Josephine Anenih

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Josephine Anenih
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereJosephine Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya6 Julaị 1948 Dezie
Ebe ọmụmụSokoto Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMinister of Women Affairs and Social Development Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Obafemi Awolowo, Mahadum nke Benin Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ụcha ime anyablack Dezie

A họpụtara Iyom Josephine Anenih (amụrụ na 6 Julaị, na afọ 1948) ka ọ bụrụ minista Naijiria nke Women Affairs na 6 Eprel, na afọ 2010, mgbe onye isi ala Goodluck Jonathan kwupụtara ụlọ ọrụ ọhụrụ ya.[1][2][3]

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na Sokoto na afọ 1948, ọ nwere ebe obibi na-adịgide adịgide n'ihi na a na-ebufe ya ugboro ugboro dịka nna ya, onye ọrụ gọọmentị na ngalaba ọrụ ọha na eze, jere ozi na steeti niile na Naịjirịa. A mụrụ ya n'ezinụlọ Ndị Kraịst. Ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị ya na Queen's College, Lagos.[4] N'ịmụ Iwu, ọ natara B.Ed, LLB, na B.L. site na Mahadum Ife (1974/75) na Mahadim Benin.

A họpụtara di ya, Tony Anenih na afọ (1933-2018) dị ka Minista na Naịjirịa (Minista na-ahụ maka ọrụ) Onye isi ala Olusegun Obasanjo.[5]

Ọ bụ onye isi oche nke Federation of Women Lawyers site na afọ 1994 ruo afọ 2000, ọ bụkwa onye isi nwanyị mbụ nke People's Democratic Party (PDP) site na afọ 1999 ruo afọ 2005.[3] N'ọnwa Eprel na afọ 2002, o kwuru na mmejuputa usoro iwu Sharia na steeti Kano emeela ka a kwalite ikike ụmụ nwanyị dịka Islam si kwuo.[6] Ọ bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche na Women Affairs nke Onye isi ala Obasanjo ruo n'afọ 2006.[7]

Ọ bụ otu n'ime ndị guzobere Women Foundation Nigeria (WFN), otu na-enyere ụmụ nwanyị Naijiria aka n'ịgbanwerịta echiche banyere nsogbu ụmụ nwanyị zuru ụwa ọnụ na iji nyere ụmụ nwanyị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ onye otu Gender Electoral and Constitutional Memoranda Committee, nke na-achọ itinye echiche ụmụ nwanyị na Iwu na mgbanwe Electoral nke Naịjirịa.[8]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. ANENIH, Barr Josephine Nwogo (Nov 11, 2016). Retrieved on Sep 8, 2020.
  2. Dad flogged me the day a visitor gave me a coin at Xmas – Josephine Anenih. onlinenigeria (Apr 4, 2010). Retrieved on Sep 8, 2020.
  3. 3.0 3.1 Ministers - the Profiles. ThisDay (7 April 2010). Retrieved on 2010-04-14.
  4. Ayo-Lawal Gbenoba. I was so tiny in school that my friends served punishments on my behalf - Josephine Anenih, Former PDP Woman Leader. Tribune. Archived from the original on 2011-07-24. Retrieved on 2010-04-14.
  5. Profiles of ministerial nominees. Peoples Daily. Archived from the original on 2021-06-16. Retrieved on 2010-04-14.
  6. Josephine Anenih Commends Sharia in Kano State. Daily Trust (23 April 2002). Retrieved on 2010-04-14.
  7. Ademola Adeyemo (28 March 2010). New Ministers - Would They Perform Miracles?. ThisDay. Retrieved on 2010-04-14.
  8. Expert Profiles. The International Knowledge Network of Women in Politics. Archived from the original on 2010-02-26. Retrieved on 2010-04-14.