Chukwuemeka Fred Agbata

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

  

Chukwuemeka Fred Agbata
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya10 Julaị 1979 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya24 Febụwarị 1993 Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụ̀nta ego, oko akuko ihe onyonyo Dezie
ebe agụmakwụkwọEkiti State University Dezie

Chukwuemeka Fred Agbata Jnr. (amụrụ n'ụbọchị iri nke ọnwa Julaị afọ 1979) nke a makwaara dị ka CFA bụ onye nta akụkọ Naijiria, onye ọchụnta ego teknụzụ, onye nkuzi azụmaahịa, ọkà okwu ọhanaeze na onye na-eme ihe ngosi telivishọn na ụlọ ọrụ Channels TV ebe ọ na-akwado ihe ngosi ihe ndị pụtara ọhụrụ na teknụzụ. Ọ bụkwa onye na-ede akụkọ nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi The Punch nke a na-akpọ ụlọ ọgwụ ICT (ICT Clinic). Ọ bụ onye so guzobe godo.ng, onye nduzi nke Innovation Support Network Hubs na onye nduzi Founder Institute Lagos, na onye guzobere CFAtech.ng.[1][2][3][4][5]

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Maazị Agbata bụ onye gụsịrị akwụkwọ na nkà mmụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya na Mahadum Ekiti Steeti dị na Ado Ekiti, Naịjirịa.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Agbata malitere ọrụ ya dị ka ọkachamara n'ire ahịa n'ụlọ ọrụ mgbasa ozi Globacom na Lagos, Nigeria site n'afọ 2003 ruo afọ 2007.

N'afọ 2015, Channels TV malitere igosi ihe ngosi ya Tech Trends (ihe ndị putara ọhụrụ na teknụzụ nke a na-egosi kwa Fraịdee niile ma o jiri ọkara gafee elekere isii nke abalị (GMT +1). Ihe ngosi ahụ na-elekwasị anya na ijide na ịkekọrịta usoro teknụzụ kachasị ọhụrụ, ngwaọrụ mmepụta ihe, ekwentị na ngwa PC, ya na ozi kwesịrị ekwesị nke ga-enyere ndị na-ekiri ekiri aka ịghọ ndị maara teknụzụ iji nwee ike iji teknụzụ rụọ ọrụ nke ọma.[6]

N'afọ 2015, ọ malitere ihe ngosi redio na Family Love Radio Network nke a na-akpọ Tech on Wheels ma na-egosi ya kwa Wenezde ma o jiri nkeji iri na ise gafee elekere ise (5.15pm) ruo mgbe o jiri ọkara gafee elekere ise (5.30pm) nke mgbede; na 97.7 Love FM Port Harcourt ọ na-eme ya mo jiri ọkara gafee elekere isii nke mgbede (6.30pm) ruo ihe fọdụrụ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asaa nke mgbede (6.45pm) na 104.5 Love FM Abuja, Ọ na-eme ya site na Mgbe o ji ọkara gafee elekere asaa nke mgbede (7:30pm) ruo mgbe ọ fọdụrụ nkeji iri na ise ka elekere asatọ nke abalị kụọ (7:45 pm).[7]

N'afọ 2018, o guzobere GoDoHub, ebe a na-amalite ọrụ nwere ụlọ ọrụ iji nyere ndị ọchụnta ego aka iji teknụzụ na ihe ọhụrụ malite ma na-arụ ọrụ ha.[8][9][10] e kpughere GoDoHub na Ikeja, isi obodo Lagos Steeti, n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba afọ 2018 site n'aka John Obaro nke SystemSpecs Nigeria Limited.[11][12]

N'ọnwa Machị afọ 2019, CFA ghọrọ onye nduzi nke The Founder Institute Lagos, ụlọ akwụkwọ ọzụzụ nke na-enyere ndị na-ekiri ebido aka itolite site na ọzụzụ gbasara ọchụnta ego inyere ha aka igbochi enweghị nhazi, ntụziaka na mmekọrịta.[13][14][15][16]

