Joy Chinwe Eyisi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Joy Chinwe Eyisi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereJoy Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya3 Septemba 1969 Dezie
Ebe ọmụmụAnambra Steeti Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAsụ̀sụ̀ Ìgbò, Bekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOdee akwụkwọ Dezie
onye were ọrụMahadum nke Nigeria Dezie
Usòrò:Professor Joy Eyisi.jpeg

Joy Chinwe Eyisi (a mụrụ n'ụbọchị nke 3 n'ọnwa Septemba afọ 1969) bụ prọfesọ onye Igbo Naijirian , na-ede akwụkwọ, bụ ọkà mmụta, na onye na-eneye ndị mmadụ aka . N’agbata afọ 2006 na 2011, ọ bụụrụ onye isi ngalaba, asụsụ bekee na agụmagụ bekee, Fakọlti Aat nka mahadum Nnamdi Azikiwe, (NAU), Awka, dị n'Anambra steeti . [1] Ọ bụzi onye isi osote onye isi ụlọ akwụkwọ (Ọmụmụ) nke National Open University of Nigeria (NOUN), ọkwá ọ malitere n'ụbọchị nke 26 ọnwa Ọktọba afọ 2017. Eyisi, onye bụbu onye isi senta nke NOUN's Study Center na National Assembly na Abuja, pụtara onye mmeri nke ntuli aka nke ndị Sineeti nke mahadum a mere n'ụbọchị nke 25 ọnwa Ọktoba afọ 2017. Ọ nọchiri Prọfesọ Patrick Eya dị ka nwanyị mbụ bụ osote onye isi ụlọ akwụkwọ (Ọmụmụ). [2] [3] [4] [5]

Oge mmalite na alụmdinanwunye[dezie | dezie ebe o si]

Dika nwa mbu, a mụrụ Joy Eyisi n'ezinulo nke Sir Geoffrey na Lady Caroline Okpalanzekwe na ngwụcha agha Biafran . O nwere mmalite dị umeala. Ndị mụrụ ya e nweghị ike igbo mkpa ndị dị ha mkpa nke ọma. Ya mere, e mere ya ka ọ gaa maka nlekọta nwa.

Eyisi bụ onye obodo Eziora nke dị n'Adazi-Ani dị na okpuru ọchịchị Anaocha, Anambra Steeti . Mgbe o mechara NCE ya, ọ lụrụ Chief Ray Ifeanyichukwu Eyisi, onye naịtị nke otu ụka Anglịkan nke Naijiria na-azụ ahịa,onye sitere na otu obodo nta, onye o zutere nke mbụ n'obodo ya . Nwa ya nwoke nke abụọ bụ Noble Eyisi bụbu onye isi otu ndi ọchịchị otu jikọtara ụmụ akwụkwọ (SUG), na Mahadum Nnamdị Azikiwe . [6] [7] [8] Naanị otu nwa nwanyị ya (Joy Eyisi, Jnr, dere akwụkwọ Willy-nilly, akwụkwọ nke a ma dị ka akwụkwọ agụmagụ nke ụmụaka na Nigeria nke narị afọ 21) bụ oney ji digrii klaas mbụ na Asụsụ bekee pụta site na Mahadum Koovenantị, Ota,dị na Ogun Steeti,na Naijirịa .

