Emamode Edosio

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Emamode Edosio
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoEmamode Edosio Dezie
Aha ọmụmụEmamode Edosio Dezie
Aha enyereEma Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20. century Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye nhazi ndu ihe nkiri, filmmaker, music video director, onye nhazi-foto Dezie
ụdị ọrụ yatheater arts Dezie
onye were ọrụHip Hop TV, Ebonylife TV Dezie
Ọkwá o jionye nchikota akuko Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Olabisi Onabanjo, New York Film Academy, Federal Government College Odogbolu, Loral Nursery and Primary School, Festac town, Lagos, Motion Picture Institute Dezie
ogo mmụtaBachelor of Science Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2013 Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ọrụ ama amaKasala Dezie
asụsụ eji dee ọrụBekee Dezie
webụsaịtịhttps://www.emaedosio.com Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie
Emamode Edosio

Emamode Edosio, Onye a maara dịka Ema, bụ onye na-eme ihe nkiri na onye nduzi ihe nkiri na Naijiria.[1][2] O nwetara nzere bachelọ nke sayensị (Bsc) na sayensị kọmputa na Mahadum Ogun Steeti . Ọ gụrụ ihe nkiri dijitalụ na New York Film Academy (NYFA) na ihe nkiri na Motion Pictures Institute nke Michigan, United States. O nwetara ihe nkiri kacha mma na onye nduzinke afọ site na onyinye sisterhood.[2]

N'afọ 2013, ọ laghachiri Naịjirịa. Ọ rụrụ ọrụ na ụlọ ọrụ mmepụta ihe nkiri dị ka 66 Dimension na 2007. Mgbe e mesịrị, ọ rụrụ ọrụ na Hip Hop TV, Clarence Peters na Capital Dreams Pictures, EbonyLife TV na dịka onye nchịkọta akụkọ na BBC. Ema laghachiri ụlọ akwụkwọ na Abuja iji mụtakwuo ihe nkiri. O meela ọtụtụ ihe nkiri dịka “” Joy Ride’, “Ochuko’ ma duzie Kasala.

Mmalite ndụ na ọrụ agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Edosio n'ụlọ ndị nke Kraịst. Ọ bụ nwa nke atọ n'ime ụmụ asaa n'ezinụlọ ahụ. Nna ya bụ onye lara ezumike nká na nne ya bụ onye ọka iwu. Ọ malitere agụmakwụkwọ ya na Loral Nursery and Primary School, Festac town, Lagos mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gara Federal Government College, Odogbolu ruo afọ ole na ole wee gụchaa agụmakwụkwọ sekọndrị ya na S-tee Private Academy, Festac Town .

O nwetara BSc na sayensị kọmputa na Mahadum Olabisi Onabanjo, tupu ọ gaa mụọ ihe nkiri dijitalụ na NYFA na ihe nkiri na Motion Picture Institute of Michigan .[3]

Ọrụ ọkachamara[dezie | dezie ebe o si]

Ọ laghachiri Naịjirịa n'afọ 2013 mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na US.[3] Na Naịjirịa, Ema rụrụ ọrụ na 66 Dimension, Hip Hop TV, Clarence Peters na Capital Dreams Pictures, Ebonylife Tv na BBC. Dị ka onye nduzi, Ema esorola ndị omenkà ama ama dịka TuFace, 9ice, Lord of Ajasa, Terry da Rapmanand na ọtụtụ ndị ọzọ.[1] A na-akpọ ọrụ mbụ ya na Ebonylife Tv "Heaven"[3]

Ema na mgbasa ozi 2018

Leekwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta nke ndị na-emepụta ihe nkiri Naịjirịa
  • Ndepụta nke ndị na-ese ihe nkiri na Naijiria

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 I've Done All Sorts To Learn From Men - Ema Edosio. Nigerian Film.com. Retrieved on 20 March 2017.
  2. 2.0 2.1 Ade-Unuigbe. BN Exclusive: An In-depth Look at the Star-Studded 50th Birthday Celebration of Media Mogul, Mo Abudu. Bella Naija. Retrieved on 21 March 2017.
  3. 3.0 3.1 3.2 I gave up friends to focus on my career — Edosio. Punch. Retrieved on 20 March 2017.