Chinedum Orji

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chinedum Orji
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya25 Disemba 1970 Dezie
Ebe ọmụmụSteeti Abia Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
ebe agụmakwụkwọFederal University of Technology Owerri Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

Chinedum Enyinnaya Orji // (ege ntị) bụ onye isi ocheụlọ nzukọ Abia Steeti iri na otu na nke ugbu a, na-arụ ọrụ kemgbe ụbọchi iri nke ọnwa June afọ, 2019. A họpụtara ya dị ka onye omeiwu na-anọchite anya Umuahia Central State Constituency na 2015 ma họpụta ya ọzọ n'oge ntuli aka 2019 nke Gọvanọ na Ụlọ Nzukọ nke Steeti na Abia Steeti na ikpo okwu nke Peoples Democratic Party.[1][2] A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke Ụlọ nzukọ Abịọ́ steeti n'ụbọchị nke iri nke ọnwa juun afọ 2019 n'oge nraranye nke ụlọ nzukọ Abia steeti nke asaa.[3]

Mbido Ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Chinedum Enyinnaya Orji n'ụbọchị nke iri abụọ na ise nke ọnwa Disemba afọ 1970, n'ezinụlọ onye ọrụ gọọmentị a ma ama ghọrọ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Senator Theodore na Chief Mrs.Odochi Orji nke Amaokwe na Ugba village, Obodo Ugba nọọrọ onwe ya na Umuahia North Local Government Area nke Abia State, Nigeria. Chinedum gara akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ praịmarị obodo nke Ugba, Umuahia Ibeku site n'afọ 1976 ruo afọ 1982, ebe ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị nke gọọmenti, Owerri, site n'afọ1982 ruo afọ 1987. Ọ nwetara nnabata na Mahadum Gọọmentị etiti nke dị n'Owerri ebe ọ gụsịrị akwụkwọ nweta nzere bachelọ na Civil Engineering n'afọ 1996.[4]

Ọrụ ọkachamara[dezie | dezie ebe o si]

Chinedum Enyinnaya Orji bụ onye otu ọha mmadụ Injinia Naịjiria (MNSE), nzukọ nche anwụ maka Ọrụ ọkachamara Injinia na Naijiria.[5]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Tupu ọ tụba okpu ya n'ime mgbanaka ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Rt Hon Chinedum E. Orji MNSE emeela onwe nkewapụta dị ka onye ọrụ ebere pụrụ iche nke metụrụ ndụ ndị mmadụ aka site na ọtụtụ ntinye aka ya nke hụrụ na mmezu nke ọrụ na onyinye nvke ihe ndị metụrụ ndụ nke ndị mmadụ aka kpọmkwem site na Direct Touch Initiative nke hụkwara ike nke ọtụtụ ndị Abians karịsịa ndị ntorobịa na ụmụ nwanyị site na inweta ọtụtụ onyinye na mma maka ya.

N'ịbụ onye ndị mmadụ hụrụ n'anya, ọ bịara dị ya mfe ịpụta dị ka onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara etiti Umuahia na Ụlọ nzukọ Abịa Steeti na ntuli aka afọ 2015 ma jee ozi dị ka onye isi nke ụlọ ruo 2019 mgbe a họpụtara ya ọzọ na mgbakọ nke asaa. N'ụbọchi nke iri nke ọnwa June afọ 2019, Chinedum Enyinnaya Orji pụtara dị ka onye isi oche nke mgbakọ nke asaa nke Abịa steeti mee ka ọ bụrụ nwa amaala nke atọ na steeti ahụ. Ọ bụ onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị People's Democratic Party.[6] Orji dọrọ ndọrọ nke Ikwuano/Umuahia North/ mgbakọ etiti ụmụahịa south nke Abia State na ntuli aka nke ụbọchị nke iri abụọ na ise nke ọnwa February afọ 2023 nke Ụlọ ndị nnọchiteanya mana onye mmegide ya Obi Aguocha nke Labour Party nke meriri ya nwetara vootu 48,199 iji merie Orji nwetara vootu 35,195.[7]

Ebubo nrụrụ aka na nyocha EFCC[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Febụwarị afọ 2020, Kọmitii Na-ahụ Maka Mpụ akụ n'ụba na ego mara ọkwa nyocha banyere Orji, nna ya Theodore, na nwanne ya nwoke Ogbonna dabere na mkpesa nke kọmitii ahụ natara n'afọ 2017. mkpesa ahụ, nke Fight Corruption: Save Nigeria Group tinyere, depụtara ihe karịrị ijeri ego ọha na eze 500 nke e kwuru na ezinụlọ Orji zuru mgbe Theodore jere ozi dị ka Gọvanọ Abia Steeti site n'afọ 2007 ruo afọ 2015. A na-eche na ego ahụ bụ ijeri 383 site na akaụntụ gọọmentị etiti, ijeri 55 nke ego nrụpụta karịrị akarị, ijeri 2.3 site na ego SURE-P, ijeri 1.8 site na ego gburugburu ebe obibi, ijeri 10.5 nke ego ebitere ụlọ akụ first bank , ijeri 4 nke ego ebitere Diamond Bank , ijeri 12 nke ekwesịrị ịnyeghachi Paris Club, ijeri 2 nke ego mbinye ndị ọrụ ugbo, na ijeri 55 nke ego nke mmepe mpaghara Abia State n'emeputa mmanu tinyere ego gọọmentị ndị ọzọ gụnyere nde 500 ego nche kwa ọnwa. Ka e mesịrị n'ọnwa Febụwarị nke afọ 2020, a gbara ma Theodore na Chinedu Orji ajụjụ ọnụ ka nyocha ahụ chọpụtara na Chinedu nwere akauntu 100 dị iche iche a na-enyo enyo na ụlọ akụ nke e nwere ike iji zoo ego ezuru.[8][9]