Mmụta na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Eyisi kwuru na ọ bụ otu n'ime ụmụ akwụkwọ kachasị dị ume ngwụ na klaasị ahụ, ma nwekaa mpụtara na-adịghị mma na agụmakwụkwọ ya n'ogea. N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, maka agụmakwụkwọ ogo akwụkwọ praịmarị ya, ọ debara aha na Central School,nke Nnewi, mana ọ gụchara akwụkwọ ogo praịmarị na St Jude's Central School,dị n'Adazi-Ani, n'afọ 1981. N'ime otu afọ ahụ, site na mpụtara ule Common Entrance katụ mma, a nabatara ya na Girls' High School, Agulu, nke dị n'okpuru ọchịchị nke Rev (Sr) Miriam Theresa Ozomma oge ahụ. Ọ gụchara n'afọ 1986. Eyisi, ebe ọ bụ onye akpọrọ aha ya na agụmakwụkwọ, nwetara asambodo National Certificate in Education (NCE) site na Anambra State College of Education, Awka (1986-1989). Ọ gara maka ọmụmụ na Mahadum Nigeria, (UNN), Nsukka, n'Enugu Steeti, jiri nzere bachalọ (Second-Class Upper Division) na Mmụta na Asụsụ Bekee. Mgbe ọ fechara ala nna ya n'afọ 1994, a nabatara ya maka nzere masta na Nchịkwa Mmụta na Nlekọta Ụlọ Akwụkwọ,na Mahadum Nnamdi Azikiwe, bụ ebe ọ gụsịrị akwụkwọ dịka nwa akwụkwọ kachasị mma n'etiti abụbụ ọrụ nke ASUU n'afọ 1995. N’agbata afọ 1997 na 2000, ọ gara MA / PhD na Alma mata, UNN.

Eyisi bidoro ọrụ ya dịka onye nkuzi nwa oge na Nwafor Orizuo College of Education, Nsugbe, ọ bụ ezie na ọ bụbu onye nkuzi nwa oge na Mahadum Nnamdi Azikiwe na mbido afọ 1996. N'afọ 2000, Mahadum Nnamdi Azikiwe nyere ya ọkwa dị ka onye nkuzi oge zuru ezu. Ọganihu ya site na Lecturer I ruo ọkwa prọfesọ na 1 October 2007 dịka o were afọ asaa iji rụzuo; n'ihi ya a kwadoro ya prọfesọ nke kacha dị ntorobịa na mahadum ahụ n'oge ahụ. Mmetụta Eyisi wetara Ngalaba Asụsụ Bekee na Agụmagụ (nke dị nso na ngalaba Agụmagụ Iwu nke Mahadum Nnamdi Azikiwe) nke onye na-eme azụmahịa i bụ ndị mmadụ n'ụgbọala na Naijirịa, bụ Chif Godwin Ubaka Okeke (MON). [9] Ọ bụrụla Prọfesọ na-abịarute abịarute na ụlọ akwụkwọ ukwu dị iche iche, ụfọdụ n'ime ha bụ Mahadum St Paul,dị n'Awka, (2002-2005), na Mahadum Ebonyi Steeti,dị n'Abakiliki (2001-2005).

Mbipụta ya ndị ama ama[dezie | dezie ebe o si]

Dika onye oka-mmuta, a maara Eyisi dị ka onye dere, degharia, ma dezie otutu ihe ọmụmụ, akwụkwọ akụkọ, akwụkwọ nkuzi, akwukwo ndi na agba ume, na ihe ngosi ogbako ndi e deputara. Akwụkwọ ya bụ Oral English for Successful Performance and Phonetics of English: A Hands-on Guide to Correct Pronunciation na-agbado ụkwụ na ka e si enweta ma mụta olu na ụda olu n'Asụsụ Bekee. Ọrụ ya a kacha mara amara, bụ Common Errors in the Use of English, na-achọpụta ma na-edozi ụfọdụ njehie pụtara ìhè ọtụtụ ndị na-ekwu okwu na-eme mgbe ha na-asụ asụsụ Bekee . A Grammar of English: The Student's Companion, ọrụ ya ọzọ, na-egosi ndị na-amụ ihe kịrịkịrị ihe dịgasị n'ime asụsụ Bekee dịka asụsụ nke abụọ, ebe he Mechanics of Reading Comprehension and Summary Writing na-achọpụta ụzọ ndị na-agụ nwere ike isi ghọta ma kọwaa okwu ndị e bipụtara. Site na The Secret of Academic Success, nke o kwuru na ọ bụ ọrụ ya kachasị mma, Joy Eyisi na-agba ụmụ akwụkwọ ume ka ha mee ọfụma na-agụmakwụkwọ. English for All Purposes: Hands-on Guide for Excellence in the Use of English, nke onye so dee ya bụ Chinonso Okolo na Joseph Onwe, dị ka onye nyocha kwuru, nwere ike "ịnye ederede nrụtụaka… ihe na-enye ume ọhụrụ iji kpalite echiche banyere ụfọdụ mgbagwoju anya bekee nkw mahadum Quirk na Greenbaum na ederede ọzọ. [10]

