdị kọlọ mmiri dị ichè ichè nke Emmanuel Erabor. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị, e nwere Onobrakpeya n'ọrụ dị ka onye nkuzi nka na ihe osise na Western Boys High School site (1953 Xi56). N'afọ 1956, ọ garawara Ondo, ebe ọ kụziri ihe na Ondo Boys High School otu afọ.

N'ọnwa Ọktoba n'afọ 1957, Onobrakpeya banyere na kọleji nka, sayensị na teknụzụ nke Naịjirịa, bụ nke ana-kpọ zí Mahadum Ahmadu Bello, Zaria. Gọọmentị etiti bụ ndị zụrụ ya na akwụkwọ, a zụrụ ya na ihe gbasara ọdịnala ọdịda anyanwụ nke nka na ihe osise nnọchiteanya. N'otu oge ahụ, ọ malitere ịnwale ụdị ndị gbasara akụkọ ọdịnala, akụkọ ifo na akụkọ mgbe ochie nke Naijiria. Ọtụtụ n'ime ọrụ ya na-eji ụdị n'ụdị ihe ịchọ mma na ihe gbasara omenala ịkpụ ihe na ihe ndị sitere na ọdịnala Afrịka na nka n'ụzụ ịchọ mma.

Ka ọnwa Ọktoba dị mkpụrụ ụbọchị iteolu n'afọ 1958, Otú ụmụ akwụkwọ na ndị na agụ nka na ihe osise na koleji ahụ bụ ndị Uche Okeke bụ onye ndu ha guzobere otu ndị nka ana-kpọ Zaria Arts Society, nke e mechara kpọwa ndị nnupu isi Zaria ebumnuche nke otu ụmụ akwụkwọ nka na kọleji a ndị Uche Okeke bú onye ndu ha bụ "decolonizing" nka anya dị ka ndị ọcha si mba Europe si-akụzi ya. Onobrakpeya kwuru na kọleji nyere ya nkà na ụzụ mana Zaria Arts Society, otu mkparịta ụka, kpụrụ echiche ya dị ka onye na-ese ihe. Ndị otu ahụ nyere ya obi ike nkwenye na onwe ya ịchọ okwu na-egosipụta onwe ya. Ọ gbatịkwara ọnụọgụ onyinyo ya, leghara anya n'etu ndị mmadụ si ahụ ihe ma kpọlite ike nke mmụọ site na ihe ịchọ mma na-edoghị anya.

  1. Bruce Onobrakpeya. Modern African Art. Archived from the original on 29 January 2008. Retrieved on 22 May 2011.
  2. National Gallery of Modern Art Lagos. Nigeria Vacation. Archived from the original on 26 November 2010. Retrieved on 22 May 2011.
  3. Bruce Onobrakpeya (Dedicated Exhibition). ArtPortal. Archived from the original on 4 August 2019. Retrieved on 12 October 2017.