Fatima Yusuf
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Naijiria |
| Obodo maka egwuregwu | Naijiria |
| Aha enyere | Fatima |
| Aha ezinụlọ ya | Yusuf |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 2 Mee 1971 |
| Ebe ọmụmụ | Owo |
| Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa |
| Ọrụ ọ na-arụ | asọmpi egwuregwu, sprinter |
| Ebe agụmakwụkwọ | Azusa Pacific University |
| Ụdị egwuregwu | egwuregwu |
| Ịdọ aka ná ntị egwuregwu asọmpi | 200 metres |
| So na | 2000 Summer Olympics, 1996 Summer Olympics |
Fatima Yusuf-Olukoju (a mụrụ n'ụbọchị nke 2 n'ọnwa Mee afọ 1971 na Owo,dị na Ondo steeti) bụ nwaafọ Naijiria bụ onye egwuregwu ị gba ọsọ lagoro ezumike nka, onye sọrọ mpi ọkachasị na mita 400 n'oge ọrụ ya. Ọ meriri n'ọsọ mita 400 na 1991 All-Africa Games ma bụrụ onye nke abụọ na mita 200. Ọ lụrụ Adewale Olukoju .
O mechara soro sọọ mpi mita 200 na World Championship na Spen ebe ọ gbara ọsọ 22.28. Ọ bụkwa nwanyị Afrịka mbụ gbara ọsọ n'okpuru sekọnsụ 50 na mita 400. Ọ gbara 49.43 na 1995 African Championship
Ọ sọrọ Naịjirịa asọmpi na 1996 Summer Olympics e mere n'Atlanta, n'Amerịka na mita 400 nke ọ gbatara onye nke 6 na oge nkesekọnsụ 49.77 na mita 4 x 400 ebe o meriri nrite ọla ọcha ya na ndị otu ya Bisi Afolabi, Charity Opara na Falilat Ogunkoya n'azụ mba Amerịka. Ọ gara Mahadum nke Azusa Pacific .
Nrụtụaka
[dezie | dezie ebe o si]- Fatima Yusuf
- databaseOlympics
- Evans, Hilary; Gjerde, Arild; Heijmans, Jeroen; Mallon, Bill ; et al. "Fatima Yusuf" . Olympics at Sport-Reference.com . Sports Reference LLC . Archived from the original on 18 April 2020.