N'abalị iri na itoolu n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2021, e jidere Theodore n'ọdụ ụgbọ elu mba ụwa Nnamdi Azikiwe mgbe ọ na-erubeghị isi n'ọnọdụ ntọhapụ ya ma tụfuo paspọtụ ya na EFCC. Ka e mesịrị n'ụbọchị ahụ, Chinedu nyefere onwe ya nke mere eji jide ya.[10][11][12] A gbara ha abụọ ajụjụ ọnụ tupu a tọhapụ ha na mgbapụta ma gwa ha ka ha laghachi maka ajụjụ n'ọdịnihu.[13][14]

Onyinye Ọrụ Ọha nke Sun Newspapers[dezie | dezie ebe o si]

N'ụbọchị iri na asaa n'ọnwa Ọktoba, Chinedum Enyinnaya Orji nwetara onyinye The Sun Public Service Award 2020, site n'aka The Sun Publishing Ltd, ndị na-ebipụta The Daily Sun Newspapers maka ndụ na-emetụ n'ahụ[15][16][17]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Chinedum Enyinnaya Orji bụ Knight nke Anglican Communion.[18][19]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. Orji's son emerges Abia Assembly Majority Leader. The Nigerian Voice. Retrieved on 2019-07-24.
  2. Abia Assembly: Twelve New Abia Lawmakers Endorse Hon Chinedum Orji for Speakership Position. IGBO WATCH (2019-05-29). Archived from the original on 2019-12-23. Retrieved on 2019-07-24.
  3. http://saharareporters.com/2019/06/11/ex-governor-theodore-orji%E2%80%99s-son-emerges-abia-state-house-assembly-speaker-0/
  4. Admin. Behold Rt Hon. Chinedum Enyinnaya Orji IKUKU, The NEW Speaker Of Abia State House OF Assembly.. PUO REPORTS. Retrieved on 24 July 2019.
  5. Admin (June 2019). Chinedum Orji: Legislating to touch lives/. VANGUARD. Retrieved on 24 July 2019.
  6. Ex-Gov Orji's son, Chinedum emerges Abia Speaker [See other officers] (10 June 2019).
  7. Nigeria (2023-02-27). Abia speaker loses Reps seat to Labour candidate (en-US). Peoples Gazette. Retrieved on 2023-04-26.
  8. Nwezeh. EFCC Investigates Theodore Orji, Son for Alleged Diversion of N551bn. ThisDay. Archived from the original on 22 August 2021. Retrieved on 21 August 2021.
  9. Ogune (9 February 2020). Graft: Theodore Orji may toe same path as predecessor. The Guardian. Archived from the original on 22 August 2021. Retrieved on 21 August 2021.
  10. Sanni (19 August 2021). EFCC arrests ex-governor at airport, detains him, son. Premium Times. Retrieved on 21 August 2021.
  11. Adepegba (19 August 2021). EFCC arrests ex-Abia gov Orji at Abuja airport. The Punch. Retrieved on 21 August 2021.
  12. Daniel (19 August 2021). Breaking: EFCC arrests ex-Gov Theodore Orji. Vanguard. Archived from the original on 20 August 2021. Retrieved on 21 August 2021.
  13. EFCC Releases Former Abia State Governor Theodore Orji. Channels TV. Retrieved on 21 August 2021.
  14. Sanni (19 August 2021). EFCC releases detained ex-governor on bail. Premium Times. Retrieved on 21 August 2021.
  15. Abia Speaker, Chinedum Orji, Wins SUN's Public Service Award 2020. This Day (9 October 2021). Retrieved on 30 October 2021.
  16. Abia Speaker Honoured with The Sun Public Service Award of the Year 2020. PUO REPORTS (17 October 2021). Retrieved on 30 October 2021.
  17. Igbo youths lauds Abia Speaker on winning Sun Award. The Sun (Nigeria) (16 October 2021). Retrieved on 30 October 2021.
  18. Photos: Anglican Bishops Receive Abia Assembly Speaker Chinedum Orji PUO Retrieved July 24, 2019
  19. https://www.vanguardngr.com/2019/06/chinedum-orji-legislating-to-touch-lives// Jude Chijioke Ndukwe Retrieved July 24, 2019