Juliet Ehimuan

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Juliet Ehimuan
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereJuliet Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
ụdị ọrụ yacomputer engineering Dezie
onye were ọrụShell Nigeria, Microsoft, Google, Google Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Cambridge, Mahadum Obafemi Awolowo Dezie
ogo mmụtaBachelor of Engineering, Master nke Nchịkwa Azụmaahịa Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Juliet Ehimuan bụ onye Nigeria gụrụ maka nkanụzụ ma nwekwa nghọta miri emi na ya, Ọ bụkwa onye ọchụnta ego nọ ugbu a dika ọnụ na-ekwuchitere ụlọ ọrụ Google na Nigeria . [1] N' ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2011, edebara aha ya naForbes dika otu n'ime "20 Youngest Power Women In Africa". [2]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Ehimuan na Nigeria, Ehimuan nwetara nzere digiri na B.Eng. nakwa Computer Engineering site Obafemi Awolowo University, Ile-Ife Ọ mere ọfụma site na inwe 'first Class' [3] [4] Ọ gara n'ihu inweta postgraduate digiri na Computer Science site na University of Cambridge, United Kingdom tupu ọ gaa n'ihu ịgụchapụ MBA ya na London Business School.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1995, Ehimuan bidoro ọrụ dị ka Onye Nlekọta na ahụ ndi ọrụ na-arụ ọrụ ha nke ọma otu ọkwesiri ka esi rụọ ya bụ nke a kpọrọ 'Performance Monitoring and Quality Assurance Supervisor' n'ụlọ Shell Petroleum Development. O hapụrụ ụlọ ọrụ a n'afọ 1997 we sonye ụlọ ọrụ nke Microsoft UK dị ka Maneja na-ahụ ọrụ di iche iche nke ụlọ ọrụ Microsoft nwegasịrị na mba Europe, Middle East nakwa Africa, ọrụ ọzọ gụnyere Maneja na ahụ maka nzụkọrịta ahia nke ụlọ ọrụ Microsoft Nigeria na mba ụwa niile.[5]

N'afọ 2005 ọ hapụrụ ụlọ ọrụ Microsoft wee bido ụlọ ọrụ nke ya ọ kpọrọ Strategic Insight Consulting Ltd. Ọ mechara bụrụ Maneja n'ụlọ ọrụ Chams Plc's Strategic Business Units n' ọmwa Eprel n'afọ 2011, E nyere ọkwa dika Maneja na-anọchite anya ụlọ ọrụ Google na Nigeria. [3]

Nturu ugo na nkwanye ugwu[dezie | dezie ebe o si]

Dika 'Fellow' nke ndi Cambrige Commonwealth Society, Mbọ ọna-agba iji kwalite nkanụzụ mere ka enye ihe onyinye di iche ichea ụfọdụ ihe onyinkye ndi a gụnyere igụ akwụkwọ n'efu nke di 'London Business School Global Women' nyere ya. Mgbe ọ gara Mahadum Cambridge o ritere ihe onyinye abụọ , ha bụ ' Selwyn College Scholar na Malaysian Commonwealth Scholar'. [6] N’afọ 2012, ọ nwere mmeri ma nweta ihe onyiye “IT Personality of the Year” na mmeme 'National Information Technology Merit Award. [7]

Ebe Nsinweta[dezie | dezie ebe o si]

  1. Okunola, Folarin. "Pulse List: 5 tips for success from Google Nigeria country manager, Juliet Ehimuan-Chiazor", Pulse Nigeria, 12 February 2016. Retrieved on 17 July 2016.
  2. Nsehe, Mfonobong. "The 20 Youngest Power Women In Africa", Forbes, 18 August 2011. Retrieved on 17 July 2016.
  3. 3.0 3.1 Nosike, Moses. "Google Nigeria appoints new Country Manager", Vanguard News, 13 April 2011. Retrieved on 17 July 2016.
  4. "#PROFILE: MEET JULIET EHIMUAN-CHIAZOR, THE VERY HUMBLE GOOGLE COUNTRY MANAGER IN NIGERIA", 7 July 2016. Retrieved on 17 July 2016.
  5. Bakare, Tonye. "Juliet Ehimuan-Chiazor: Profile of a humble achiever", The Guardian, 2 July 2016. Retrieved on 17 July 2016.
  6. Meteoric: Juliet Ehimuan. IT Telecom Digest (10 December 2015). Retrieved on 17 July 2016.
  7. Juliet Ehimuan Chiazor wins 2012 IT Personality of the Year Award. Nigeria Computers (20 December 2012). Retrieved on 17 July 2016.