Chigozie Christopher

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Àtụ:Infobox football biography

Chigozie Christopher
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20 Eprel 1992 Dezie
Ebe ọmụmụBauchi Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụicheetiti etiti Dezie
onye nsonye òtù egwuregwuBayelsa United F.C., Ocean Boys F.C., Dolphins F.C., Heartland F.C. Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie

 


Chigozie Christopher (amụrụ na 20 Eprel 1992 na Bauchi, Bauchi State) bụ onye Naijiria na-agba bọọlụ nke na-agba dịka onye na-agba ọsọ n'etiti etiti maka Rangers Football Club nke Enugu, Enugu State.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Chigozie malitere ọrụ bọọlụ ya na Bayelsa United wee bịanye aka na Dolphins F.C. nke Port Harcourt na 2011 Dolphins FC, mgbe ọnwa isii gachara na Dolphin FC ọ bịanyere aka na Heartland F.C nke Owerri.[1]

Chiogzie Christopher hapụrụ Heartland F.C. mgbe oge gara nke ọma na Naze Millionaires ebe ọ rịọrọ ka e nye ya ihe nrite FA n'ime otu afọ ọ nọrọ na klọb ahụ, arụmọrụ ya mere ka o nwee ohere ịlaghachi na ndị otu ọhụrụ a na-akwalite na Nigeria Premier League Bayelsa United, ọ nwekwara nchekwube na Bayelsa United pụtara ndị mmeri n'oge ahụ ma na-atụkwa anya na arụmọrụ ya na oge 2012/3013 ga-ewetara ya ọnọdụ na National Teams.[2]

Chigozie bịanyere aka na Zambia Based Football Club nke a na-akpọ Zesco United mgbe ọ rụchara ọrụ na Bayelsa United, ọ laghachiri site na obere oge na Zambia Super League nke Zesco United. Ebe o nyere aka nke ukwuu na ihe ịga nke ọma nke klọb ahụ nke dugara na mmeri nke 2015/2016 Zambia Super League n'agbanyeghị na o nwere obere oge egwuregwu.

Lobi Stars F.C, Makurdi Benue State bịara na-akpọ oku maka ịbịanye aka ya maka ọnwa isii.

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]