N'ọnwa Machị afọ 2019, ụlọ ọrụ iri asaa na ise na gburugburu Naịjirịa gbakọtara ọnụ iji guzobe njikọ aka na-ahụ maka ibuli ihe ọhụrụ na ichu nta ego.[17] Netwọk a, nke a na-akpọ Innovation Support Network (ISN) nwere CFA dị ka otu n'ime ndị nduzi ya.[18][19]

Ọ bụ onye otu ndị isi nke ise nke ndị nduzi na Nigeria Internet Registration Association

(NiRA), site n'afọ 2017 ruo ọnwa Eprel afọ 2019, ọ ghọkwara onye otu ndị nduzi nke isii.[20][21][22][23][24]

Ọ bụ onye na-akpọkọta nguzobe mkpakorita CFA, ụzọ dị mma maka nguzobe achumtaego SME n'aha ịchafụ ndị na-amalite amalite izute ma mụta ihe n'aka ndị ọchụnta ego ihe na-agara nke ọma, site na mkpakọrita ga-enyere ha aka ịzụlite mmalite ha dị iche iche ya na netwọkụ ibe ha. Ikpo okwu a nabatara ndị ọchụnta ego dị ka John Obaro, Ommo Clark, Obi Asika.[25][26][27] A na-akwado ya na Lagos, Naịjirịa.[28][29]

Nkwado[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa June afọ 2019, Swedish Institute k

kpọrọ CFAdị ka ọkachamara mba ụwa dị ka akụkụ nke Innovation Ecosystem Programme ha iji zute ndị guzobere na ndị ọchụnta ego maka mmalite nd a ma ama na nnukwu ụlọ ọrụ na-elekwasị anya na ịmepụta ihe ọhụrụ.[30][31][32]

N'afọ 2018, Consul General nke Federal Republic of Germany, Ingo Herbert kpọrọ ya ka ọ bụrụ akụkụ nke ndị ọka ikpe maka Falling Walls Lab Lagos nke mbụ nke bụ ncheta nke ọdịda nke Berlin Wall.[33][34]

N'afọ 2018, ọ bụụrụ onye mgbasa ozi na Deutsche Welle Global Media Forum (GMF) na Bonn, (Germany), ebe ọ tụlere ọrụ nke ndị nta akụkọ na-amalite amalite na usoro mgbasa ozi na-enweghị nnwere onwe.[35][36][37]

Ọ bụkwa onye ppanellistalongere onye bụbu Minista Mgbasa ozi nke Naijiria Frank Nweke Jnr, onye bụbu Mịnịsta Ime njem ụgbọelu Osita Chidoka, na Genesys Ignite Tech Conference nke Genesys Tech Hub haziri kwa afọ na Enugu, ebe ọ na-eduzi nnọkọ panel na mmepe na ihe ọhụrụ nke isi obodo mmadụ.[38][39][40][41] Slush Global Impact Accelerator, mmemme e mepụtara na njikọ aka nke Ministry n'ahụ maka ihe n'ebe na mbà ndị ọzọ nke Finland na ọtụtụ ndị mmekọ ndị ọzọ gburugburu ụwa na ebumnuche nke ịkwado mmalite mmetụta na igosi ohere azụmaahịa na-akpali akpali na ahịa na-apụta, họọrọ CFA dị ka otu n'ime ndị ọkàikpe na Naịjirịa maka ihe ịma aka 2018.[42][43]

N'afọ 2017, ọ bụụrụ nye na-eme mkparịta ụka na Genesys Ignite Tech Conference kwa afọ nke Genesys Tech Hub haziri na Enugu, tinyere Ommo Clark nke iBez Nigeria nakwa Obi Asika, mgbe Sen. Ken Nnamani (onye bụbu onyeisi ụlọ ọgbakọ omebe iwu Naịjiria ) kwuru nke a bụ isi okwu. [44] [45]

N'afọ 2014, CFA bụ onye nnọchiteanya na Nzukọ Ahịa Digital nke Naijiria nke emere na Lagos.[46]

Nturu Ugo[dezie | dezie ebe o si]

The Nigeria Internet Registration Association (NIRA) nyere CFA nturu ugo NiRA Presidential Award for Youth Development n'afo 2016.[47][48]

N'afọ 2015, ọ natara onyinye nke ịdị mma site n'aka ndị isi nke Naịjirịa na IT & Software Industry.[49][50]

N'afọ 2015, YNaija[51][52] kpọrọ ya otu n'ime mmadụ otu narị kacha nwee ọgụgụ isi na teknụzụ na Naịjirịa.

