Ijeoma Uchegbu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ijeoma Uchegbu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịObodoézè Nà Ofú Dezie
Aha enyereIjeoma Dezie
aha ezinụlọ yaUchegbu Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya16 Ọgọọst 1960 Dezie
Ebe ọmụmụLondon Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụpharmacologist, science communicator, researcher Dezie
onye were ọrụUniversity of Strathclyde, University College London Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of London, Mahadum nke Benin, Mahadum nke Lagos Dezie
onye ndụmọdụ doctoralAlexander Florence Dezie
Onye òtù nkeAfrican Academy of Sciences, Black Female Professors Forum Dezie
Ihe nriteFellow of the Controlled Release Society, Fellow of the African Academy of Sciences Dezie
webụsaịtịhttp://www.nanomerics.com, http://iris.ucl.ac.uk/iris/browse/profile?upi=IFUCH91 Dezie

Ijeoma Uchegbu bụ ọkaçha nmụta nke ndị mepụta ọgwụ na Mahadum London ebe ọ jidekwa ọkwa Pro-Vice Provost maka mpaghara Africa na Middle East. Ọ bụ onye isi ọrụ nke gbasara sayensi nke ngalaba Nanomerics, na ụlọ ọrụ ọgwụ na ahụta maka nanotechnology. Ndị ụlọ ọrụ na ahụta maka ụzọ nnweta ọgwụ maka ọgwụ na-adịghị agbarị na mmiri ka esị tuo anya, acidị nke nucleic na peptides. Ewezuga ka esi akpọ aha ya aghara aghara na edemede maka nyocha sayensị na Pharmaceutical Nanoscience, [1] amakwara Uchegbu maka ọrụ ya na ihe gbasara ikwụ pụta okwụ maka njikọta sayensị na igwe nmadu, ya na ịwezụga ikpa oke na ina ba'ta ndi di iche iche na Sayensi, Teknụzụ, Injinia na mgbakọ na mwepụ (STEM). [2] [3]

Mmụta na mmalite ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Uchegbu toro na Hackney ya na ndịda ọwụwa anyanwụ Nigeria.[4] Ọ gụrụ maka ịmeputa ọgwụ na Mahadum Benin, gụsịrị akwụkwọ na afọ 1981, wee nweta akara ugo mmụta, nzere masta ya na Mahadum Lagos . [5] Onweghi ike inweta asambodo nke ka chi si (PhD) na Nigeria n'ihi na akarangwa nke ahụ adighị. [6] Ọ laghachiri UK ma gụchaa akwụkwọ mahadum ya na Mahadum London, gụsịrị akwụkwọ wee nweta re masta ya na Mahadum Lagos . [5] Onweghi ike inweta asambodo nke ka chi si (PhD) na afọ 1997. Ọ bụ Alexander (Sandy) Florence, onyeisi nke ngalaba akwụkwọ imepụta ọgwụ hụkwara ma nyochaa ya maka akara ugo mmụta. A họpụtara ya maka ịbụ onye nkuzi na Mahadum Strathclyde site na afọ 2002 rue 2004.

Nchoputa ya[dezie | dezie ebe o si]

Uchegbu bụ onye isi oche na nnweta ọgwụ na Mahadum Strathclyde na afọ 2002. N'ebe a ọ rụrụ ọrụ na nzuko na ichikọ polymer, nke bu ihe ndị nwere ike ịnye aka wepụta nanosystem ụdị kwụsie ike. [7] O gosiputara na enwere ike iji ihe omuma nke polymer jikwaa oke nke vesicles. Ọ sonyeere Mahadum University London na afọ 2006 dị ka onye isi oche na gwọọ ọgwụ Nanoscience na ngalaba ụlọ akwụkwọ ahu maka imeputa Ọgwụ. Uchegbu na-edu ndị otu na nyocha maka nke molecular design na usoro inu ọgwụ dị ka nke a. [8] O meela polymers nke na-ejikọta onwe ya n'ime nanoparticles site na iji ihe kwesịrị ekwesị iji bufee ọgwụ na ahụ nmadu. Ọ na-achọpụta otú enwere ike iji ma were nanoparticles nnyefe ọgwụ. Uchegbu ji kwa ọtụtụ ikikere (patenti) maka ịnye ọgwụ ọgwụ, [9] [10] [11] [12] [13] [14] [15] [16] na ndị na-ekekọta ọgwụ polymers. [17] [18] [19] Ọgwụ ya na- ebunye mkpụrụ ndụ ihe nketa na siRNA na etuto di iche iche na'ime ahụ na peptides na ụbụrụ. Ọgwụ ya na egosi igba ume na nnabata ọgwụ hydrophobic site na iji nanoparticles. [20] Ọ na-etinye anya na nchọpụta etu aga esi nwe ike jiri ọgwụ ndia na emeputa gwọọ ọrịa akpụ ụbụrụ. Na afọ 2018 ọ so na ndi nke wetatra nde pounds (£5.7) Injinia na Nchọpụta Ahụ́ Ike granti maka, Raman Nano theranostics, nke ga-eji nanoparticles ọla edo chọpụta ọrịa na ọkụ iji bibie mkpụrụ ndụ ndị ọrịa. [21] Ọ na ejikwa nanoparticles magnetik arụkwa ọrụ ya. .

