Chinelo Anohu-Amazu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chinelo Anohu-Amazu
Chinelo Anohu-Amazu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụoka mmuta Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria, Harvard University Dezie
affiliation stringAfrica Investment Forum Dezie
so naGlobal Conference 2022, FII PRIORITY In Miami, USA Dezie
webụsaịtịhttp://www.pencom.gov.ng Dezie

Chinelo Anohu bụ onye ọka iwu Naịjirịa onye ọrụ ọhaneze na onye nchịkwa. Ọ bụ onye Director General na CEO gara aga nke National Pension Commission, (PenCom). Ọ bụ onye otu Pension Reform Committee nke afọ 2004 nke na-ewebata atụmatụ ịtụ ego ezumike nka na Naijiria. Na Mee afọ 2019, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi na onye isi oche nke Africa Investment Forum.ndị AfDB

Ọ bụ onye otu ọsụ ụzọ na London stock exchange Africa Advisory group.. N’afọ 2004, ọ ghọọrọ onye ọsụ ụzọ na ndụmọdụ gbasara iwu na PenCom na Naịjirịa. N'ụbọchị nke 14 n'ọnwa Disemba n'afọ 2014, a họpụtara ya dịka onye isi nchịkwa nke kọmịshọn ahụ. Ọ gụsịrị akwụkwọ nke nzere Bachelor of Law na Mahadum nke Nigeria dị n'Enugu . O nwekwara asambodo nke nzere masta na Telecommunication and Information Technology na London School of Economics. Ọ gara Mahadum nke Harvard,Kennedy School of Government, London Business School, Columbia University Graduate School of Business na Wharton University Business School maka agụmakwụkwọ Ndị Isi Nchịkwa dị iche iche.

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

O si n’ezinụlọ nwere ụmụ isii. Nna ya bụ ọkà mmụta sayensị, ebe mama ya bụ onye ọrụ ụlọ akụ, onye nkuzi ji nzere dọktọreti na asụsụ Bekee. Nne ya bụ onye nlereanya ya; N'ajụjụ ọnụ akwụkwọ akụkọ Guardian gbara ya, ọ sịrị "Ọ dị mma, a bụ m nwa nne m. Nke a pụtara na m na-agbado anya, na-achọsi ihe ụwa ike maka ọganihu. Ma ọ pụtakwara na m maara nke ọma ị bụ onye ndozi ụlọ. Nnem na=aga n'ihu, ma n'ime ụlọ ma n'ezi. Ọ na-eme nri, sie nri na ihe niile. Ruo taa, ọ ka na-eme nri nna m,ọ masịrị ya ime. A zụrụ m n’ebe e nweghị nnukwu nsogbu gbasara ilekọta ụlọ. Dịka nwatakiri, m ga-ezo na-agụ akwụkwọ na nna m ga-achọ m gwa m, ị ga-amụta etu esi esi nri, ị sa akwa na i dobe ụlọ n'ihi na ị gosibeghị m ihe ọ bụla gosiri na ị ga-akwụ ụgwọ odibo ụlọ. . [1]

Agụmakwụkwọ ya[dezie | dezie ebe o si]

Chinelo nwetara nzere bachelọ nke iwu na Mahadum nke Naijiria,n'Enugu n'afọ 1996. Ọ gụsịrị akwụkwọ na <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/Nigeria_Law_School" rel="mw:ExtLink" title="Nigeria Law School" class="mw-redirect cx-link" data-linkid="68">Nigeria Law School</a> n'afọ 1997. N’afọ 2000, ọ natara nzere masta na Computer and Communications Law site na London School of Economics. Dịka akụkụ nke mmụta ya; n'afọ 2008 ọ gara Columbia University Graduate School. N’afọ 2007, ọ gụrụ akwụkwọ na JF Kennedy School of Government na Mahadum nke Harvard. N'afọ 2002, ọ nọ na Wharton Business School, Mahadum nke Pennsylvania agụmakwụkwọ ndị isi. [2] [3]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ugbu a (2016), Chinelo bụ Director General na CEO nke PenCom, [4] ụlọ ọrụ nwere uru bara uru karịa N5.bn. [2] [5] Ọ bụ onye otu ndị Pension Reform Team nke webatara ntụnye ego ezumike nka na Naịjirịa. Tupu ọkwa ya dịka DG nke ọrụ kọmishọnụ ahụ, ọ bụ ọsụ ụzọ odeakwụkwọ / Onye Ndụmọdụ iwu nke kọmịshọn ahụ. E boro ya ebubo ị bufe ego nke onye Pension Fund Administrator to nye onye PFA ọzọ bụ onye ezinụlọ ya. [6] N'ihe metụtara nke a, Ụlọ ikpe Kasị Elu nke gọọmenti etiti n'Abuja gbochiri ya ime iheharị ahụ n'ụbọchị nke 11 n'ọnwa Ọgọstụ nke afọ 2016. Ọ bụ onye otu London stock exchange Africa Advisory group. [1]

E wepụrụ ya ọrụ ya dịka DG nke PenCom site n’aka onye isi ala Muhammadu Buhari n'afọ 2017. Ọzọkwa, ụlọ Ndị Nnọchiteanya Naijiria degaara National Pension Commission (PenCom) akwụkwọ n'ọnwa Mee nke afọ 2019 iji gwa ha mmaka mmalite nke nyocha banyere nrụrụ ahịa mere n'oge ọchịchị ya, na ebubo nke mmejọ, mmebi iwu na mmebi iwu nke Public Procurement Act, nke afọ 2007. [7]

Ebem si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Chinelo Anohu-Amazu: The woman with passion for pensions. The Guardian. Retrieved on 8 October 2016.
  2. 2.0 2.1 Meet 5 powerful and beautiful women in President Jonathan's government. Nigerian Monitor. Retrieved on 8 October 2016.
  3. Chinelo Anohu-Amazu. Pension and Investment. Retrieved on 8 October 2016.
  4. Senate Confirms Anohu-Amazu As PenCom DG. Africa Independence Television. Retrieved on 8 October 2016.
  5. Pension fund hits N5bn – Anohu Amazu. Champion Newspaper. Archived from the original on 9 October 2016. Retrieved on 8 October 2016.
  6. How Anohu-Amazu's personal, family interests may tear Pencom apart. National Accord. Archived from the original on 9 October 2016. Retrieved on 8 October 2016.
  7. http://saharareporters.com/2019/05/10/reps-probe-former-national-pension-commission-dg-over-procurement-irregularities