Judith Audu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Judith Audu
Mmádu
Ụlọ ọrụ mmepụta iheụlọ ọrụ ntụrụndụ Dezie
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoJudith Audu Dezie
Aha ọmụmụJudith Audu Dezie
Aha enyereJudith Dezie
Ebe ọmụmụOjo Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, omee ihe nkiri, onye na-emeputa ihe nkiiri, onye nhazi ndu ihe nkiri, onye nhazi ejije Dezie
ụdị ọrụ yatheater arts Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Lagos Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2004 Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ihe nriteBest of Nollywood Awards, Africa Movie Academy Awards, Nigeria Entertainment Awards, Africa Magic Viewers' Choice Awards Dezie

Judith Emike Audu-Foght, onye ama-ama dịka Judith Audu, bụ onye na-eme ihe nkiri na ihe nkiri telivishọn nke Nigeria, onye ngosi, ihe nlereanya, blogger, na onye na-emepụta ihe nkiri. A ma ya ama dịka Mofe n'ihe nkiri onyo-nyo nke Emerald, tinyere Joseph Benjamin, Carol King, Lilian Esoro na Femi Branch. [1] A makwaara ya nke ọma maka ntunye-ugo onwere site n'ihe nkiri nke omepụtara nke ihe nkiri nke akpọrọ Just Not Married, so n'ime ya [2] Flipped and The Sessions . N'afọ 2019, edepụtara aha ya na YNAIJA, otu narị ụmụ Naịjiria akachasị mara n'ihe nkiri. [3]

Amuru Audu na Navy Town, Ojo n'ezinụlọ Audu Alị Audu, nna ya, onye agha ụgbọ mmiri [4] na nne ya bụ Gift Salamat Audu. Nne ya bụ onye na-esi nri ahịa na onye ọchụ nta ego nke nyere ọtụtụ ụlọ nri na ebe mgbazinye maka ihe mme-mme. Judith nwere ụmụnne nwoke abụọ, nwanne nwoke okenye, Franklin Audu na nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ bụ Abdulmalik Audu. Ọ bụ nwa nke abụọ bụrụkwa otu nwanyi n'ime ụmụ nne ya. O si na mpaghara Auchi di na Edo Steeti na mpaghara ndida Nigeria .

Audu gụrụ praịmarị na Navy Town Primary School nke dị n'Ojo, site n'afọ 1988 ruo n'afọ1993, wee gawa Navy Town Secondary School site n'afọ 1993 ruo n'afọ 1999, ebe ọ gụrụ akwụkwọ na Arts. O mechara gaa mpaghara abobdo akpọrọ Nigerian French Language Village, Badagry n’afọ 2001 wee nweta nkwado nke Diplọma nke o jiri nweta nnabata nke akwọrọ dairet entrị na Mahadum Lagos n'afọ 2002.

N'afọ 2005, Audu nwetara Osambodo B.A na French na Mahadum Lagos. [5] Mgbe o jichara otu afọ fee ala nna ya, (NYSC) nke o mere na Kebbi Steeti n'afọ 2006/2007, ọ laghachiri Mahadum nke Lagos ma tinye akwụkwọ maka agụmakwụkwọ nke Mastas na Public and International Affairs site n'afọ 2008 rue n'afọ 2010, ebe ọ gụsịrị akwụkwọ nke akpọrọ Master of Public and International Affairs (MPIA).

Mgbe Audu nọ na Mahadum nke Lagos, ọ sonyeere otu na-akwado ihe nkiri [6] a na-akpọ Campus Playhouse ma sonye n'ọtụtụ mmemme. Site na ebe ahụ ka a họpụtara ya ka-asoro n'ihe nkiri nke Theater 15 nke bụ otu ihe nkiri kachasị enwe asọpụrụ na Mahadum Lagọs n'oge ahụ. Ọ bụ site n'otu ihe nkiri ndi a ka Audu jiri kwagote nka mmụta ya n'ime ihe nkiri nke mere ya na onye nlere onyonyo nke Nigeria bụ Denrele Edun, Onye ome ihe ọchị bụ Koffi na onye utụziaka bụ Wole Oguntokun, jiri rụkọọ ọrụ.

