Emem Isong

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Emem Isong
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoEmem Isong Dezie
Aha ọmụmụEmem Isong Dezie
Aha enyereEmem Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20. century Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-emeputa ihe nkiiri, onye nhazi ederede, onye nhazi ndu ihe nkiri Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Calabar, Federal Government Girls College, Calabar Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaCatholicism Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
webụsaịtịhttps://www.youtube.com/@EmemIsongTV Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Emem Isong bụ onye na-ede, na-emeputa ma na-edozi ihe nkiri na Naijiria. A maara ya nke ọma maka oru ya gbasara ihe nkiri na asụsụ bekee. Ihe ọrụ ndozi ya nke abuo, Code of Silence, nke gbasara ndina n'ike umu nwaanyi na Nigeria, wepụtara na 2015.

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

Emem, onye si Ikono Lokal Gọọmentị na Akwa Ibom State amụrụ na 5 Septemba, bụ nwa mbụ na ezinụlọ ma nwee ụmụ anọ nke omuru amu.[1] O natara asambodo ogo ọmụmụ nke ihe nkiri na Mahadum Calabar ma nakotara diplọma na sayensị kọmputa site na Computer Science Institute (NCR). [2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Na-afọ 1994 ka Emem bidoro ọrụ nke ihe nkiri. Mgbe ahụ ka o dere ma nyere aka meputa ihe nkiri nke Jezebel. Na-afo 1996 ka naanị ya meputara Breaking point. Na-esote ọnwa asato, ya na Remmy Jez rụgidere orụ dịka onye na-emepụta ihe nkiri na oru ya. mgbe ọ kpebiri ịkwụsị mmekọrịta ha na 2008 ka ọ na-ewepụta ihe nkiri nke Reloaded.

Odeela ma ọ bụ mepụta ihe nkiri dịka Reloaded, Breaking Point, She Devil, A Minute To Midnight, Play Boy, Sin Sin, Master Stroke, Rumors, Shattered Illusion, naPromise Me Forever na Emotional Crack (2003),[3] nke ikpeazụ ya ka egosiri na mmemme African Film Festival na New York City.[4] A makwaara ya nke ọma maka mmepụta ihe nkiri n'asụsụ Yoruba ma bụrụkwa onye kachasị ewu ewu na ụlọ ọrụ ahụ.[5]

Ihe nkiri ọbụla Emem Isong tinyere aka bukwara ama ama maka ịnye ohere ma ịbụputa ndị ọrụ ihe nkiri ohụụ gunyere Stephanie Okereke, Dakore Egbuson na ndị ọzọ.[6]

Na 2014 Isong duziri ihe nkiri mbụ ya bụ Champagne, nke mere ngosi nke mbụ na Silverbird Galleria na Victoria Island, Lagos.[7] N'ọnwa Ọgọstụ 2015, ọ wepụtara ihe nkiri Code of Silence, ihe nkiri ya nke abụọ ahaziri nke ọ rụpụtara, na mmekọrita ọrụ ya na Royal Arts Academy na Nollywood Workshop, otu NGO mba ụwa na-achọ ịgba ume mgbanwe n'etiti ọha mmadụ site na iji ihe nkiri.[8] Ihe nkiri a, nke metụtara ịdina nwaanyị n'ike na Naijira, gosiri ndị ọrụ ihe nkiri dika Makida Moka, Patience Ozokwor, Ini Edo, na Omoni Oboli.[9]

Amamịghe Emem Isong nwere na ụlọ ọrụ ihe nkiri enyekwara ya ohere ka a họrọ ya dịka onye ga-ekwuchitere ha na usoro Afrinolly masterclass ma bụrụkwa ọkaikpe maka ihe nkiri MTN Afrinolly na 2013.[10] Na fim ya Emem Isong na-agbasi mbọ ike ime ka ndị na-ege ntị nwee obi ụtọ [11]

Ihe Nlekọta[dezie | dezie ebe o si]

