Donald Trump

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Wuá ébé: otú uzọr, chọwa
Donald Trump (2017)

Donald John Trump (onye a mụrụ na Juun 14, 1946) bụ presidenti nke iri anọ na anọ nke obodo United States, na-arụ ọrụ kemgbe Jenụwarị 20, 2017. Tupu ya abanye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ bụ onye ọchụnta ego na onye telivishọn.

A mụrụ Trump na obodo Nú Yọk na mpaghara Queens. Ọ gara Wharton School of the University of Pennsylvania ebe ọ gụrụ Economics. Onye ahia nke ọgbọ atọ, Trump sooro nzọụkwụ nke nne nne ya bụ Elizabet na nna ya Fred na-elekọta azụmahịa ezinụlọ ha. Ọ mere nke ahụ site n'afọ 1971 wee ruo mgbe ọ ghọrọ onyeisi oche na Jenụwarị 2017, mgbe o tinyere ụlọ ọrụ ahụ n'aka ụmụ ya ndi nwoke bụ Donald Jr ya na Eric. Ọrụ azụmahịa Trump bụ ihe gbasara i rụ ma ọ bụ I rụghari ụlọ ọrụ ọfịs, ụlọ nkwari akụ, ụlọ ịgba chaa chaa, na golf. Ọ jiri aha ya wee bido ihe ndi uzo di iche iche. Trump edeela ọtụtụ akwụkwọ, gụnyere Art of Deal, ma na-emepụta na kwado ihe ngosi telivishọn bụ The Apprentice nke nọgoro afọ iri na abụọ. Trump bụ nwoke 544 kasị baa ọgaranya n'ụwa ka ọ na - erule afọ 2017, nke nwere atụmatụ akụnụba nke ijeri $ 3.5. Ọ meriri Hillary Clinton na nhoputa ndi presidenti nke afo 2016.

Lee nke ozo[mèzi | edit source]