N’afọ 2004, mgbe Mahadum Lagos gara abụbọ ọrụ ruru ọnwa iri, [7] onye ọrụ ibe ya bụ Denrele Edun kpọrọ ya bụ Audu n’ụlọ ọrụ Alpha Vision Company ebe ọ nyochara ma nweta ọrụ mbụ ya n’obere enyo na Tajudeen Adepetu’s TV Series, One Love. N'ime otu afọ ahụ, Audu debara aha ya n'akwụkwọ dị ka onye na-eme ihe nkiri na nke Guild of Nigeria [8] wee malite ịga nyocha, site na nke ọ nwetara òkè na ihe nkiri Ghetto nke Femi Ogedegbe na-akpọ Tears of the Ghetto (Ndụ mara mma) . Na ngwụsị abụbọ ọrụ Mahadum, Audu laghachiri ụlọ akwụkwọ wee were hiatus site na ime ihe nkiri, ọ bụ ezie na o sonyere mmeputa ihe nkiri nke Independent Children's Series, Funtime, ebe aha ihe nkiri ya bụ Vanessa.

N'oge ọrụ mmanye National Youth Service ya, ọ bụ onye mkwupụta okwu na onye nrụpụta ihe omume na Kebbi State Television nke a na-akpọ French For Beginners, ọ bụkwa onye isi ntụziaka nk akpọrọ Drama Troupe. [9]

N’afọ 2011, ka Audu guchasịrị akwụkwụkwọ ma nweta osambodo nke mastas digiri, ọ gara nnyocha maka ọrụ maka ihe nkiri onyonyo, Tinsel wee nweta ọrụ nke ndị ọkachamara n'ọrịa ụmụ nwanyị, [9] ọ sozi bụrụ onye otu ndi n'emepụta ọtụtụ usoro ihe nkiri onynyo dị ka, Emerald, Seekers, Burning Spears, Tinsel, Huzzel, 4 Walls, Comfort Zone, Rush, Oge, Funtime, Life is Beautiful, Case File, House Apart and Queen Drive. [10]

N’afọ 2014, Audu wepụtara ihe nkiri izizi ya, ihe nkiri nkpirishi gbasara ihe mmerụ ahụ n’ezinụlọ nke akpọrọ ‘Not Right’, [11] nke Omowunmi Dada, Ani Iyoho, Philip Festus na Judith Audu so mepụta.

N’afọ 2014, Audu bidoro igbasa ihe mme-mme redio n’otu ụlọ ọrụ redio dị na ntanetị, Igroove Radio kpọrọ aha Meet the Actor With Judith Audu ebe ya na ndi n'eme ihe nkiri nọ na mba ụwa nile na-akparịta ụka. [12]

N'ime ọnwa ise nke afọ 2016, Audu mepụtara ma gosipụta ihe nkiri mbụ ya, nke bụ ihe nkiri zuru oke, n’okpuru ụlọ ọrụ mmepụta ya bụ Judith Audu Productions . Ihe nkiri ahụ, akpọrọ Just Not Married [13] ka Stan Nze, Rotimi Salami, Ijeoma Agu, Obutu Roland, Brutus Richard, Gregory Ojefua, Judith Audu na Perpetua Adefemi soro mepụta. Ihe nkiri ahụ ritara otito na mbuli elu na Naịjitria n'izu ole na ole eweputara ya. [2]

Audu bụ onye n'akọ asiri na ntanetị na-anụ ọkụ n'obi [14] ma nwee blọọgụ abụọ: www.judithaudu.blogspot.com ebe ọ na-akọwapụta ndi ka n'eto-eto n'ime ihe nkiri ma n'agbasa akụkọ egwuru-egwuma , ma nke ọzọ bụ www.playingwithrecipes.blogspot.com ebe ọ ne-egosi nri oshiri dị ka ọ bụkwa onye hụrụ nri n'anya na-agbalị Ezi ntụziaka si n'akụkụ ụwa nile.

N’afọ 2013, a họpụtara ya maka onyinye kacha mma nke ụmụnwanyị n'eme ihe nkiri n’afọ 2013 na nturuugo ndị na - ahụ maka Mgbasaozi Naịjirịa [15]

N'ime ọnwa iri n'abụọ n'afọ 2014, Audu ritere onyinye maka Onye Okacha amara n'ihe nkiri ụmụ nwanyị na In-Short International Film Festival 2014 maka ọrụ ya na ihe nkiri mkpirishi, Alpha Mama. [16]

ihe nkiri mkpirishi nke Audu mere nke akpọrọ Not Right, nke o mepụtara pụtara na nhọpụta maka 2015 Africa Magic Viewers Choice Awards dị ka 'Best Short Film', [17] a họpụtakwara ihe nkiri a na Best of Nollywood Awards, Nollywood Movie Awards na Abuja International Film Festival n'afọ 2014. [18]

