Lynda Chuba-Ikpeazu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Lynda Chuba-Ikpeazu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Akụkụ nkeHouse of Representatives of Nigeria Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereLynda Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya22 Jụn 1966 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye asọmpi ịma mma, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye ọchụnta ego Dezie
Ọkwá o jionye otu ulo nnochite anya Naijiria, onye otu ulo nnochite anya Naijiria, onye otu ulo nnochite anya Naijiria, onye otu ulo nnochite anya Naijiria Dezie
ogo mmụtaBachelor of Science, Master nke Nchịkwa Azụmaahịa, Bachelor of Laws Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAll Nigeria People's Party Dezie
Ihe nriteOnye nnọchi anya Goodwill Dezie

Lynda Chuba-Ikpeazu, onye a makwa nke oma dika Lynda Chuba (a mụru ya n'ubochi iri abuo na abuo n'onwa nke isii, n'aro otu puku, nari iteghete, iri isii na isii).[1][2]

Nwa onye bugoro onye isi nke NFA ugboro abuo nke a na-akpo Chuba Ikpeazu,[3] Lynda Chuba-Ikpeazu jere akwukwo na obodo Nigeria, England, na America, ebe o ruru oru dika onye nǹomi. N'afo 1986, Chuba-Ikpeazu meriri iso mpi omalicha umu ada Most Beautiful Girl in Nigeria nke mbu. Nke a malitere ochichi umu ada Igbo n'udi iso mpi a n'odinihu. N'afò 1987 o bukwa onye mbu na obodo Nigeria nke jere iso mpi Miss Universe mgbe nwa ada Edna Park jechara na 1964. O turu ugo n'iso mpi ndi nnomi mgbe o meriri iso mpi nke Miss Africa n'afò 1964.

Oge ochichi ya gachara, Chuba-Ikpeazu ghoro onye oji ego achu ego n'obodo Lagos, ebe o kacha mara n'ihe gbasara oru mmanu.[4] O nwere nzere bachelor's degree na nzirita ozi, nwee nzere master's degree na Nlekota Azumahia, ma nweekwa nzere bachelor's degree n'ihe gbasara Iwu, Chuba-Ikpeazu nokwa n'ulo oka-iwu House of Representatives bido na 1999 ruo na afo 2003.

N'afo 2004, Chuba-Ikpeazu meriri iso mpi ndi oka iwu National Assembly, ebe o na anochi anya ndi Onitsha North-South na ochichi etiti dika onye otu ndoro ndoro ochichi People's Democratic Party.[5] Ugbua, o bukwa ofu n'ime ndi ntuzi aka Anambra United.[6][7]

References[dezie | dezie ebe o si]