Cynthia Uwak

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Cynthia Uwak
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
Aha enyereCynthia Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Julaị 1986 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Akwa Ibom Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụichegaa n'ihu Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie
so na2008 Summer Olympics, 2007 FIFA Women's World Cup Dezie

Cynthia Uwak (a mụrụ n'ụbọchị nke 15 n'ọnwa Julaị nke afọ 1986 n'Akwa Ibom Steeti ) bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbara Åland United bọọlụ ugbua na Naisten Liiga na Fịnland.

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Ahụmahụ mbụ Cynthia Uwak nwere n'ịgba bọọlụ dụ ya n'ụmụ nwoke n'okporo ámá nke obodo ya. Nne ya kwadoro ya ị chụso ị gba bọọlụ, o were nwee ike ijikọ egwuregwu bọọlụ na agụmakwụkwọ ya. [1]

Ọrụ ị gba bọọlụ[dezie | dezie ebe o si]

Klọb[dezie | dezie ebe o si]

Cynthia Uwak malitere ọrụ klọb ya n'akụkụ KMF ụmụ nwanyị Finnish, ma rụọkwa ọtụtụ ọrụ klọb ya na Scandinavia ma e wezụga nke France na Germany. [1] O so n'òtù Olympique Lyonnais nke meriri na Division 1 Féminine na France n'afọ 2009. [2] Mgbe ọ kwagara n'akụkụ Aland United nke Finnish, o meriri mmeri Naisten Liiga ọzọ n'afọ 2013, bụrụkwa onye kachasị nye goolu n'asọmpi ahụ.

Mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụkwa onye otu egwu bọọlụ Naịjirịa . Uwak gbara asọmpi 2008 Summer Olympics[3] nakwa 2007 FIFA Women's World Cup.

Ọ soghị ndị otu egwuregwu nke 2010 African Women's Championship na Saụt Afrịka n'ihi mmerụ ahụ. Onye nkuzi Eucharia Uche kwuru n'oge ahụ na nke a agaghị apụta na a ga-ahọpụ ya n'otù 2011 FIFA Women's World Cup n'afọ na-esote. [4] Kaosiladị, mgbe a kpọpụtara ndị otu egwuregwu iko mba ụwa, akpọghị Uwak aha. E nweghi ihe pụrụ iche e kwuru kpatara mwepụ ya, na nkwupụta izugbe na-ekwu "Onye nchịkwa ahụ a hụrọla ndị egwuregwu nwere ike ịme mba mpako na World Cup na Germany". [5]

A tụlere ya maka ịlaghachi na otu egwuregwu Naijiria site n'aka onye nchịkwa Florence Omagbemi n'afọ 2016 maka Africa Women Cup of Nations na Kameruun. Onye nkuzi a na-ele nnọchịte ndị otu egwuregwu bọọlụ na-ịgba mbọ iji bulie ohere otu ahụ n'egwuregwu ahụ. [2]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Uwak ekwuola okwu megide echiche ahụ na ụmụ nwanyị niile na-agba bọọlụ bụ ndị mmekọ nwanyị na nwanyị ; "i kwu n'ụmụ nwanyị na-agba bọọlụ bụ nwanyị nwere mmasị na nwanyị bụ ihe mwute. Ị nweghị ike ịkpọ ndị mmadụ aha dị aṅaa dabere n'echiche gị. " [6]

Nrite[dezie | dezie ebe o si]

Klọb[dezie | dezie ebe o si]

Mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

  • African Championship (2): 2004, 2006 [2]

Nke onwe[dezie | dezie ebe o si]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 My mother encouraged me to play football – Uwak. Monty Entertainment. Retrieved on 15 November 2016.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 "Nigeria: Cynthia Uwak, Oluehi, Uchechi May Return to Super Falcons". Retrieved on 15 November 2016.
  3. Cynthia Uwak Biography and Statistics. Sports Reference. Retrieved on 14 October 2009.
  4. CYNTHIA UWAK not ruled out of World Cup. All Nigeria Soccer (18 November 2010). Retrieved on 15 November 2016.
  5. "Nigeria omit Cynthia Uwak from World Cup squad", 14 June 2011. Retrieved on 15 November 2016.
  6. Cynthia Uwak: "Female Footballers Are Not Lesbians". 360 Nobs. Retrieved on 15 November 2016.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]