Jagun Jagun

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Jagun Jagun (Onye Agha) bụ ihe nkiri Yoruba nke Netflix nke 2023 nke Femi Adebayo Salami na Euphoria360 Media mepụtara. [1]Ọ bụ Adebayo Tijani na Tope Adebayo Salami duziri ya. [2]Ndị soro me ihe nkiri a bụ Femi Adebayo, Adedimeji Lateef, Bimbo Ademoye, Faithia Balogun, Maazị Macaroni, Bukunmi Oluwasina, Ibrahim Yekini na Muyiwa Ademola. E buputere ya na ihe nkiri Netflix na 10 August 2023.[1]

Nkowa[dezie | dezie ebe o si]

Jagun Jagun na-akọ akụkọ banyere onye agha, Ogundiji onye malitere ị nwe ụjọ na ikike nke onye agha na-eto eto, Gbotija onye ebumnuche ya bụ ịgbu onye gburu nna ya. [3]Ogundiji a bụrụla onye ọchịchị aka ike nke n'eji ike anapụta ala n'aka ndị nwere ha nyefe ndị ọchịchị ndị ọjọọ. N'oge na-adịghị anya ọ bido tụwa egwu site na mbata nke nwa okorobịa agha, Gbotija.[4][5]

Ndị mere ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Mmepụta na ntọhapụ[dezie | dezie ebe o si]

E mere Jagun Jagun ihe nkiri ihe karịrị otu ọnwa na ala ndị ofe mmanụ, ndị akpọrọ ndị Yoruba n'ala Naịjirịa . [1]Onye na-eme ihe nkiri Bukunmi Oluwasina kpughere na Femi Adebayo Salami họọrọ ya maka ọrụ ya na ihe nkiri ahụ otu afọ tupu mmepụta amalite. O toro mmepụta nke ihe nkiri ahụ, na-akọwa ọrụ ahụ dị ka "ọrụ dị ịrịba ama".[6]

Femi Adebayo bụ onye nke mepụtara <i id="mwTA"><i id="mwTg">Eze nke Ndị Ozu ohi</i></i>, kwuru na nrọ Jagun Jagun bụ ịgafe ọrụ ọma nke ihe ndị Eze nke Ndị Ezu ohi depụtara.[7]

N'abalị iri n'ọnwa Ọgọstụ, na afọ 2023, a buputere Jagun Jagun na Netflix ka a mara ya nke ọma. N'ime awa iri anọ na asatọ nke nbupute ya, ọ malitere n'eje eje na United Kingdom na mba iri na asaa ndị ọzọ. [8]O nwetara 2,100,000 nlele n'ime ụbọchị atọ mbụ ya, na 3,700,000 nlele site na iri abụọ nke Ọgọstụ, 2023, na-eme ka ọ bụrụ otu n'ime ihe nkiri iri kachasị anya na-abụghị ihe nkiri Bekee n'ụwa niile n'oge ahụ. [9]

Ebe m si de[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Oloruntoyin (2023-07-21). Here is your first look at Netflix's 'Jagun Jagun' (en). Pulse Nigeria. Retrieved on 2023-07-22. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. Netflix Unveils 'Jagun Jagun (The Warrior)': An Epic Yoruba Tale of Power, Love, and Honor! » YNaija (en-GB). YNaija (2023-07-22). Retrieved on 2023-07-22.
  3. Yoruba film 'Jagun Jagun' set to premiere on Netflix (en-US). P.M. News. Retrieved on 2023-08-12.
  4. Oadotun (2023-08-12). MOVIE REVIEW: Jagun Jagun raises bar for Nigerian epic films (en-GB). Premium Times. Retrieved on 2023-08-12.
  5. Mosadioluwa (2023-08-10). Femi Adebayo's Netflix epic 'Jagun Jagun' earns fans' applause (en-GB). Tribune Online. Retrieved on 2023-08-12.
  6. Oluwayemi. Actress Bukunmi Oluwasina unveils daring role in "Jagun Jagun" - P.M. News (en-US). Retrieved on 2023-07-22.
  7. Acho (2023-08-10). Nigerians Hail Actor Femi Adebayo's Netflix Epic Jagun Jagun (en-US). Leadership. Retrieved on 2023-08-12.
  8. Afigbo (2023-08-12). "Record-breaking": Femi Adebayo's new film hits top 10 in 18 countries in 48 hrs (en). Legit.ng - Nigeria news.. Retrieved on 2023-08-12.
  9. Netflix. Weekly Top 10 lists of the most-watched TV and films (en-US). Retrieved on 2023-08-17.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Jagun Jagun na IMDb