Nanomerik[dezie | dezie ebe o si]

Na afọ 2010 Uchegbu na Andreas Schtzlein tọrọ ntọala Nanomerics. [22] Nanomeriki bụ ụlọ ọrụ ọgwụ na-eji nanotechnology mepụta ọgwụ. Uchegbu bụ onye isi sayensị nke ụlọ ọrụ Nanomerik.[7] Nanomerics bu ihe ndi puru ime njem nke nwere ike ibufe ihe na alụ agha megidi ọrịa na ahu nmadu na enweghi ngbochi obula na obara ma'ọbụ na ubụrụ. [23] Nanomerics na - emepụta teknụzụ ngwakọ ụmụ irighiri ihe na - eme site na amphiphilic polymers nke na - ejikọ onwe ha. [24] Na afọ 2017 ọ meriri na asọ mpi nke Royal Society of Chemistry maka Teknụzụ ohuru maka ụmụ irighiri ihe ha arụ na ngalaba molecular envelope. [25] O were ikike (patentị ) NM133 nyefe ndị olu nmeputa ọgwụ Lacta na afọ 2017. NM133 nwere cyclosporine A ma enwere ike iji gwọọ ọria maka anya kọrọ mmiri.

Ọrụ ọkachamara[dezie | dezie ebe o si]

Uchegbu na-arụ kwa ọrụ di ka oso ndi nchikota akwụkwọ nke Journal of Controlled Release . [26] Ọ rụrụ ọrụ dị ka odeakwụkwọ sayensị nke ndi otu Controlled Release. Ọ bụ onye nchịkọta-isi nke ọgwụ Nanotechnology. [27] O no na otu ndumodu banyere ahu ike ulo ogwu nke nchoputa injinia . O tinyere aka na mmemme Mahadum London mee're maka National Health Service jiri gbaa afọ iri asaa. [28] N'afọ 2007 ka aghọrọ ya maka Mmepụta nke Mmezu Pụrụ Iche nke SET nke gosipụtara na Museum nke Sayensi na British Museum . [29]

N’afọ 2015, a họpụtara Uchegbu ịbụ Pro-Vice Provost maka Africa na Middle East. [30] [31] Ọ na-ahụ maka ngalaba netwọkụ mpaghara Afrịka na Middle East na Mahadum College London. Ọ na-ewu mmekọrịta na ịmalite emekọ ihe ọnụ, na-anabata kwa ndị ọbịa mba ụwa ma na-akwado inabata ụmụ akwụkwọ. [32]

Mkpokọta Ọha, ịha ịha na nnabata ndi di iche-iche[dezie | dezie ebe o si]

Uchegbu na esonye na njikọta ọha na nkwukọrịta sayensị nke a'na egosipụta na onyonyo na BBC nke an'na akpo Oge Nwanyị nke BBC ebe ọna anọ atụle nyocha ya banyere etu a ga-esi jiri ụmụ irighiri Nano nyeka iji nyefee ọgwụ na ahụ ka odi ire[33] O sonye kwa na mmeme Soapbox Science nke na ebulite sayensị nke mba ụwa ni'le ma'na akwalite ụmụ nwanyị sayensị na ọrụ ha na-arụrụ. [6]

Uchegbu tinye kwara aka na ihe banyere nha nha kwu'ọtọ na mmemme gbasara ina ba'ta ndi di iche iche. Ọ na-arụ ọrụ dị ka onye nnọchi anya UCL Provost maka Race Equality [3] ma gosipụta onwe ya dị ka onye otu Black British Role Model maka Ndị Injin Inyom . [2] Ọ na-arụkwa ọrụ na kọleji Mahadum London Race Equality Charter nyocha onwe. [34] [35] O so na ndi otu ndi nkuzi oka cha nmuta ndi Black Female. [36] [37]

Akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

  • 2000 Synthetic Surfactant Vesicles: Niosomes and Other Non-phospholipid Vesicular Systems: 11 (Drug Targeting and Delivery) [38]
  • 2006 Polymers in Drug Delivery [39]
  • 2013 Fundamentals of Pharmaceutical Nanoscience [40]

