Foluke Daramola

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Foluke Daramola
Mmádu
Ụlọ ọrụ mmepụta iheụlọ ọrụ ihe nkiri Dezie
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoFolúkẹ́ Dárámọ́lá–Sàlàkọ́ Dezie
Aha ọmụmụFoluke Daramola Dezie
Aha enyereFoluke Dezie
aha ezinụlọ yaDaramola Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Febụwarị 1978 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Ekiti Dezie
Dị/nwunyeKayode Salako Dezie
nwaIbukunoluwa Ayomikun Owolabi Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee, Asụsụ Yoruba Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee ihe nkiri, onye na-emeputa ihe nkiiri, omee, omee Dezie
ụdị ọrụ yatheater arts Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Obafemi Awolowo, Ikeja Senior High School, Mahadum nke Lagos Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1998 Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
onye nlereranyaTunde Kelani, Amaka Igwe, Lola Fani-Kayode Dezie
ahọpụtara makaAfrica Movie Academy Award for Best Actress in a Supporting Role Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

 

Foluke Daramola-Salako bụ nwaafọ Naijiria na- eme ihe nkiri. A họpụtara ya maka onyinye ihe nkiri Africa Movie Academy for Best Actress in a Supporting Role n'afọ 2013.

Mmalite ndụ na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Daramola n'ụbọchị nke 15 n'ọnwa Febụwarị. Ọ bụ onye gụsịrị akwụkwọ na Mahadum nke Obafemi Awolowo . N’afọ 1998, o mere ihe nkiri izizi ya n’ime ihe nkiri usoro a kpọrọ Palace . [1] Ọ pụakwara na Durodola na Above Law . N'afọ 2016, a kọrọ na nwa ya nwanyị bụ onye nhazi nke ihe ngosi onyonyo. [2] Ihe nkiri ya, Cobweb, nke o rụpụtara ma pụtakwa na ya, nwetaara ya nhọpụta Africa Movie Academy Awards Best Supporting Actress. O kwuru na ihe nkiri ahụ sitere n'ahụmahụ ya, n'ihi na ndị mụrụ ya achọghị ka ya tinye aka na ime ihe nkiri mgbe ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ. [3] Ọ bụ onye bidoro "Action Against Rape in Africa", bu atụmatụ nke na acho i gbochi ị wakpo mmadụ n'ike, ma mee ka ndi kpara agwa a n'Afrika gaa mkpọrọ. [4]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

N'ajụjụ ọnụ nke afọ 2016, o kpughere na e dinara ya n'ike mgbe ọ dị afọ iri na ụma. [5] [6] [7] N'ajụjụ ọnụ ya na Tribune, ọ kọwara na ụmụ nwanyị kwesịrị ị ma uru ha bara na ị dabere na di ha maka ego. O kwuru na tigbuo-zọgbuo n'ezinụlọ bụ mbibi ka ukwuu n'ụlọ ya, karịa ekwesịghị ntụkwasị obi. [8] N’afọ 2017, o kwuru n’ihu ọha maka ịdị umeala n’obi nke Aliko Dangote, na-akọwa ya dịka “onye kacha umeala n’obi n’ụwa ”. [9]

Na mkparịta ụka nke ọnwa Maachị nke afọ 2018 na The Punch (Legọs, Naijiria), Daramola-Salako kwuru na ya na-ele nnukwu ara ya anya dị ka akụ na ụba ọ bụghị ọbụbụ ọnụ: “Ihe mbụ na-adọrọ mmasị ọtụtụ ndị nwoke na-abịakwute m na-abụkarị ihe mmekọahụ. Ha na-ahụ nnukwu ara m, ọ na-akpali ha ozugbo. Mana dika mmadu, Agaghị m eso nwoke ọ bụla pụọ n'ihi na mmasị ha na-adọrọ m n'ihi na a maara m na ọ bụ ihe nkịtị. N'ebe m nọ, ụmụ nwanyị kwesịrị ị kwụsị ịhụ 'akụ' ndị a dị ka nsogbu ma were ha dị ka ngọzi. Ọ bụ naanị site n’ime otú ahụ ka ha ga-ama etu ha ga-esi na-ebu onwe ha nke ọma. Ha kwesịrị i bu onwe ha nke ọma, ka ihere ghara ime ha. ” [10]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Foluke Daramola on IMDb