Geoffrey Onyeama

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Geoffrey Onyeama
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereGeoffrey Dezie
aha ezinụlọ yaOnyeama Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya2 Febụwarị 1956 Dezie
Ebe ọmụmụEnúgwu Dezie
ŃnàCharles Onyeama Dezie
nwanneDillibe Onyeama Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMinister of Foreign Affairs, Minister of Foreign Affairs Dezie
ebe agụmakwụkwọLondon School of Economics and Political Science, Columbia University, St John's College Dezie

Geoffrey Jideofor Kwusike Onyeama (amụrụ n'abalị abụọ nke ọnwa Febụwarị afọ 1956) bụ Minista Naịjirịa na-ahụ maka ihe gbasara mba ọzọ metụtara Naijiria[1] Onye isi ala Muhammadu Buhari họpụtara Onyeama ka ọ bụrụ Minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi nke Naijiria n'ọnwa Nọvemba afọ 2015.[2]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Onyeama n'ezinụlọ onye ọka iwu Naijiria bụ Charles Onyeama.[3] O nwere nzere Bachelọ nke Art (B.A) na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Mahadum Columbia, New York n'afọ 1977 na nzere Bachelọ nke art (B.B) na mmụta iwu na koleg St John , Cambridge n'afọ 1980. O nwere nzere Masta nke iwu (LL.M) site na ulo akwukwo sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ekọnọmiks dị na London na 1982 na nzere Masta nke Art (M.A) na mmụta site koleg St John na Cambridge n'afọ 1984.[4] A nabatara Onyeama dị ka onye ọka iwu nke Ụlọikpe Kasị Elu nke Naijiria n'afọ 1983 ma kpọọkwa ya na English Bar nke Grey's Inn na 1981.[4]

Onyeama na ode akwukwọ Steeti nke U.S bụ Michael R. Pompeo na-ekwu okwu na nzukọ ndị nta akụkọ na ngalaba nke Steeti na Washington D.C. na abalị anọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2020.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Onyeama malitere ọrụ ya dị ka onye nyocha na Naịjirịa Law Reform Commission Lagos site na afọ

1983 ruo 1984. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ọka iwu na Mogboh na Associates na Enugu, Naịjirịa site na 1984 ruo 1985. N'afọ 1985, ọ sonyeere World Intellectual Property Organization (WIPO) dị ka onye enyemaka mmemme maka mmekọrịta mmepe na mmekọrịta mba ọzọ, Bureau for Africa and Western Asia. Ọ rịgooro n'ọkwa na WIPO ka ọ bụrụ osote onye isi nchịkwa maka ngalaba mmepe n'afọ 2009. N'ọnwa Nọvemba afọ 2015, Onye isi ala Muhammadu Buhari họpụtara ya ka ọ bụrụ minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi na Naịjirịa.[5]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Onyeama lụrụ nwanyị; ma nwee ụmụ atọ. Nwunye ya ugbu a bụ Sulola; onye ya na Onyeama nwere ụmụ abụọ. Na mbụ, Onyeama lụrụ nwa nwanyị Christian Onoh: Nuzo Onoh ma ha nwere nwa mbụ Onyeama na nwa nwanyị aha ya bụ Candice Onyeama; onye edemede na onye na-eme ihe nkiri.[6][7]

N'abalị iri na itoolu n'ọnwa Julaị n'afọ 2020, Onyeama banyere n'ụlọ ọgwụ nkewa mgbe o kwupụtara na ọ nwalee ahụike pụtara na ọ nwetara nje COVID-19.[8] Na ngwụcha ọnwa Ọgọstụ 2020, Onyeama gbakere site na ọrịa COVID-19 coronavirus; wee laghachi n'ọrụ idu ndú ya dị ka HMFA: Minista maka Mmekọrịta Mba Ọzọ na Ministri Naịjirịa.[9][10][11]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta nke ndị minista mba ọzọ ugbu a
  • Kọmitii nke Naịjirịa
  • Minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi (Nigeria)

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Nigeria will continue to strengthen bilateral ties with South Africa – Onyeama (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2021-11-30). Archived from the original on 2022-02-22. Retrieved on 2022-02-22.
  2. Ekott. UPDATED: Buhari assigns Ministers; Fashola heads Power and Works, Amaechi gets Transportation. Premium Times. Retrieved on 30 January 2016.
  3. Geoffrey Onyeama: 7 Things You Should Know About Nigeria’s Foreign Affairs Minister. Nigerian Monitor. Retrieved on 30 January 2016.
  4. 4.0 4.1 CURRICULUM VITAE OF MR. GEOFFREY ONYEAMA. Global Intellectual Property Center. Retrieved on 30 January 2016.
  5. The Honourable Minister of Foreign Affairs Mr. Geoffrey Onyeama. Ministry of Foreign Affairs of Nigeria. Archived from the original on 12 August 2016. Retrieved on 30 January 2016.
  6. Norwich Film Festival: Born Again Directed by Candice Onyeama. Norwach Film Festival: United Kingdom. Retrieved on 20 September 2020.
  7. Question and Answer With Candice Onyeama Director Screening Short Fiction Born Again. Barnes Film Festival: United Kingdom. Retrieved on 20 September 2020.
  8. Nigerian Foreign Minister Onyeama tests positive for coronavirus (July 19, 2020). Archived from the original on July 19, 2020.
  9. Foreign Minister Geoffrey Onyeama Recovers from Covid-19. The Guardian Nigeria. Retrieved on 20 September 2020.
  10. Foreign Minister Onyeama Recovers from COVID-19. Channels Television Nigeria. Retrieved on 20 September 2020.
  11. Foreign Minister Geoffrey Onyeama Recovers from COVID-19. Vanguard Nigeria News. Retrieved on 20 September 2020.

Àtụ:Foreign Ministers of Nigeria