Code of Silence (2015 film)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Code of Silence bụ ihe nkiri Naijiria nke afọ 2015 nke Emem Isong duziri ma bụrụ Bola Aduwo dere . Ọ bụ Royal Arts Academy na mmekorita ya na Nollywood Workshop mere ihe nkiri a . Ọ gosipụtara Makida Moka na agwa ngosipụta dị ka Adanma, Patience Ozokwor, Ini Edo and Omoni Oboli . Ọ bụ ihe a ma ama maka nkwụsi ike ya megide ndina n'ike na Nigeria ma na-ekwu okwu gbasara ndị a na-edina n'ike na mba ahụ .

Atụmatụ akụkọ[dezie | dezie ebe o si]

Adanma, nwa akwụkwọ ahụike na-eto eto, nwere ọgụgụ isi nke nwere atụmanya ọrụ, bụ otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị obodo na onye enyemaka ya dara n'ike mgbe ọ na-ala kọleji. Ọ na-ekwupụta ihe mere ezinụlọ ya, mana n'ihi ọnọdụ enweghị ọnụ ha na ọha mmadụ, ọ na-atụ egwu ịgwa ndị okwesiri [1] N'ike n'ike mmebi ndinam n'ije metụtara Adanma n'ụzọ mmetụta uche na nke mmetụta echiche, na ahụmahụ na-akpasu iwe ma malitere imetụta ndụ ya dum.

Ndị nsonye[dezie | dezie ebe o si]

Mmepụta[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ Royal Arts Academy na mmekorita ya na Nollywood Workshop mepụtara Code of Silence . Ihe ngosi nke abụọ Emem Isong mere, o kwuru maka ebumnuche ya ime ihe nkiri a bụ: "Mgbe ụfọdụ, m na-eme ihe nkiri nkwado na code of silence bụ otu n'ime ihe nkiri ndị dị otú ahụ. Ekpebiri m ime ihe nkiri banyere idina mmadụ n'ike iji gwa ndị mmadụ ka ha pụta na-ekwu 'Mba' gbasara ndinam n'ike. Ka anyị kwụsị ịgbachi nkịtị. Anyị chọrọ imebi echiche ahụ na onye edi ara n'ije kpatara nke a. Akụkọ ahụ chọtara m n’ezie n’ihi na enyi m wetara m akụkọ ahụ, mgbe m gụrụ ya, achọpụtara m na m nwere nke ọma. Ọ bụ ihe nkiri mmefu ego nde iri abụọ. Ekpebiri m ịrụ ọrụ na nkedo ndị a n'ihi na mụ na ọtụtụ n'ime ha arụkọla ọrụ, enwere m mmetụta na ha ga-akọwa ọrụ ndị ahụ nke ọma."

Onye na-eme ihe nkiri na onye nlereanya Makida Moka hụrụ na ọ na-ime ihe nkiri a ka ọ bụ ahụmahụ siri ike, nke kpasuru ya iwe ruo n'ókè na anya mmiri na-agbakarị ya mgbe e wepụrụ ihe nkiri. [2]

nnabata[dezie | dezie ebe o si]

Ngosi mbụ ihe nkiri a na abalị asatọ nke ọnwa ọgọstụ, 2015 na Silverbird Galleria, Victoria Island, Lagos, nke tinyere mmemme ndị ome ihe nkiri ụlọ ọrụ Nollywood bịara nke oma.[3] ihe nkiri a natara nkwutọ. EderedeToni Kan, nyereNigeria Entertainment Today gosipụtara Na ihe nkiri n'eme njem ebe dị anya ikpoghachite mmetụta nke n'eme ndị ometutara na ezinụlọ ha igbachi nkịtị mgbe ndina n'ike mere", ma gwasikwa onye ọ bụla ike gbasara ya. Ọ na-akọwa ihe obodo n'etiti mgbe awakporo nwanyị n'ike, mgbe anyị mechiri ọnụ gbasara ya ma otú ọ si kwesi nwoke inwe nkwanye Ugwu onwe ya hapụ inara aha nleda anya dị ka onye nwakpo n'ike". Agbanyeghị mmetụta mwakpo n'ije a, Kan kọwaa na ọ gaghị itinye ohere ntọ ọchị.[4]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. Movie starring Desmond Elliot, Ini Edo, Patience Ozokwor to hit cinemas in August. Pulse (27 August 2015). Retrieved on 22 September 2016.
  2. Being short has worked for me – Makida Moka. Punch (14 February 2016). Retrieved on 22 September 2016.
  3. Emem Isong makes case for rape victims in 'Code of Silence'. Vanguard (15 August 2016). Retrieved on 22 September 2016.
  4. Kan, Toni (17 August 2015). 'Code of Silence' tackles rape…with doses of humour – By Toni Kan. Nigeria Entertainment Today. Archived from the original on 18 August 2015. Retrieved on 22 September 2016.