N’afọ 2016, Audu ritere nturu ugo maka Best Actress na onyinye kacha mma na Nollywood Awards maka ihe nkiri ahụ, Just Not Married. Audu retere nturu ugo maka Nwanyị Kachasị Mma na Ọrụ Nkwado (Ihe nkiri Africa na Bekee) maka ihe nkiri Obsession na 22nd African Film Awards na obodo UK n'ime onwa iri n'otu n'afọ 2018, [19] nakwa na Toronto International Nollywood Film Festival maka ọrụ ya na ihe nkiri Unfinished Business. . [20]

N'ime ọnwa abụọ, n'afọ 2020, ndi otu United Nations High Commission for Refugees (UNHCR) kpọrọ Audu dị ka “onye nkwado dị elu” maka ọrụ ya “Telling the Real Story” (TRS). [21]

Afọ Mmemme Nrite Nsonaazụ
2013 Onyinye Mgbasa Ozi Mgbasaozi Nigeria style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara
2014 In-Short International Nkiri Ememme style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie
2016 Ihe Nlereanya Naịlịl Naịjirịa na Achievers style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara
Ihe onyinye Nollywood kacha mma style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie
Abuja International Nkiri Ememme style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie
Obodo Ndi Obodo Movie Awards style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara
Onyinye ZAFAA style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie
2017 Onyinye Ntụrụndụ Naịjirịa style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara
Ememe Nkiri nke Afrika style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie
Onyinye Naịjirịa Achievers style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara
Onyinye Campus Hubb style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara
2018 Starzz kwuo style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara
Toronto International Nollywood Nkiri Ememme style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie
Ihe nkiri Afrika style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie
Onyinye ZAFAA style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie
2019 Toronto International Nollywood Nkiri Ememme style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie
Toronto International Nollywood Nkiri Ememme style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie
Year Title Role Director Notes
2004 One Love Chika Wasiu Onitilo TV Series
2004 Life is Beautiful Jossy Femi Ogedengbe Feature Film
2004 Hammer Fela's Girl Izu Ojukwu Feature Film/Cameo Appearance
2006 Funtime Vanessa Nkiru Okonkwo TV Series
2010 House Apart Sasha Tony Enejedu TV Series
2010 Huzzel Jennifer Davies Obiekea TV Series
2011 Tinsel Gynecologist Tope Ogun,Victor Aghahowa and George Kura TV Series (Recurring Role)
2012 The Journey Wunmi Femi Adewale TV Series
2013 Emerald Mofe Tope Alake and John Njamah TV Series
2013 4 Walls Tutu's mother Kolade Shasi Short Film
2013 Yes I Don't Sheyi Best Okoduwa Feature Film
2013 Switch Sade Best Okoduwa Feature Film
2013 Seekers Dupe Yemi Remi TV Series
2013 Burning Spears Omowunmi Segun Kayode TV Series
2013 Olorogun and Company Avwebo Segun Kayode TV Series
2013 Comfort Zone Nina Obi Osotule TV Series
2013 Love is Over-rated Chinelo Belinda Yanga Feature Film
2014 Stopping Kloe Evelyn Ehizojie Ojesebholo Mnet Original TV Film
2014 Alpha Mum mother Akin Harrison Short Film
2014 Out of Fire Angelina Ehizojie Ojesebholo Mnet Original TV Film
2014 Not Right Funmi Uduak Obong Patrick Short Film
2014 A Day with Death Kulapo Oluseyi Asurf Short Film
2015 Tales of Eve 5 Nengu Imoh Umoren TV Series
2015 Mama Osaro Goes Kinky Ehizojie Ojesebholo Comedy[23][24][25]
2016 Just Not Married Keji Anuola Uduak-Obong Patrick Feature Film, Produced by Judith Audu Productions, Blacreek Pictures and Asurf Films
2019 The Family Lead Judith Audu Feature Film, Produced by Judith Audu Productions, featuring Omowumi Dada, Judith Audu, Tina Mba, Mofe Duncan, Beverly Osu and more
2019 #TheFourthSide Boss Uyoyou Adia Short Film
2019 The Sessions Elohor Judith Audu Feature Film
  • 2019 - Oge
  • 2019 - Ezinụlọ
  • 2019 - Akwụkwọ edemede nke ndị abụrụ ọnụ
  • 2018 - MIRABEL
  • 2018 - gbapụrụ
  • 2018 - IHE ụtụtụ Ndozi
  • 2018 - Obi mgbawa
  • 2018 - Dị ka Dominoes
  • 2018 - Ime ihe ndina 