Nkwado na Asụsụ Bekee[dezie | dezie ebe o si]

Okwu kacha amasị ya bụ “Gawa n'ebe kacha elu. A chọla mpụtara dị Ezigbo mma ebe e nwere ike ị nweta mpụtara Magburu onwe ya “na“ Ọchụchọ magburu onwe ya bụ nchọta maka ịdị mma” bụ mkpalite maka mmezu agụmakwụkwọ ya na ụdị ndu ọ na-ebi. Eyisi, na-mmekọrịta ya ndị odee ise ọzọ , [11] na-enye ndụmọdụ mgbanwe na onyinye na nkọwa nke mmụta dị iche iche nke asụsụ Bekee a ga-asụ naanị na mmụta mbaụwa. Dika onye oka nmuta natara otutu ihe nrita nke obodo na nke uwa maka onyinye ya na mmuta, [12] [13] o na-eme mgbasa ozi na i sụ ma i kuzi asusu bekee ziri e zi na ọnọdụ asụsụ nke abụọ.

A ga-enyerịrị ụlọ akwụkwọ ụlọ nyocha asụsụ, ọba akwụkwọ ọkọlọtọ, n'etiti ndị ọzọ iji wepụta ụmụ akwụkwọ na ndị nkuzi kacha mma. Ọnọdụ dị ugbu a dị njọ. E kwediri m nkwa inye onyinye nye ndị nkuzi nwere ike ịkpọpụta okwu 50 n'ụzọ ziri ezi na nzukọ ọmụmụ dị iche iche ebe m jere ozi dị ka onye nhazi n'ofe obodo, e nwekwazịrị m ike ịgwa gị na o siiri anyị ike inweta azịza 10 ziri ezi. [14]

Nkwupụta ahụ dị n'elu gosipụtara obi ya banyere adịghị mma nke Asụsụ Bekee na Naijirịa na Afrịka . A chọpụtara na Eyisi nwere mmetụta dị ike n'ahụ ndị na-ege ya ntị na nkuzi ọ bụla o sonyere na ya dị ka onye nhazi. [15] N’ime ‘’The Role of Women in Empowering Change’’, Eyisi kwuru na ị mụ nwa e kwesịghị ị bụ ihe ngọpụ maka ị ga n’ihu n'agụmakwụkwọ, na-ekwupụta na:“ Ekwesịrị i nye nwatakịrị nwanyị ohere agụmakwụkwọ, o kwesịrị ị ga ụlọakwụkwọ, ọ ga-agụrịrị akwụkwọ. ” [16]

Nturuugo na otu ndi okacha amara[dezie | dezie ebe o si]

Dịka akụkụ nke onyinye ya na agụmakwụkwọ na ọha mmadụ n'ozuzu, Eyisi, n'afọ 2004, natara Silver Jubilee Merit Award nke Bishop Crowther Seminary, Awka ; 2005 Adadiebube: Recognition and Merit Award si n’aka St. Jude’s Anglican Church Adazi-ani Women's General Meeting (Home na Abroad);Great Woman of Honour Recognition and Merit Award site n'aka BBC Club, UNIZIK, Awka (2005); Menu of Integrity, Merit and Certificate from site n'aka Rotary International, Rotary Club nke Awka, District 9140 (2006); Doyenne of Excellence, Distinguished Scholarship Award, site n'aka English Language Teachers Association of Nigeria (2007). O jikwa Educational Leadership Award site n'aka Institute of Industrial Administration (2007); Leadership Merit Award site n’aka First Bank of Nigeria Plc (2008); Award of Excellence: An Appreciation of Wonderful Contributions to Academic Excellence in NAU, Hostel Union Government, Awka (2009); Merit Award in Recognition of her Contributions to the Growth of Engineering Profession and Youth Empowerment site n'aka Nigerian Universities Engineering Student’ Association NAU Branch (2010); Most Prestigious Academic Excellence Award in Recognition of her Contributions to the Growth of Education in Nigeria, nkeUniversity of Nigeria Alumni Association, Awka (2010) nyere ya.