E depụtakwala aha Emem dị ka onye na-eme ihe na New Nollywood nke ndị na-eme fim na-abụghị naani i nwe mmasị na-emepụta fim, ma na-emepụta fim ndị a pụrụ iche ndị nke baara ụba na nkà. Ọ bụghịzi maka nrụpụta maka mmepụta sọsọ, kama ọ bụ maka mmepụta maka nka. Ntughari a site na imepụta vidio a na-elele na-ụlọ na ikiri ya na sinima bụkwa ụdị nke usoro Ne Nollywood a.[12][13]

Amakwaara Emem Isong maka ọrụ ya na iguzọbe Royal Arts Academy na 2010 yana ọrụ ya dị ka onye isi ụlọ ọrụ ahụ. Royal Arts Academy nke ọ malitere yana Uduak Oguamanam, Anietie Isong, na Monalisa Chinda, dị na Surulere, Legos steetị, Naijria.[14] Ulo akwukwo a raara onwe ya maka imeputa umu akwukwo ndi na-aghaghi ime mpi na okacha amara na ụlọ oru ihe nkiri Naijiria, kamakwa n’ime ụlọ ọrụ ihe nkiri mba ndị ọzọ.[15][16] Ewezuga ịkụziri ụmụ akwụkwọ ihe ha kwesịrị ima maka ịmalite ọrụ na ụlọ ọrụ ihe nkiri, ụlọ ha na-enyekwa ụmụ akwụkwọ ohere iji nweta ego iji nyere ha aka ịmalite ọrụ ha site na imepụta fim ndị ọha na eze nwere ike ịhụ.[17]

Ndụ ya niime[dezie | dezie ebe o si]

A maara Emem Isong dị ka onye zoro ezo ma na-ahọrọ ịnọkarị na anya ọha, ọ naghị enyekarị ajụjụ ọnụ. Nke a, dị ka ya si kwuo, ọ bụ n'ihi na ọ chọrọ ka ọrụ ya rie uru naanị ya na-enweghị okwu gbasara ndụ ya na-emetụta ndị na-ekiri ya.[18] Kaosinadị, Isong lụrụ Misodi Akama[7] onye ọ mụrụ ejima na 2016.[19] O nwekwara nwa nwoke site na nmekorita ya na onye ọzọ na-mbu.[20]

Ndetu ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Ihe nkiri ihe nkiri Emem Isong gụnyere: [21]

Ihe nkiri emepụtara[dezie | dezie ebe o si]

Aha Fim Afọ emepụtara ya Release
Special Jollof 2020
Ayamma 2016
Don't Cry For Me 2015
Apaye 2014
Knocking on Heaven's Door 2014
Forgetting June 2013
Silver Lining 2012
I'll Take My Chances 2011
Kiss and Tell 2010
Bursting Out 2010
Holding Hope 2010
Memories of War 2010
Edikan 2009
Reloaded 2008
A Time To Love 2007
Unfinished Business 2007
Yahoo Millionaire 2007
Games Men Play 2006
Traumatised 2006
Behind Closed Doors 2005
Darkest Night 2005
Endless Lies 2005
Games Women Play 2005
Girls in the Hood 2005
I Feel U 2005
Men Do Cry 2005
Critical Decision 2004
For Real 2004
Masterstroke 2004
Promise Me Forever 2004
Private Sin 2003
Breaking Point 1996
Jezebel 1994

Ihe nkiri edere[dezie | dezie ebe o si]

Aha Fim Afọ mmepụta
I'll Take My Chances 2011
Bursting Out 2008
Heartbeats 2008
Reloaded 2008
A Time to Love 2007
Unfinished Business 2007
Yahoo Millionaire 2007
Games Men Play 2006
Blind Obsession 2005
Darkest Night 2005
Fragile Pain 2005
I Feel U 2005
Enslaved 2004
Promise Me Forever 2004
Emotional Crack 2003
Jezebel 1994