Ebe nsi nweta[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Emerald, new drama series, hits TV nationwide", Daily Sun Newspaper, 28 June 2013. Retrieved on 7 April 2014.
  2. 2.0 2.1 "Judith Audu’s Just Not Married tops cinema ratings", The Nation Newspaper, 1 June 2016. Retrieved on 6 June 2016.
  3. "YNAIJA Presents the 100 Most Influential Nigerians in Film in 2019", Ynaija. Retrieved on 9 November 2019.
  4. "Sometimes I'm tempted to quit acting-Judith Audu, actress", Daily Sun Newspaper, 14 July 2013.
  5. "My FRUSTRATIONS as an actress—Nollywood actress Judith Audu", The Nation Newspaper, 29 June 2013. Retrieved on 7 April 2014.
  6. "Sometimes I'm tempted to quit acting-Judith Audu, actress", Daily Sun Newspaper, 14 July 2013. Retrieved on 7 April 2014.
  7. "Judith Audu: My Journey into the Movie Industry", New Telegraph Newspaper, 11 April 2014. Retrieved on 11 April 2014.
  8. 34 facts in the life of Nollywood actress Judith Audu. My Daily Newswatch (7 December 2013). Archived from the original on 11 April 2014. Retrieved on 7 April 2014.
  9. 9.0 9.1 "Judith Audu: My Journey into the Movie Industry", New Telegraph Newspaper, 11 April 2014. Retrieved on 11 April 2014.
  10. "My FRUSTRATIONS as an actress—Nollywood actress Judith Audu", The Nation Newspaper, 29 June 2013. Retrieved on 7 April 2014.
  11. "Judith Audu set to release Not Right", The Nation Newspaper, 30 March 2014. Retrieved on 7 April 2014.
  12. "Judith Audu bags Deal with iGroove Radio", The Nation Newspaper, 16 November 2014. Retrieved on 5 February 2015.
  13. "Judith Audu Premieres Movie in Nigeria", Pulse Nigeria, 7 May 2016. Retrieved on 6 June 2016.
  14. "Judith Audu challenges Linda Ikeji", National Mirror Newspaper, 30 March 2013. Retrieved on 7 April 2014.
  15. Nominees List. Nigerian Broadcasters Merit Awards (30 March 2013). Archived from the original on 15 April 2014. Retrieved on 7 April 2014.
  16. "With Alpha Mum, Judith Audu Steps Up", Guardian Newspaper, 27 December 2014. Retrieved on 5 February 2015.
  17. "Judith Audu Ectstatic over AMVCA Nomination", Vanguard Newspaper, 12 December 2014. Retrieved on 6 February 2015.
  18. "Judith Audu Excited over 'Not Right' Nominations", The Nation Newspaper, 12 December 2014. Retrieved on 6 February 2015.
  19. Winners of the 22nd African Film Awards 2018. African Voice Newspaper UK (6 November 2018). Retrieved on 7 November 2018.
  20. "ACTRESS JUDITH AUDU BAGS AWARD FROM TORONTO INTERNATIONAL NOLLYWOOD FILM FESTIVAL", Daily independent Newspaper, 2 September 2018. Retrieved on 7 November 2018.
  21. "UNHCR Names Judith Audu as High Profile Supporter", Daily Independent, 20 February 2020. Retrieved on 30 April 2020.
  22. "JUDITH AUDU Inside Story of a Queen of Make-believe", ThisDay Newspaper, 9 June 2019. Retrieved on 9 November 2019.
  23. MAMA OSARO GOES KINKY ….to save her marriage. Eminent Leaders Magazine. Ena Ofugara. Archived from the original on 19 July 2019. Retrieved on 26 May 2015.
  24. Judith Audu, Ada Ameh, Charles Inojie star in new movie. Pulse Nigeria. Chidumga Izuzu. Retrieved on 26 May 2015.
  25. ‘Mama Osaro Goes Kinky': Judith Audu, Ada Ameh, Charles Inojie star in new movie. 1Push Naija. Ogbodo. Archived from the original on 26 May 2015. Retrieved on 26 May 2015.