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ramoni. "Tech firm to give N10m to young entrepreneurs", Daily Trust, 15 December 2017. Retrieved on 14 June 2019.
  2. Tech Trends – Channels Television.
  3. "Swedish Institute Nominates CFA, Others", 18 June 2019. Retrieved on 18 June 2019.
  4. GLOBAL MEDIA FORUM in Bonn, Germany - Nigeria internet Registration Association (NiRA).
  5. Abubakar. "Two Nigerians Make Panelists at the Global Media Forum in Germany", 6 June 2018. Retrieved on 19 June 2019.
  6. Online Editor. "Tech Trends Goes Prime Time on Channels Television", The Guardian, 2 October 2015. Retrieved on 20 June 2019.
  7. Comms Week. "Tech on Wheels with CFA Debuts on Family Love FM Radio Network", Nigeria Communications Week, 21 June 2015. Retrieved on 20 June 2019.
  8. GoDo Hub launches in Lagos, to help Start-ups develop - Nigeria internet Registration Association (NiRA).
  9. Ogunfuwa. "GoDo.ng pledges support for start-ups", 2 October 2018. Retrieved on 14 June 2019.
  10. Adepoju. "New co-working space launched in Lagos", 8 October 2018. Retrieved on 19 June 2019.
  11. Okonji. "GoDo.ng Facility for Startup Development Debuts", 11 October 2018. Retrieved on 19 June 2019.
  12. Ozakpo. "Check out the GoDo.ng Facility for Start-up Development Unveiled by John Obaro", 4 October 2018. Retrieved on 19 June 2019.
  13. Akinpelu. "Pre-Seed Startup Accelerator, Founder Institute Launches Lagos Chapter", 19 March 2019. Retrieved on 20 June 2019.
  14. Silicon Valley-based Founder Institute Launches Newest Chapter in Lagos, 3 Centres, 20+ CEOs as Mentors …Startup Launch Program Aims to Launch over 20 Global Technology Companies Yearly in Lagos (19 March 2019).
  15. Eleanya. "Founder Institute targets pre-fund start-ups as it launches in Nigeria", 28 March 2019. Retrieved on 20 June 2019.
  16. Ajeamo. "Founder Institute berths in Lagos", 27 March 2019. Retrieved on 20 June 2019.
  17. Anonymous. "75 hubs form alliance to boost innovation, entrepreneurship", 31 March 2019. Retrieved on 20 June 2019.
  18. Coleman. "75 Hubs Form Alliance To Boost Innovation, Entrepreneurship", 31 March 2019. Retrieved on 20 June 2019.
  19. Akinyode-Lawal. "Innovation Support Network Hubs berths to support entrepreneurship", 15 April 2019. Retrieved on 20 June 2019.
  20. Igata. "NIRA ELECTS NEW LEADERS, NWEKE, AGBATA ARE DIRECTORS", 2 May 2017. Retrieved on 20 June 2019.
  21. NiRA 2017 AGM Highlights - Nigeria internet Registration Association (NiRA). Archived from the original on 2019-06-20. Retrieved on 2023-06-30.
  22. NiRA 5TH EXECUTIVE BOARD - Nigeria internet Registration Association (NiRA). Archived from the original on 2019-06-20. Retrieved on 2023-06-30.
  23. MobileWorld. "Muhammed Rudman Emerges New President of NiRA", 3 May 2019. Retrieved on 20 June 2019.
  24. IT Realms. "Rudman, Obaniyi emerge President, VP @NIRA – ITREALMS", 30 April 2019. Retrieved on 20 June 2019.
  25. Akinyode-Lawal. "'Tech start-ups shouldn't be restricted to Nigeria' – Obaro", 28 November 2016. Retrieved on 19 June 2019.
  26. Essiet. "I started business in the varsity", The Nation, 19 July 2017. Retrieved on 19 June 2019.
  27. Oluka. "Ojoma, Obi at CFA Startups Hangout Identify Success Paths in Creative Industry", 7 September 2018. Retrieved on 19 June 2019.
