Chinyere Ike Nwosu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chinyere Ike Nwosu
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoChinyere Ike Nwosu Dezie
Aha ọmụmụChinyere Ike Nwosu Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya21 Novemba 1946 Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiGovernor of Abia State, Governor of Oyo State Dezie
agbụrụNdị Igbo Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ájá ájá Dezie
ọkwa aghaizugbe Dezie
na-esochiOgbonnaya Onu Dezie
nọchiriTemi Ejoor Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Brigedia Jeneralụ Chinyere Ike Nwosu (onye amụrụ na Nọvemba 21, 1946 ) bụ onye isi ọchịchị nke ndị Naịjirịa nke Abịa Steeti (Disemba 1993 - Septemba 1994) na nke Oyo Steeti (Septemba 1994 - Ọgụstụ 1996) n’oge ọchịchị ndị agha nke Jeneralụ Sani Abacha. . [1]

Dị ka gọvanọ Abia Steeti, a kọwara ya dịka onye nchịkwa na-agbagha agbagha nke nyere ikike ime ihe. [2] N’afọ 1993, nwunye ya Chinyere Nwosu hiwere otu "Abia Less Privileged Organisation" (ALPO), iji nyere ụmụnwaanyị aka inweta ebe obibi na nka.

Dịka onye ọchịchị nke Oyo Steeti, o mebiri ikike nke ndi ọchịchị ọmenala site na ime Alaafin nke Oyo, Oba Lamidi Adeyemi, onye isi oche nke Oyo Steeti Kansụl nke ndị Oba. Tupu oge ahụ, ọnọdụ ahụ agbaala okirikiri n'etiti ndị Oba atọ. [3] N’ọnwa Machị 1995, o nyere ndị ọkwọ ụgbọ ala na ndị njem tagzi iwu ka ha si n’ụgbọ ala ha n’ogige Egebda na moto ugboala dị n’Ibadan maka imebi mmemme Oyo “Day Sanitation”. Ndị ikpe nkwụgharị ya riri ọtụtụ ndị njem iwu ego, ma manye ha isekpu ala n'etiti anyanwụ na-achasi ike. N’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Epurel, ndị enyemaka Nwosu wakporo manịja ụlọ akụ dị n’Ibadan mgbe ọ fọrọ nke nta ka ụgbọala onye ọrụ ụlọ akụ ahụ sekọrịtara na kọnvọyị Nwosu, jiri ike egbe tie nwoke ahụ rue mgbe ọmaghịzị onwe ya. [4]

Na nzaghachi nke iyi egwu egwu nke straịk, na Febuwarị 1995, Nwosu nyere iwu ka emechie ụlọ ọrụ Mgbasa Ozi nke Oyo Steeti, ma chụọ ndị ọrụ niile nke ụlọ ọrụ ahụ. [5] Akwụkwọ akụkọ Septemba 1996 nke akwụkwọ akụkọ ndị Naịjirịa, "Tell "na "This Week" kwuru na Nwosu "mefuru nde naịra 16,875 ($ 214,000) n'onwe ya n'etiti Maachị 1995 na Maachị 1996" [6] [7]

Nsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Nigeria States. WorldStatesmen. Retrieved on 2010-01-13.
  2. MOSES AKAIGWE (January 20, 2007). Revisiting Kalu, Atiku’s expulsion. Daily Sun. Retrieved on 2010-01-13.
  3. Gbenro Adesina (December 19, 2008). Alaafin Is My Tenant —Soun. PM News. Archived from the original on 2009-02-09. Retrieved on 2010-01-13.
  4. Nigeria Human Rights Practices, 1995. U.S. Department of State (March 1996). Archived from the original on 2010-07-11. Retrieved on 2010-01-13.
  5. Suppression of press freedom in Nigeria. Constitutional Rights Project. 
  6. As Nigeria corruptions breaks out big time, George Ayittey supplies the reading list. University of Texas at Austin. Retrieved on 2010-01-13.
  7. Africa in chaos. Palgrave Macmillan.