Ihe nkiri eduziri[dezie | dezie ebe o si]

Aha Fim Afọ mmepụta
Champagne 2014
Code of Silence 2015

Onyinye na nhoputa[dezie | dezie ebe o si]

Onyinye nsọpụrụ nke Emem Isong nwetara gụnyere:[22][23]

  • ZAFAA Awards, in the category of Best Producer for the movie Memories of my Heart (2010)
  • Wow Divas, Outstanding Contribution to Raising Awareness, Understanding and Hope to those Affected by Autism Spectrum Disorder and Advocating for them through her movie Silver Lining(2012)
  • Eloy Awards, Best Movie Producer of the Year for I’ll Take My Chances (2011)
  • Best of Nollywood, Special Recognition Award;
  • Ntanla Awards, Industry Merit Awards.
  • Nigeria’s Integrity Film Awards(HomeVida) in the category Family/Child Friendly Category for the movie Knocking on the Heavens Door (2014)
  • Africa Movie Awards in the category of Best Scriptwriter for the movie Reloaded (2008)
  • City Peoples Award in the categories of Best Producer of the Year, and Best Screenplay for the movie Reloaded (2008)

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. iROKOtv Nollywood Icon Birthday: Emem Isong. Archived from the original on 10 August 2018. Retrieved on 17 October 2016.
  2. Emem Isong. Retrieved on 16 November 2016.
  3. Heterosexual Africa?: The History of an Idea from the Age of Exploration to the Age of AIDS. Ohio University Press. 
  4. Emem Isong Biography/ Profile. Nigeria Movies Review. Archived from the original on 8 September 2016. Retrieved on 22 September 2016.
  5. Nollywood Central. Palgrave Macmillan. 
  6. (2012) "The Video Closet: Nollywood's gay-themed movies". Transition (107): 32–49. 
  7. 7.0 7.1 Cute Couple! Emem Isong & Hubby Misodi Akama for ‘Champagne’ Movie Premiere. Bella Naija. Retrieved on 22 September 2016.
  8. Emem Isong. Archived from the original on 4 November 2016. Retrieved on 17 October 2016.
  9. Emem Isong makes case for rape victims in ‘Code of Silence’. Vanguard. Retrieved on 22 September 2016.
  10. Afrinolly MasterClass Series With Charles Aniagolu and Emem Isong. Retrieved on 16 October 2016.
  11. Emem Isong Biography/ Profile. Archived from the original on 2017-06-03. Retrieved on 2020-11-28.
  12. (1 January 2014) "Close-Up:Nollywood—A Worldly Creative Practice: "New Nollywood":Kunle Afolayan". Black Camera 5 (2): 53–73. DOI:10.2979/blackcamera.5.2.53. 
  13. (1 March 2014) "Nigerian Videos in the Global Arena: The Postcolonial Exotic Revisited". The Global South 7 (1): 157–178. ISSN 1932-8656. 
  14. Emem Isong opens acting academy. Retrieved on 17 October 2016.
  15. About Us. Archived from the original on 14 October 2016. Retrieved on 17 October 2016.
  16. Emem Isong's Royal Arts Academy To Improve Film-Making in Nigeria. Retrieved on 17 October 2016.
  17. Royal Arts Academy spotlights Film Contest and Awards. Retrieved on 17 October 2016.
  18. "Emem Isong opens up on her private life…Why I’m not married". Retrieved on 17 October 2016.
  19. Nollywood Producer Emem Isong & her Twins in New Adorable Photos. Bella Naija. Retrieved on 22 September 2016.
  20. Movie producer pour encomium on son as he turns 8. Retrieved on 4 November 2016.
  21. Emem Isong. Retrieved on 17 October 2016.
  22. Star of the Week: Emem Isong. Retrieved on 17 October 2016.
  23. Winners. Archived from the original on 4 November 2016. Retrieved on 17 October 2016.