  28. Essiet. "Turning adversity into prosperity", The Nation, 23 August 2017. Retrieved on 19 June 2019.
  29. Afolayan. "Two Portharcourt-Based Startups Win at CFA's Startups Hangout Pitch Session", 28 November 2017. Retrieved on 19 June 2019.
  30. International experts meet the Swedish innovation ecosystem (11 June 2019).
  31. "Swedish Institute Nominates CFA, Others", 18 June 2019. Retrieved on 18 June 2019.
  32. Onwuaso. "Swedish Institute Nominates CFA, Osibona & Others as Part of the 2019 Innovation Ecosystem Programme", Nigeria Communications Week, 11 June 2019. Retrieved on 18 June 2019.
  33. Adepoju. "Chukwuemeka Fred Agbata (CFA) joins Falling Walls Lab Lagos' jury", 23 March 2018. Retrieved on 18 June 2019.
  34. Oluka. "German Consulate Invites CFA As Jury For Falling Walls Lab Lagos", 21 April 2018. Retrieved on 18 June 2019.
  35. Abubakar. "Two Nigerians Make Panelists at the Global Media Forum in Germany", 6 June 2018. Retrieved on 19 June 2019.
  36. Announcements. "FNF at Deutsche Welle Global Media Forum 2018 Watch a series of interviews on journalistic start-ups in illiberal media ecosystems", 14 January 2019. Retrieved on 19 June 2019.
  37. GLOBAL MEDIA FORUM in Bonn, Germany - Nigeria internet Registration Association (NiRA).
  38. Anonymous. "Genesys Ignite to revolutionise ICT start-ups ecosystem", The Sun, 28 November 2018. Retrieved on 19 June 2019.
  39. Reporter. "Genesys Tech Hub gives $30,000 to start-ups", The Nation, 26 November 2018. Retrieved on 19 June 2019.
  40. Okonji. "Firm to Boost Software Revolution, Grows Talents", 29 November 2018. Retrieved on 19 June 2019.
  41. Onwuaso. "Genesys ignite pledges technological revolution in Nigeria", The Guardian, 7 December 2018. Retrieved on 19 June 2019.
  42. Akinpelu. "Drone Startup, Arone and 2 Others to Represent Nigeria at the Slush Global Impact Accelerator 2018", 4 September 2018. Retrieved on 20 June 2019.
  43. Suleiman. "Arone, Gerocare, and Afagreen Selected to Represent Nigeria at the Slush Global Impact Accelerator", 4 September 2018. Retrieved on 20 June 2019.
  44. Youdeowei. "Over 1000 start-ups jostle for GenesysIGNITE's $30,000", 18 December 2017. Retrieved on 19 June 2019.
  45. Ekwealor. "Everything that happened at the Genesys IGNITE South-East Startup Convergence 2017", 18 December 2017. Retrieved on 19 June 2019.
  46. Asuquo. "Nigerian Businesses urged to embrace Digital Marketing", 10 October 2014. Retrieved on 20 June 2019.
  47. Nkem-Gbemudu. "Mary Uduma, others awarded at 2016 NiRA awards ceremony", 4 April 2016. Retrieved on 20 June 2019.
  48. Nigeria Targets South Africa's One Million Internet Domain Names (4 April 2016).
  49. Comms Week. "Nigerian Top Executives Honour CFA", Nigerian Communications Week, 26 March 2015. Retrieved on 20 June 2019.
  50. Anonymous. "IT & Software Industry 2015: CFA bags another award of excellence", 27 March 2015. Retrieved on 20 June 2019.
  51. Olapoju. "The class of 2015: Nigeria's 100 most innovative persons in Technology", 16 March 2015. Retrieved on 20 June 2019.
  52. Anonymous. "YNaija honours CFA, 99 others for being innovative in technology space", 4 March 2015. Retrieved on 20 June 2019.