Na mgbakwunye na nturu ugo na nsọpụrụ ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ, Eyisi bụ onye otu ọtụtụ ndị otu ọkachamara dịka National Association of Teachers of English, National Association for the Advancement of Knowledge, Modern Languages’ Association of Nigeria, International Reading Association, <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/Association_of_Nigerian_Authors" rel="mw:ExtLink" title="Association of Nigerian Authors" class="cx-link" data-linkid="210">Association of Nigerian Authors</a> (ANA), na English Language Teacher’s Association of Nigeria, wdg. [17]

Ebemsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Department of English Language and Literature. Retrieved on 27 July 2017.
  2. Joy Eyisi emerges first female deputy vice-chancellor. www.daily post.ng. Daily Post (28 October 2017).
  3. Omose, Sylvester Aigbe. Why 8th NASS Lawmakers Needs More Education Eyisi,NOUN Prof..
  4. National Open University of Nigeria Main Officers.
  5. NOUN: Joy Eyisi takes over as new DVC Academic. www.dailynigerian.com. Daily Nigerian (27 October 2017). Archived from the original on 27 October 2017. Retrieved on 17 July 2021.
  6. Emeka, Christian (25 May 2015). AS UNIZIK, SUG President Battle Over Fees. www.independent.ng. Independent Newspaper.
  7. SUG Exposes Corruption At Nnamdi Azikiwe University, VC Detains Student Activists. www.sahareporters.com. Sahara Reporters. Retrieved on 28 July 2017.
  8. SUG President, Noble Eyisi's Mother, Speaks on the Noble Situation. Archived from the original on 2021-07-17. Retrieved on 2021-07-17.
  9. Ekpunobi, Dom (29 December 2011). I DID NOT PLAN TO BE A TRANSPORTER; I STARTED FROM SCRATCH-G. U. OKEKE. www.nigerianbestforum.com. NBF News.
  10. Ajeluoruo, Anote (28 June 2017). Sharpening written, spoken communications' skills with new book, English For All Purposes. www.guardian.ng. The Guardian.
  11. Chimuanya, Lilly. Global Education and Language: Proposing a Universal Variety of English as Medium of Instruction (PDF). Global Partners in Education Journal December 2015, Vol. 5, No. 2, pp. 46–58. Retrieved on 30 July 2017.
  12. Eminent Certificate Award for Contribution to Eminent Modeling School. Archived from the original on 2017-07-28. Retrieved on 2021-07-17.
  13. National Open University Honours Unizik Professor, Joy Eyisi. www.nigerianuniversitynews.com. VNTI. Archived from the original on 2021-07-17. Retrieved on 2021-07-17.
  14. Ayuba, Avong (29 December 2015). Poor English Language use in Nigeria, Soyinka, don lamented. www.criticltimesnews.com. Critical Times News. Archived from the original on 28 July 2017. Retrieved on 17 July 2021.
  15. The Enugu intellectual war for English Language.
  16. Women in academia tasked on influencing youth potentials.
  17. Onuegbu, Okechukwu. Prof. Joy Chinwe Eyisi: Role model; excellent bridge builder. www.news48hrs.com. News48hrs. Archived from the original on 31 July 2017. Retrieved on 29 July 2017.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]