Ugo na nkwanye ugwu[dezie | dezie ebe o si]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ijeoma Uchegbu - Google Scholar Citations.
  2. 2.0 2.1 Role models | Women's Engineering Society. Archived from the original on 2019-03-01. Retrieved on 2020-08-13.
  3. 3.0 3.1 Deans pledge to further race equality at UCL.
  4. International Women's Day 2015: What inspired some of UCL's leading women to become academics? (2015-03-05).
  5. 5.0 5.1 The Talent Pool.
  6. 6.0 6.1 "Barriers are there to be broken: Meet Ijeoma F. Uchegbu - SoapboxScience", 2017-05-24.
  7. 7.0 7.1 Ijeoma Uchegbu | Nanomerics.
  8. 8.0 8.1 Professor Ijeoma Uchegbu.
  9. US Patent Application for Delivery of Drugs Patent Application (Application #20160279189 issued September 29, 2016) - Justia Patents Search.
  10. US Patent for Delivery of hydrophilic drugs Patent (Patent # 8,920,819 issued December 30, 2014) - Justia Patents Search.
  11. US Patent Application for DELIVERY OF HYDROPHILIC PEPTIDES Patent Application (Application #20130203647 issued August 8, 2013) - Justia Patents Search.
  12. US Patent Application for Delivery of Hydrophilic Drugs Patent Application (Application #20130034590 issued February 7, 2013) - Justia Patents Search.
  13. US Patent for Delivery of hydrophilic drugs Patent (Patent # 8,278,277 issued October 2, 2012) - Justia Patents Search.
  14. US Patent Application for DELIVERY OF HYDROPHILIC DRUGS Patent Application (Application #20100222281 issued September 2, 2010) - Justia Patents Search.
  15. US Patent Application for Drug delivery Patent Application (Application #20060148982 issued July 6, 2006) - Justia Patents Search.
  16. US Patent Application for Dendrimers for use in targeted delivery Patent Application (Application #20050019923 issued January 27, 2005) - Justia Patents Search.
  17. US Patent for Solubilising polysaccharides substituted with dydrophilic and hydrophobic groups Patent (Patent # 7,741,474 issued June 22, 2010) - Justia Patents Search.
  18. US Patent Application for Bioactive Polymers Patent Application (Application #20080267903 issued October 30, 2008) - Justia Patents Search.
  19. US Patent Application for Solubilising polysaccharides substituted with dydrophilic and hydrophobic groups Patent Application (Application #20060167116 issued July 27, 2006) - Justia Patents Search.
  20. Iris View Profile.
  21. EPSRC grant to revolutionise detection and treatment of life-threatening illnesses. Archived from the original on 2018-10-21. Retrieved on 2020-08-13.
  22. Studying small things can lead to big opportunities says UCL Chair in Pharmaceutical Nanoscience | etrust. Archived from the original on 2019-04-09. Retrieved on 2020-08-13.
  23. "UCL spin-out aims to smuggle antibodies across the blood-brain barrier".
  24. "IACTA Pharmaceuticals Licenses NM133 from Nanomerics for Treatment of Dry Eye".
  25. Innovation Seminar Series - Prof. Ijeoma Uchegbu, Nanomerics.
  26. Elsevier. I. Uchegbu - Editorial board - Journal of Controlled Release - ISSN 0168-3659.
  27. ACKNOWLEDGEMENTS TO REVIEWERS. Archived from the original on 2018-10-21. Retrieved on 2020-08-13.
  28. Professor Ijeoma Uchegbu. Archived from the original on 2018-07-15. Retrieved on 2020-08-13.
  29. Pearson. Women of Outstanding Achievement.
  30. UCL (2015-10-30). Ijeoma Uchegbu Appointed UCL's Pro-Vice Provost for Africa and The Middle East.
  31. UCL (2017-06-29). Pro-Vice-Provosts (Regional).
  32. Spotlight on Professor Ijeoma F. Uchegbu, Pro-Vice-Provost for Africa and the Middle East (2016-01-14).
  33. 27/09/2010, Woman's Hour - BBC Radio 4 (en-GB).
  34. Deans pledge to further race equality at UCL (2018-07-11).
  35. University College London is determined to tackle racism | Letters (2016-11-01).
  36. Black Female Professors in the UK (February 2017) (2019-02-28). Archived from the original on 2019-03-01. Retrieved on 2020-08-13.
  37. Ijeoma Uchegbu – Black Female Professors Forum.
  38. (2000-02-01) Synthetic Surfactant Vesicles: Niosomes and Other Non-Phospholipid Vesicular Systems. 
  39. (2006-05-19) Polymers in Drug Delivery. 
  40. (2013-12-09) Fundamentals of Pharmaceutical Nanoscience. 
  41. "2012 RPS award winners announced".
  42. Academy of Pharmaceutical Sciences Eminent Fellows. Archived from the original on 2018-10-21. Retrieved on 2020-08-13.
  43. College of Fellows Award Recipients. Archived from the original on 2018-10-22. Retrieved on 2020-08-13.
  44. Professor Ijeoma Uchegbu wins Innovative Science Award.