Clem Ohameze

| Ụdịekere | nwoke |
|---|---|
| Mba o sị | Naijiria |
| Aha enyere | Clem |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 27 Jụn 1965 |
| Ebe ọmụmụ | Port Harcourt |
| Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, Nigerian Pidgin |
| Ọrụ ọ na-arụ | omee |
| Ụdị ọrụ ya | theater arts |
| Ebe agụmakwụkwọ | University of Port Harcourt |
| Ogo mmụta | bachelor's degree, nzere masters |
| Oge ọrụ ya (mmalite) | 1995 |
| Ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
| Ụcha ime anya | brown |
Clem Ohameze bụ onye na- eme ihe nkiri na Naịjirịa nke nọ goro afọ iri abụọ n'ịrụ ọrụ ahụ. [1] Clem Ohameze malitere ọrụ nkaa na afọ 1995. Mana ọrụ aka ya chapuu na 1998 mgbe ọ gosipụtara ihe nkiri eji nnukwu ego mee akpọrọ ENDTIME. [2] O meela ihe karịrị ihe nkiri narị ise n'ime afọ iri abụọ bido na 1995 ruo taa. Enwere olile anya na ọ ga ewepụta ọtụtụ fim ọzọ na ọnwa ndị na-abịa. [3]
Nzụlite
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Clem Ohameze na 27 June 1965 na Port Harcourt, Rivers, Nigeria . Ọ gara Holy Family College / Baptist High School maka akwụkwọ sekọndrị ya. Ọ gakwara n’ihu mụọ akwụkwọ na Institute of Management Technology, Enugu, Nigeria ebe ọ nwetara Ordinary National Diploma na Mass Communication [4] wee gaa Mahadum Port Harcourt nke bu ebe ọ gụsịrị akwụkwọ na BSc na Sociology na Anthropology na 1989. Ọ kwụsịghị ebe ahụ. Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Buckingham, London na 2010 wee nweta Masters na Mgbochi Ọrịa .
Ọrụ ihe nkiri
[dezie | dezie ebe o si]Ohameze bụ onye otu Actors Guild of Nigeria. Ọ pụrụ na iime ihe nkiri na obere oge ime n'etiti 2006 wee ruo 2010 iji chụsoo ọdịmma ya ndị ọzọ gụnyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo. Ọ laghachila azụ n'ọrụ nkiri ya. [5] N'afọ 2010, Ohameze so na ihe nkiri nke turu ugo nke aha ya bu gbara egwu na fim a na-enweta na ntanetị bụ Ije: The Journey ya na Genevieve Nnaji na Omotola Jalade Ekeinde .
Ndọrọ ndọrọ ọchịchị
[dezie | dezie ebe o si]Ohameze guzo n'ihi ntuli aka maka nnọchite anya ndị Ohaji-Egbema-Oguta Federal constituency na Naijiria na ụlọ nzukọ Federal House of Representatives na 2007. O guzoro ndi otu Peoples Democratic Party (PDP). Agbanyeghị, akọrọ akụkọ ebubo na ọ hapụrụ nchụso ndọrọ ndọrọ ọchịchị maka iyi egwu nke ndụ ya. A wakporo ụgbọ ala ya, ma gbaguo nwanne ya nwoke n'oge ihe a mere. [6] Ohameze kwagara na obodo London, United Kingdom. O bu n’obi ịsọ mpi maka nhọpụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ n’afọ 2015. [7] [8]
Nrụtụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ "Clem Ohameze battles for The Kingdom". Vanguardngr.com. 2012-10-27. Retrieved 2013-09-21.
- ↑ "Clem Ohameze Makes Nollywood Comeback With Eucharia Anunobi, Others In The Kingdom". nigeriafilms.com. 2012-11-03. Archived from the original on 2013-09-21. Retrieved 2013-09-21.
- ↑ "Photos: Meet Clems Ohameze, The Nigerian Legend Who Does Not Joke With His "Blood Money" Roles In Movies- See How He". 2020-04-25. Archived from the original on 2020-10-13. Retrieved 2020-05-26.
- ↑ Suleiman, Taiye (2008-04-07). "Nollywood Photo Blog: Pictorial Glance at Clem Ohameze of Nollywood".
- ↑ Izuzu, Chidumga. "#ThrowbackThursday: Watch Clem Ohameze, Olu Jacobs, Zack Orji in End Time" (in Bekee ndị America). Archived from the original on 2017-07-06. Retrieved 2020-08-25.
- ↑ "Clem Ohameze attacked". www.mjemagazine.com. 26 November 2011. Archived from the original on 2013-09-21. Retrieved 2013-09-19.
- ↑ "My Car was Attacked,My cousin killed and My Driver Escaped with a Bullet - Nollywood Actor Clems Ohameze". 2011-11-26. Archived from the original on 2013-09-21. Retrieved 2017-02-21.
- ↑ "Clem Ohameze battles for The Kingdom - Vanguard News". 2012-10-27. Retrieved 2017-02-21.